Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 2
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 2
Abụ nke 116 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 23 ¶1-8, igbe dị na p. 180 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ezikiel 6-10 (Nkeji 10)
Nke 1: Ezikiel 7:14-27 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: A Bịa n’Ịdị Umeala n’Obi, Olee Otú Jọnatan Si Bụrụ Ezigbo Ihe Nlereanya?—1 Sam. 23:16-18 (Nkeji 5)
Nke 3: Ezigbo Ndị Kraịst Anaghị Alụ Karịa Otu Nwaanyị—td 3E (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Otú Anyị na Ndị Nwe Ụlọ Ga-esi Na-atụgharị Uche—Nkebi nke Mbụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, p. 251 ruo p. 253, para. nke 2. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ ihe ngosi abụọ ga-egosi otú e nwere ike isi mee ihe e kwuru.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Julaị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo ụfọdụ isiokwu ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-8 n’Ụlọ Nche Julaị 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuokwa ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-8 na Teta! Julaị–Septemba nye ya magazin ahụ. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ ma jụọ ha otu ihe ahụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Abụ nke 31 na Ekpere