Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 25
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 25
Abụ nke 122 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jl Isiokwu nke 11 ruo na nke 13 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jems 1-5 (Nkeji 10)
Nke 1: Jems 1:22–2:13 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Otú Ịhụnanya Si Achụpụ Egwu—1 Jọn 4:16-18 (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Wetara Ọnwụ?—td 41A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Disemba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri ọkara nkeji ma ọ bụ otu nkeji kwuo ihe mere magazin ndị ahụ ga-eji amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-7 n’Ụlọ Nche Disemba 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọ ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Jụọkwa ha ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 10-11 na Teta! Nọvemba–Disemba nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọkwa ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ, jụọkwa ha ajụjụ ndị ahụ ị jụrụ ha mbụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Nkeji 10: Olee Otú Ị Ga-esi Na-agwa Ndị Mmadụ Okwu? Okwu. Ọ ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 69, para. nke 1 ruo na nke 5. Mee ihe ngosi ebe mmadụ na-akọrọ onye nkwusa na-amụrụ ya ihe ihe ọ chọrọ ime. Ọ ga-ajụ ya, sị, “Ọ bụrụ gịnwa, gịnị ka ị ga-eme?” Onye nkwusa ahụ ga-agwa ya otu n’ime ihe a tụlere n’isiokwu a.
Nkeji 10: “Okwu Chineke Na-akpa Ike.” Ajụjụ na azịza. Gwa ọgbakọ mgbe unu ga-aga mgbakọ pụrụ iche ma ọ bụrụ na a gwala unu.
Abụ nke 45 na Ekpere