Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 11
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 11
Abụ nke 119 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jl Isiokwu nke 5 ruo na nke 7 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Hibru 1-8 (Nkeji 10)
Nke 1: Ndị Hibru 4:1-16 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Anyị Ga-esi Egosi na Anyị Nwere “Amamihe nke Si n’Elu”?—Jems 3:17, 18 (Nkeji 5)
Nke 3: Jizọs Ọ̀ Nwụrụ n’Elu Obe?—td 34A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú Anyị Nwere Ike Isi Nyere Ndị Ọzọ Aka. Okwu okenye ga-ekwu. Ọ ga-esi n’Ụlọ Nche Nọvemba 15, 2013, peeji nke 8 na nke 9.
Nkeji 10: Ihe Ga-enyere Gị Aka Ka Ahụ́ Na-eru Gị Ala n’Ozi Ọma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ha ajụjụ ndị a: (1) Olee otú ekpere ga-esi enyere anyị aka ma ọ bụrụ na ahụ́ anaghị eru anyị ala ma anyị gaa ozi ọma? (2) Ọ bụrụ na anyị amụọ ihe anyị ga-ekwu n’ụlọ tupu anyị agawa ozi ọma, olee otú ọ ga-esi mee ka ahụ́ rutụ anyị ala? (3) Gịnị ga-eme ka ahụ́ ruo anyị ala ma anyị na onye nlekọta sekit soro gaa ozi ọma? (4) Olee otú ịgachi ozi ọma anya ga-esi eme ka ahụ́ na-eru anyị ala ma anyị gaa ozi ọma? (5) Olee ihe nyerela gị aka ime ka ahụ́ na-eru gị ala n’ozi ọma?
Nkeji 10: “Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Hosia Onye Amụma.” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 113 na Ekpere