Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Ọgọst 31, 2015.
Olee ihe ndị Sọlọmọn kwuru gbasara Jehova Chineke n’ekpere o kpere? Olee uru ichebara ihe ndị ahụ o kwuru echiche ga-abara anyị? (1 Eze 8:22-24, 28) [Julaị 6, w05 7/1 p. 30 para. 3]
Baịbụl kwuru na Devid jere ije “n’obi na-eguzosi ike n’ezi ihe.” Olee otú ihe a o mere ga-esi nyere anyị aka iji obi anyị niile na-efe Jehova? (1 Eze 9:4) [Julaị 13, w12 11/15 p. 7 para. 18-19]
Gịnị ka anyị mụtara n’otú Jehova si gwa Ịlaịja ka ọ gaa na nke nwaanyị Zarefat di ya nwụrụ anwụ? (1 Eze 17:8-14) [Julaị 27, w14 2/15 p. 14]
Olee otú ihe a kọrọ ná 1 Ndị Eze 17:10-16 ga-esi mee ka anyị tụkwasị Jehova obi kpamkpam? [Julaị 27, w14 2/15 p. 13-15]
Gịnị ka ihe Ịlaịja mere mgbe ike ụwa gwụrụ ya na-akụziri anyị? (1 Eze 19:4) [Ọgọ. 3, ia p. 102-103 para. 10-12; w14 3/15 p. 15 para. 15-16]
Gịnị ka Jehova mere mgbe ọ hụrụ na ike ụwa agwụla Ịlaịja onye amụma? Oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ụdị ihe a Chineke mere? (1 Eze 19:7, 8) [Ọgọ. 3, w14 6/15 p. 27 para. 15-16]
Olee otú Eze Ehab si were Ịlaịja? Oleekwa ihe anyị mụtara na ya? [Ọgọ. 10, igbe dị na lv p. 164-165; w14 2/1 p. 14 para. 3-4]
Gịnị ka anyị mụtara n’arịrịọ Ịlaịsha rịọrọ Ịlaịja? Oleekwa uru akụkọ a ga-abara anyị ma e nye anyị ọrụ ọhụrụ ná nzukọ Jehova? (2 Eze 2:9, 10) [Ọgọ. 17, w03 11/1 p. 31 para. 5-6]
Olee otú ndị na-eto eto ga-esi nwee ụdị okwukwe na obi ike nwatakịrị nwaanyị onye Izrel a kọrọ akụkọ ya ná 2 Ndị Eze 5:1-3 nwere? [Ọgọ. 24, w12 2/15 p. 12-13 para. 11]
Gịnị ka anyị mụtara n’aka Jihu nke ga-enyere anyị aka n’oge ikpeazụ a? (2 Eze 10:16) [Ọgọ. 31, w11 11/15 p. 5 para. 4]