Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Disemba 24
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 24
Abụ nke 5 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 3 ¶1-6 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Zekaraya 9-14 (Nkeji 10)
Nke 1: Zekaraya 11:1-13 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Idebe Ụbọchị Izu Ike Adịrịghị Ndị Kraịst—td 42A (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Mgbe Anyị Kwesịrị Ime Ihe E Kwuru n’Ilu 15:1? (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 30: Otú Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Ga-esi Abara Anyị Uru. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Tụleenụ peeji nke 3-6. Mgbe unu na-atụle peeji nke 4, gwa otu ezinụlọ ka ha mee ihe ngosi ga-ewe nkeji atọ. Mgbe ha nwechara Ofufe Ezinụlọ, nwoke nwe ụlọ ajụọ nwunye ya na ụmụ ha ihe ha ga-amụ n’izu ọzọ. Ụmụ ha ekwuo otu n’ime isiokwu ndị dị n’ebe ahụ e dere “Ndị Na-eto Eto” na jw.org, ma kwuo na ha ga-achọ ka ha mụọ ya n’izu ọzọ. Ha mechaa, jụọ ụmụnna otú ha si eji ihe dị na jw.org amụ ihe ma mgbe naanị ha na-amụ ihe ma mgbe ha na ndị ezinụlọ ha na-amụ ihe. I nwekwara ike ịjụ ha otú ha chọrọ isi jiri ihe dị n’ebe ahụ na-amụ ihe n’ọdịnihu. Mgbe unu na-atụle peeji nke 5, gwa otu onye nkwusa ka o mee ihe ngosi ga-ewe nkeji atọ. N’ihe ngosi ahụ, onye ọ bịara na nke ya ga-ajụ ya ajụjụ gbasara ihe ndị anyị kweere, ya anọrọ ebe ahụ jiri ekwentị ma ọ bụ ngwá elektrọniks ọzọ nwere ike ịba n’Ịntanet chọta azịza ya na jw.org. Mgbe unu na-atụle peeji nke 6, mee ihe ngosi ga-ewe nkeji anọ. N’ihe ngosi ahụ, onye nkwusa gara ozi ọma hụ onye chọrọ ịgụ akwụkwọ anyị n’asụsụ ọzọ. Onye nkwusa ahụ e jiri ekwentị ya ma ọ bụ kọmputa onye ahụ ọ gara na nke ya mepee jw.org, gosi ya traktị bụ́ Ịma nke Bụ́ Eziokwu ma ọ bụkwanụ akwụkwọ Bible Na-akụzi e dere n’asụsụ ọ na-asụ. Ya na ya atụlee otu peeji na traktị ahụ ma ọ bụkwanụ n’akwụkwọ ahụ. Ha mechaa, jụọ ụmụnna otú ha sirila jiri ihe dị na jw.org nyere ndị mmadụ aka mgbe ha gara ozi ọma.
Abụ nke 101 na Ekpere