Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 28
IZU NA-AMALITE N’EPREL 28
Abụ nke 35 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 6 ¶9-15 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 19-22 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa. Okwu. Kwuo ndokwa e mere n’ọgbakọ unu banyere otú unu ga-esi aga ozi ọma na Satọdee mbụ n’ọnwa Mee. Gbaa mmadụ niile ume ka ha pụta ozi ọma n’ụbọchị ahụ. Jiri ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi.
Nkeji 15: “Traktị Ọhụrụ Ndị Pụrụ Iche.” Ajụjụ na azịza. A ga-eme ihe ngosi abụọ. Nke mbụ ga-abụ otú a ga-esi nye mmadụ otu n’ime traktị ndị ọhụrụ a n’ozi ụlọ n’ụlọ. Nke abụọ abụrụ otú a ga-esi gaa nletaghachi na nke onye e nyere traktị ahụ.
Nkeji 10: “Vidio Anyị Ga Na-egosi Ndị Mmadụ.” Okwu. Gosi ụmụnna vidio ahụ ka ha lee ma ọ bụ ka ha gere. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi gosi ndị mmadụ vidio ahụ.
Abụ nke 75 na Ekpere