Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 13
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 13
Abụ nke 75 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 27 ¶10-18 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ndị Eze 9-11 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Ndị Eze 9:24–10:3 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ichebara Okwu Chineke Echiche Ga-enyere Gị Aka Ka Ị Ghara Ịna-echegbu Onwe Gị—igw p. 24 ¶4–p. 25 ¶2 (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Ndị Na-eto Eto Ga-amụta n’Aka Eze Hezekaya na Eze Josaya (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Mat. 28:19, 20.
Nkeji 10: Gaanụ Mee Ndị Mba Niile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M. Okwu dabeere n’isiokwu ọnwa a. Kwuo ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M,’ peeji nke 87-89. Kwuo okwu n’ihe omume ụfọdụ a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa a ma gosi otú ha si gbasa isiokwu ọnwa a.
Nkeji 10: Ha Gbara Mbọ Mụwara Ndị Ọzọ Baịbụl. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2015, peeji nke 55, paragraf nke 1, ruo peeji nke 56, paragraf nke 1; na peeji nke 69, paragraf nke 2-5. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: “Mkpa Gị Bụrụ Ime Ka Ndị Mmadụ Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs.” Ajụjụ na azịza. Jiri nkeji ole na ole gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ na-eme nke ọma n’ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl ajụjụ ọnụ. Jụọ ha ka ha kwuo otú obi dị ha na ha mụụrụ mmadụ Baịbụl, onye ahụ abata n’ọgbakọ.
Abụ nke 16 na Ekpere