Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 18
IZU NA-AMALITE NA MEE 18
Abụ nke 50 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 24 ¶18-21, igbe dị na peeji nke 249 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Samuel 9-12 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Samuel 10:13–11:4 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Otú Anyị Si Egosi na Ọ Bụ Naanị Jehova Ka Anyị Na-efe—Rom 6:16, 17 (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Ihe Anyị Kwesịrị Ịtụ Anya Ga-eme Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọdịnihu?—igw p. 19 ¶1-3 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: Nyere ụdị mmadụ niile aka ka ha mara eziokwu.—1 Tim. 2:3, 4.
Nkeji 10: Otú Pọl Si Nyere Ndị Grik Aka Ịmara Eziokwu. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 17:22-31. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Nkeji 20: Jehova Ga-enyere Gị Aka Ịkata Obi. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnyere ụmụnna vidio bụ́ Jehova Ga-enyere Gị Aka Ịkata Obi. (Ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa ỤMỤAKA ka ị hụ vidio a.) Gwa ụmụnna ka ha kwuo ihe ha mụtara na vidio a. Gwakwa ụmụaka ka ha kwuo otú vidio a sirila nyere ha aka, ha akata obi zie ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ ha. Otu n’ime ha ga-eme ihe ngosi otú o si mee ya. Ọ bụrụ na ihe e ji akpọnye vidio adịghị, tụleenụ isiokwu bụ́ “Ụmụaka Ndị Na-eme Ka Chineke Nwee Obi Ụtọ.” Ọ ga-esi n’akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, peeji nke 215 paragraf nke 1 ruo peeji nke 216 paragraf nke 3. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ihe ha mụtara. Gwakwa ụmụaka ka ha kwuo otú ihe nwata nwaanyị ahụ a kọrọ akụkọ ya mere ga-esi mee ka ha na-akata obi na-ezi ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ ha. Gwa ha ka ha kọọ otú ha sirila zie ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ ha, gwakwa otu n’ime ha ka o gosi otú o si mee ya.
Abụ nke 60 na Ekpere