Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jun 25
IZU NA-AMALITE NA JUN 25
Abụ nke 63 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 22 ¶15-21 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ezikiel 1-5 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. Jiri ihe dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Julaị.
Nkeji 15: Jiri Oge Gị Mee Ihe Bara Uru Mgbe Ị Nọ n’Ozi Ọma. (Efe. 5:15, 16) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ha ajụjụ ndị a e dere ebe a. (1) Olee otú anyị ga-esi jiri oge anyị mee ihe bara uru mgbe: (a) a na-eduzi nzukọ ozi ubi? (b) e duzichara nzukọ ozi ubi? (ch) onye anyị na ya so n’ozi ọma nọrọ oké ọdụ ebe ọ na-ezi onye nwere mmasị ozi ọma? (d) ndị anyị chọrọ ịgara nletaghachi bigasị ebe ndị dị anya n’ókèala anyị? (2) Olee otú ime ihe ndị na-esonụ ga-esi eme ka anyị ghara igbu oge: (a) ibu ụzọ nye ndị ezinụlọ anyị nri tupu anyị agawa nzukọ ozi ubi? (b) mmadụ niile ịbịa nzukọ ozi ubi n’oge? (ch) anyị ige onye na-eduzi nzukọ ozi ubi ntị mgbe ọ na-eke mmadụ, ghara iji aka anyị kegharịa ya ma e mechaa nzukọ ozi ubi? (d) onye ọ bụla ịmara ebe o kwesịrị ịga zie ozi ọma tupu a pụwa?
Nkeji 10: Akwụkwọ A Ga-enye Ndị Mmadụ n’Ọnwa Julaị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kwuo ihe ndị dị n’akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Julaị. Meekwa otu ihe ngosi ma ọ bụ ihe ngosi abụọ ga-egosi otú e nwere ike isi nye ya ndị mmadụ.
Abụ nke 29 na Ekpere