Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 25
IZU NA-AMALITE NA MEE 25
Abụ nke 56 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 25 ¶1-8 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Samuel 13-15 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Samuel 13:34–14:7 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Mmadụ Ịrụ Ọrụ?—igw p. 20 ¶1-3 (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Otú Ihe E Kwuru ná Ndị Rom 8:21 Ga-esi Mezuo? Oleekwa Mgbe Ọ Ga-emezu? (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: Nyere ụdị mmadụ niile aka ka ha mara eziokwu.—1 Tim. 2:3, 4.
Nkeji 10: Gbaa Otu Onye Nlekọta Ìgwè Ajụjụ Ọnụ. Jụọ ya ajụjụ ndị a: Gịnị ka onye nlekọta ìgwè na-arụ? Olee otú i si elekọta ndị nkwusa nọ n’ìgwè ozi ubi e kenyere gị? Oleekwa otú i si enyere ha aka ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi na-aga ozi ọma? Ọ bụrụ na onye nkwusa nọ n’ìgwè ị na-elekọta akwapụ ebe o bi ma ọ bụ gbanwee nọmba ekwentị ya, gịnị mere o ji kwesị ime ka ị mara? Gịnị nwere ike ime ka ndị okenye hazie ka ìgwè nke ọ bụla na-aga ozi ọma nke ha kama ọgbakọ dum ịzụkọta gawa ozi ọma?
Nkeji 20: “Kụziere Ndị Ìsì Okwu Jehova.” Ajụjụ na azịza. Jiri otu n’ime aro a tụrụ n’isiokwu a mee ihe ngosi.
Abụ nke 96 na Ekpere