Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite Jun 25, 2012. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
1. Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Jehova si nyere Jeremaya aka n’oge ihe siri ezigbo ike? (Jere. 37:21) [Mee 7, w97 9/15 p. 3 para. 4–p. 4 para. 1]
2. Olee otú ndị nwere olileanya ibi n’ụwa si na-akpa àgwà ọma Ibed-melek kpara? (Jere. 38:8-13) [Mee 7, su p. 179 para. 9]
3. Ebe ọ bụ na Jehova ji ndị agha Nebukadreza chebe Jeremaya na Barọk, ọ̀ dị mma ka Onye Kraịst kweta ka ndị uwe ojii bu égbè na-eche ya nche? (Jere. 39:11-14) [Mee 14, w84 1/15 p. 32]
4. Olee ihe bụ́ “ihe ukwu” ahụ Barọk nọ na-achọrọ onwe ya? Otú ahụ o si nabata ndụmọdụ Jehova nyere ya ga-enyere anyị aka ilekwasị anya na gịnị? (Jere. 45:5) [Mee 21, w06 8/15 p. 18 para. 1; p. 19 para. 5]
5. Mgbe Jehova na-ekwu na a ga-ebibi Idọm, gịnị mere o ji kwuo na ya adịghị ka “ndị na-aghọ mkpụrụ vaịn” na “ndị ohi”? (Jere. 49:9, 10) [Mee 28, w78 1/15 p. 27 para. 3-4]
6. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe mere Eze Zedekaya mgbe o ‘nupụụrụ eze Babịlọn isi’? (Jere. 52:3, 7-11) [Jun 4, w88 9/15 p. 17 para. 8; w81 10/1 p. 8 para. 3-4; p. 9 para. 6]
7. Gịnị bụ “ihe mgbakwasị ụkwụ” Jehova na “ụlọ ndò” ya? (Ákwá 2:1, 6) [Jun 11, w07 6/1 p. 9 para. 2]
8. Gịnị ka Jeremaya bu n’obi mgbe o kwuru na Jehova ‘aghaghị icheta ya wee hulata n’ebe ọ nọ’? Gịnịkwa mere ihe a o kwuru ji gbasa anyị? (Ákwá 3:20) [Jun 18, w07 6/1 p. 11 para. 2]
9. Gịnị mere o ji dị mma ka mmadụ mụta ibu yok ahụhụ n’oge ọ na-eto eto? (Ákwá 3:27) [Jun 18, w07 6/1 p. 11 para. 4]
10. Olee otú obi ike Ezikiel nwere ga-esi nyere anyị aka ikwusara ndị na-enweghị mmasị n’ozi anyị ozi ọma n’atụghị egwu? (Ezik. 3:8, 9) [Jun 25, w08 7/15 p. 8 para. 6-7]