Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Jun: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? ma ọ bụ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? Ọ bụrụ na unu enweghị ha, unu nwere ike inye ndị mmadụ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Julaị na Ọgọst: E nwere ike inye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a: Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gee Chineke Ntị, ma ọ bụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? Septemba: Ụlọ Nche na Teta!
◼ Unu nyewe akụkọ ozi unu, deenụ traktị na akwụkwọ ịkpọ òkù ole unu nyere ndị mmadụ ma ọ bụ nke unu hapụrụ n’ọnụ ụzọ ndị na-anọghị n’ụlọ. Unu ga-edenye ha n’ebe e dere “Brochures and Tracts” (ya bụ, “Broshọ na Traktị”) ma ọ bụ n’ebe e dere “Booklets and Brochures” (ya bụ, “Akwụkwọ Nta na Broshọ”) n’akwụkwọ awa. Ọ bụrụ na mmadụ enwee mmasị n’ozi ọma ma nara akwụkwọ anyị e ji amụ Baịbụl, ọ bụrụgodị na ọ bụ traktị, e kwesịrị ịgba mbọ hụ na a maliteere ya ọmụmụ Baịbụl.
◼ Anyị ga-amalite ịmụ akwụkwọ Ṅomie Okwukwe Ha n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ n’izu na-amalite n’Ọktoba 19, 2015. Ọgbakọ ọ bụla ga-achọkwu akwụkwọ a kwesịrị ịtụ ọda ya ma ha tụwa ọda akwụkwọ. Ọ bụrụ na e nwere ụmụnna chọrọ nke a na-etinye n’ihe ndị dị ka kọmputa ma ọ bụ ekwentị, ha gaa na jw.org danloduo ya kama inweta nke akwụkwọ.