Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọgọst 31
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 31
Abụ nke 42 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 29 ¶16-21, igbe dị na peeji nke 299 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ndị Eze 9-11 (Nkeji 8)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Mụ onwe m na ezinụlọ m ga-efe Jehova.’—Jọsh. 24:15.
Nkeji 10: Ị̀ Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Buru ụzọ kwuo ihe dị na paragraf nke mbụ na peeji nke mbụ n’Ozi Alaeze Anyị nke Febụwarị 2014. Ebe ahụ kwuru ihe mere isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma” ji agba n’Ozi Alaeze Anyị. Kwutụ okwu n’ụfọdụ n’ime ndị anyị mụrụla. Gwa ụmụnna ka ha kwuo otú isiokwu ndị a na-agbakarị n’Ozi Alaeze Anyị sirila nyere ha aka n’ozi ọma. Gbaa mmadụ niile ume ka ha gbalịa na-amụta ihe na nke ọ bụla pụtara n’ọnwa ọ bụla. Ihe ga-enyere ha aka bụ ime ihe na-adị n’ebe e dere “Mee Ihe A n’Ọnwa A.”
Nkeji 10: Ị̀ Na-enweta ‘Nri n’Oge Kwesịrị Ekwesị’? Okwu si n’Ụlọ Nche Ọgọst 15, 2014, peeji nke 3-5. Gbaa mmadụ niile ume ka ha na-agụ akwụkwọ anyị.
Nkeji 10: Olee Otú I Kpebiri Ị Ga-esi Jekwuoro Jehova Ozi n’Afọ Ije Ozi nke 2016? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 118, paragraf nke 3. A ga-eme ihe ngosi ebe di na nwunye na-akpa ihe ha ga-eme iji jekwuoro Jehova ozi n’afọ ije ozi nke 2016.
Abụ nke 10 na Ekpere