Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 2
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 2
Abụ nke 109 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 19 ¶18-23, igbe dị na peeji nke 198 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Ikpe 8-10 (Nkeji 8)
Nke 1: Ndị Ikpe 8:13-27 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ole Ndị Dere Baịbụl?—igw p. 6 ¶1-5 (Nkeji 5)
Nke 3: Ụzọ Ndị Anyị Si Eme Ihe Jizọs Kwuru na Matiu 22:21 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Jiri Obi Umeala Na-agbara Onyenwe Anyị Ohu.’—Ọrụ 20:19.
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Febụwarị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi abụọ otú a ga-esi enye ndị mmadụ Ụlọ Nche na Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi ndị a. E mechaa ha, tụlezienụ ihe dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.”
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị nkwusa ka ha kwuo otú ha si mee ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ihe Anyị Ga-eme ma Ọ Bụrụ na A Nabataghị Anyị.” Gwakwa ha ka ha kọọ ahụmahụ ọ bụla dị ụtọ ha nwere.
Abụ ọhụrụ isiokwu ya bụ́ “Mee Ka Anyị Ghara Ịtụ Egwu” na Ekpere
Chetakwa na a ga-ebu ụzọ kpọnyere ọgbakọ abụ ọhụrụ a ka ha gee. Ya kpọchaa, gwa ụmụnna ka ha bụzie ya.