Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 30
IZU NA-AMALITE NA MEE 30
Abụ nke 33 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 4 ¶5-12 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 26-33 (Nkeji 10)
Nke 1: Abụ Ọma 31:9-24 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Atụ nke Ndị Gosiri Ezigbo Umeala n’Obi n’Oge Baịbụl (Nkeji 5)
Nke 3: Mmịnye Ọbara Na-emebi Ịdị Nsọ nke Ọbara—td 38A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. Jiri ihe dị ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” bụ́ nke dị na peeji nke 4, mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malite ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Jun. Gbaa mmadụ niile ume ka ha bịa ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
Nkeji 15: Otú E Si Eme Nchọnchọ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, bụ́ nke ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 33-38. Mee ihe ngosi ebe onye nkwusa na-eme nchọnchọ iji zaa ajụjụ a jụrụ ya n’ozi ọma. Ọ ga na-ekwupụta ihe ọ na-atụgharị n’obi ya.
Nkeji 10: Jikere Inye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Jun. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo ihe ndị dị na magazin ndị ahụ. Họrọzie isiokwu abụọ ma ọ bụ atọ n’ime ha ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha nwere ike ịjụ onye nwe ụlọ ma ha chọọ iji otu n’ime isiokwu ahụ nye mmadụ magazin ahụ. Ha kwuokwa amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ onye ahụ. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ magazin nke ọ bụla.
Abụ nke 113 na Ekpere