Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 7
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 7
Abụ nke 3 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 30 ¶1-9 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ndị Eze 12-15 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Ndị Eze 13:12-19 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere Baịbụl Ji Agba Anyị Ume Ka Anyị Na-atụ Egwu Jehova—Diut. 5:29 (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Dị n’Akwụkwọ Ndị Dị n’Akwụkwọ Nso Grik nke Ndị Kraịst?—igw p. 31 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Mụ onwe m na ezinụlọ m ga-efe Jehova.’—Jọsh. 24:15.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị nkwusa ka ha kọwaa otú ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Inyere Ndị Malitere Ikwusa Ozi Ọma Ọhụrụ Aka,” sirila nyere ha aka n’ozi ọma. Gwakwa ha ka ha kọọ ahụmahụ ọ bụla dị ụtọ ha nwere.
Nkeji 10: Ùnu Na-agachi Ọmụmụ Ihe Anya n’Ezinụlọ Unu? Okwu si ná Ndị Hibru 10:24, 25. A ga-agba otu nwanna na nwunye ya na ụmụ ha ajụjụ ọnụ. Ajụjụ ndị a ga-ajụ ha bụ: ‘Gịnị ka nna nwe ụlọ na-eme iji hụ na ndị ezinụlọ ya na-agachi ọmụmụ ihe anya? Olee otú onye ọ bụla n’ime ha si enye aka ka ha na-agachi ọmụmụ ihe anya? Olee oge ha ji akwado ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe? Gịnị na gịnị ka ha na-eme iji hụ na ha bịara ọmụmụ ihe? Gbaa ụmụnna niile ume ka ha na-agba mbọ abịachi ọmụmụ ihe anya ma soro n’ihe a na-eme.
Nkeji 10: I Nwere Ike Inyere Ndị Ikwu Gị Aka Ịmara Chineke. (Ọrụ 10:24, 33, 48) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2015, peeji nke 87, paragraf nke 1-2 nakwa peeji nke 90, paragraf nke 1-3. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Abụ nke 118 na Ekpere