Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ụlọ Nche Julaị 1
“E nwere ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:25. [Gụọ ya.] Ì chere na ihe a o kwuru ga-ekwe omume ebe ọ bụ na o nweghị onye n’ime anyị ma ihe echi ga-abụ? [Chere ka ọ zaa.] Ụlọ Nche a kwuru otú ime ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere anyị aka ka okwu ego, nsogbu ezinụlọ, na ọgba aghara juru ebe niile ghara ime ka anyị na-echegbu onwe anyị.”
Teta! Julaị–Ọgọst
“Ọrịa na-enye anyị niile nsogbu taa. Ma, o nwere amaokwu Baịbụl na-akasi anyị niile obi anyị ga-achọ ka anyị na gị gụọ. [Gụọ Aịzaya 33:24a.] Olee otú i chere ihe ga-adị ma ọ bụrụ na anyị anaghịzi arịa ọrịa? [Chere ka ọ zaa.] Ma tupu amụma a emezuo, e nwere ihe ise anyị kwesịrị ịna-eme ka ahụ́ na-adị anyị mma. Teta! a ga-enyere gị aka ịmata ha.”