Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọgọst 3
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 3
Abụ nke 63 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 28 ¶10-17 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ndị Eze 18-20 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Ndị Eze 18:30-40 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere Ndị Ji Obi Ha Niile Efe Jehova Ji Enwe Obi Ụtọ (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Ihe Baịbụl Kwuru Ga-enyere Ndị Bụ́ Ụmụ Aka?—igw p. 27 ¶1-2 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Mat. 28:19, 20.
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Ọgọst. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche na otú a ga-esi nye mmadụ Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi ndị a. E mechaa ha, unu atụlee ihe ndị dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.”
Nkeji 10: Rite Uru n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Onye ga-eme ihe omume a ga-eji nkeji ise kwuo gbasara isiokwu afọ 2015. Ya kwuchaa, ya agwa ụmụnna ka ha kwuo mgbe ha na-eji agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị. Ná mmechi okwu ya, ọ ga-agba ụmụnna ume ka ha na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụbọchị.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Abụ nke 26 na Ekpere