Ì Nwere Ike Ịna-aga Ozi Ọma n’Ụbọchị Sọnde?
1. Gịnị ka ihe ahụ Pọl na ndị òtù ya mere na Filipaị na-akụziri anyị?
1 Pọl na ndị ya na ha so ekwusa ozi ọma gara Filipaị n’Ụbọchị Izu Ike. N’ụbọchị ahụ, ọtụtụ ndị Juu bi na Filipaị anaghị arụ ọrụ ọ bụla. Ọ bụrụ na Pọl na ndị ya na ha so ekpebie na ha ga-ezu ike n’ụbọchị ahụ otú ndị ọzọ na-ezu, ghara izi onye ọ bụla ozi ọma, o nweghị onye ga-asị na ha mere ihe ọjọọ. Ma, ha ma na e nwere ndị Juu gbakọtara n’azụ ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ na-ekpe ekpere. Pọl na ndị òtù ya ji ohere ahụ gaa zie ha ozi ọma. Ha nwere ezigbo obi ụtọ mgbe Lidia na ndị ezinụlọ ya gere ha ntị, e meekwa ha baptizim. (Ọrụ 16:13-15) Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị taa na-ezu ike n’ụbọchị Sọnde, í cheghị na ọ ga-adị mma ka i jiri ohere ahụ zie ha ozi ọma?
2. Olee nsogbu ụmụnna anyị meriri iji hụ na a hapụrụ ha ka ha na-ekwusa ozi ọma na Sọnde?
2 Ọgụ A Lụrụ Lụta Ozi Ọma Sọnde: N’afọ 1927, a gwara ụmụnna anyị ka ha wepụta oge na-aga ozi ọma na Sọnde ọ bụla. Ozugbo ha bidoro ya, a malitere imegide ha. N’Amerịka, e jidere ọtụtụ n’ime ha n’ihi na a sị na ha dara iwu e tiri ka a na-ezu ike n’ụbọchị Sọnde. A sịkwa na ha na-enye ndị ọzọ nsogbu n’ụlọ ha ma na-ere ihe n’anataghị gọọmenti ikike. Ma, ụmụnna anyị akwụsịghị izi ozi ọma na Sọnde. Malite n’afọ 1930, ha malitere ịhazi ịga ozi ọma n’ìgwè. Ihe ha na-eme bụ, ndị nkwusa si n’ọgbakọ ndị dị gburugburu otu obodo zukọta, ha agaa kwusaa ozi ọma n’otu ókèala. Ndị uwe ojii jidekatara ha, hụzie na ha karịrị akarị nakwa na o nweghị ihe a ga-eme ga-akwụsị ha ikwusa ozi ọma. Obi ọ́ dịghị gị ụtọ maka mbọ a ụmụnna anyị ndị ahụ gbara iji hụ na a hapụrụ anyị ka anyị na-ekwusa ozi ọma n’ụbọchị Sọnde?
3. Gịnị mere ụbọchị Sọnde ji bụrụ ụbọchị mara mma e ji aga ozi ọma?
3 Ụbọchị Magburu Onwe Ya E Ji Aga Ozi Ọma: Ọtụtụ ndị na-anọ n’ụlọ n’ụbọchị Sọnde. Ahụ́ na-akakwa eru ha ala n’ụbọchị ahụ. Ụfọdụ ndị na-aga chọọchị na-enwekarị mmasị ikwu ihe gbasara Chineke n’ụbọchị ahụ. Ọ bụrụ na anyị na-enwe ọmụmụ ihe n’ụbọchị Sọnde, otú anyị ga-adị aga ozi ọma bụkwa otú anyị ga-adị aga ọmụmụ ihe. N’ihi ya, ọ́ gaghị adị mma ma i jiri ihe ndị i ji aga ozi ọma, si ọmụmụ ihe gawa ozi ọma ma ọ bụkwanụ si ozi ọma gawa ọmụmụ ihe? Ị chọọ, i nwere ike jiri obere nri ị ga-eri.
4. Olee otú obi ga-adị anyị ma anyị wepụta oge gaa ozi ọma n’ụbọchị Sọnde?
4 Ịga ozi ọma n’ụbọchị Sọnde agaghị eme ka anyị ghara izu ike otú anyị chọrọ n’ụbọchị ahụ. Obi ga-adị anyị ụtọ ma anyị na-ezu ike ahụ n’ihi na anyị ma na anyị gaara Jehova ozi n’ụbọchị ahụ. (Ilu 19:23) Obi nwedịrị ike ịtọ anyị ụtọ ma anyị nweta onye gere anyị ntị otú ahụ Lidia si gee Pọl na ndị òtù ya ntị.