“A Na-egosi na Amamihe Ziri Ezi Site n’Ọrụ Ya”
1. Olee otú ụfọdụ ndị si ele ozi ọma anyị anya?
1 Mgbe ụfọdụ anyị nọ ozi ọma, anyị nwere ike ịhụ ndị na-ekwu okwu ọjọọ gbasara anyị n’ihi na ha aghọtachaghị ndị anyị bụ ma ọ bụ n’ihi na ha nụrụ asịrị e ji Ndịàmà Jehova gbaa. O nwere ike ịbụ ihe a kọrọ na redio ma ọ bụ na tiivi gbasara anyị mere ha ji lewe anyị anya ọjọọ. N’ebe ụfọdụ, a na-akpọdị anyị “ndị òtù nzuzo.” Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma a gwa anyị okwu ọjọọ n’ozi ọma?
2. Mgbe a na-akparị anyị n’ozi ọma, gịnị ga-enyere anyị aka ka ike ịga ozi ọma ghara ịgwụ anyị?
2 Ekwela Ka Ike Ikwusa Ozi Ọma Gwụ Gị: Na narị afọ mbụ, ndị mmadụ ghọtahiere Jizọs na ndị ohu Jehova ndị ọzọ ọtụtụ mgbe ma kwugide ha. (Ọrụ 28:22) Ma, ha ekweghị ka nkatọ a katọrọ ha mee ka ihere ikwusa ozi ọma mewe ha. Jizọs sịrị: “A na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Mat. 11:18, 19) Ọ nọgidere jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eme uche Nna ya, obi sikwara ya ike na ndị chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu ga-emecha chọpụta na ozi ọma ọ na-ezi bara uru. Icheta na a kparịrị Ọkpara Chineke otú e si akparị anyị n’ozi ọma taa ga-eme ka ike ịga ozi ọma ghara ịgwụ anyị.
3. Gịnị mere akụkọ ọjọọ na mmegide a na-emegide anyị ekwesịghị iju anyị anya?
3 Jizọs kwuru na ụwa ga-akpọ ndị na-eso ụzọ ya asị otú ha si kpọọ yanwa asị. (Jọn 15:18-20) N’ihi ya, akụkọ ọjọọ a na-akọ gbasara anyị taa na mmegide a na-emegide anyị ekwesịghị iju anyị anya. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịtụ anya na mmegide a ga na-aka njọ ka ọgwụgwụ nke oge ikpeazụ a na-erukwu nso, iwe Setan ana-adịkwukwa ọkụ. (Mkpu. 12:12) Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ n’ihi na mmegide a, nke na-aka njọ, na-egosi na oge a ga-ebibi ụwa Setan ji ọsọ na-abịa.
4. Ọ bụrụ na mmadụ agwa anyị okwu ọjọọ n’ozi ọma, olee otú anyị kwesịrị isi zaghachi?
4 Jiri Obiọma Zaghachi: Ọ bụrụ na a gwa anyị okwu ọjọọ, anyị kwesịrị iji ụzọ dị nro na obiọma zaghachi mgbe ọ bụla. (Ilu 15:1; Kọl. 4:5, 6) Ọ bụrụ na o kwe mee, anyị nwere ike ịkọwara onye chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu na e nweela ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu e kwuru banyere Ndịàmà Jehova ma ọ bụkwanụ anyị ajụọ ya ihe mere o ji kwuo ihe o kwuru. Otú anyị si jiri nwayọọ zaghachi ya nwere ike ime ka o chebara ihe ahụ ọ nụrụ banyere Ndịàmà Jehova echiche ma gee Onyeàmà ntị n’oge ọzọ. Ma, ọ bụrụ na ezigbo iwe ji onye anyị hụrụ, o nwere ike ịkacha mma ịgwa ya ka ọ dị mgbe ọzọ. Obi kwesịrị isi anyị ike na n’agbanyeghị otú ndị ọzọ si ele anyị anya, Jehova ji ozi anyị na-ejere ya kpọrọ ihe.—Aịza. 52:7.