Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 21
IZU NA-AMALITE N’EPREL 21
Abụ nke 132 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 6 ¶1-8 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 15-18 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọpụpụ 15:20–16:5 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ife Ihe Oyiyi Ofufe Wetaara Mba Izrel Ọnwụ—td 17B (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mmụta Banyere Inwe Obiọma—lr isi nke 15 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: Ihe Anyị Ga-ekwu ma Ndị Nọ n’Ókèala Anyị Kwuo Ihe Gosiri na Ha Achọghị Ịnụ Ozi Ọma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Kwuo ihe abụọ ma ọ bụ ihe atọ ndị na-achọghị ige ozi ọma na-ekwukarị n’ókèala unu. Ha ga-abụ ndị na-adịghị n’akwụkwọ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ihe ha nwere ike ikwu ma mmadụ gwa ha ihe ndị ahụ. A ga-eme otu ihe ngosi na-agaghị egbu oge.
Nkeji 15: Na-enwere Ndị Ị Na-ezi Ozi Ọma Ọmịiko. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ nke ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 118, paragraf nke 1, ruo peeji nke 119, paragraf nke 5.
Abụ nke 92 na Ekpere