Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọgost 30
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 30
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cf isi nke 9 ¶17-21, igbe dị na p. 96
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ndị Eze 9-11
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: “Ì Jitụla Ihe E Dere n’Azụ Ụlọ Nche Zie Ozi Ọma?” Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Gwa onye nkwusa ka o jiri aro a tụrụ n’isiokwu a mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nyefee Ụlọ Nche Septemba 1. E mechazie, họrọ otu isiokwu ma ọ bụ isiokwu abụọ gbara na Teta! Julaị–Septemba ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ndị ha nwere ike ịjụ onye nwe ụlọ nakwa amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụ ma ha jiri isiokwu ndị ahụ nyefewe magazin ahụ. Gwa otu onye nkwusa ka o mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nyefee Teta! ahụ.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ na-eme nke ọma n’ọgbakọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị jeerela Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ. Olee mgbanwe ndị e nwerela n’ikwusa ozi ọma kemgbe ha ghọrọ ndị nkwusa? Olee ihe ịga nke ọma ndị ha hụrụla e nwere n’obodo unu nakwa ná nzukọ Jehova n’ụwa niile? Olee otú ọgbakọ Jehova sirila nyere ha aka ime nke ọma n’ikwusa ozi ọma?