Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 6
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 6
Abụ nke 80 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 27 ¶1-9 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ndị Eze 7-8 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Ndị Eze 8:27-34 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Anyị Si Soro Na-emezu Amụma Dị na Hagaị 2:7? (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Ihe Ga-enyere Gị Aka Ka Ị Ghara Ịna-echegbu Onwe Gị?—igw p. 24 ¶1-3 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Cheta ụbọchị ndị gara aga.”—Diut. 32:7.
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Julaị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche na otú a ga-esi nye mmadụ Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi ndị a. E mechaa ha, unu atụlee ihe ndị dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.”
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị nkwusa ka ha kọwaa otú ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Iji Broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Malitere Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl n’Ozi Ụlọ n’Ụlọ” sirila nyere ha aka n’ozi ọma. Gwakwa ha ka ha kọọ ahụmahụ ọ bụla dị ụtọ ha nwere.
Abụ nke 67 na Ekpere