Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 2
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 2
Abụ nke 52 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
ia isi nke 1 ¶14-27, na igbe dị na p. 16 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ihe E Mere 16-20 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Ihe E Mere 17:15-27 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?—wp13 10/1 p. 16 para. 1-2 (Nkeji 5)
Nke 3: Otú Anyị Ga-esi “Jiri Ihe Ọma Na-emeri Ihe Ọjọọ”—Rom 12:21 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Gbanyenụ mgbọrọgwụ n’ime Kraịst, gbasiekwanụ ike n’okwukwe.’—Kọl. 2:6, 7.
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Nọvemba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú a ga-esi nye mmadụ Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi ndị a. E mechaa ha, ụmụnna ekwuo ihe ha mụtara n’ihe ngosi nke ọ bụla.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị nkwusa ka ha kọwaa otú ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Ịkụziri Ndị Anyị Na-amụrụ Baịbụl Otú Ha Ga-esi Na-amụ Ihe Nke Ọma,” sirila nyere ha aka n’ozi ọma. Gwakwa ha ka ha kọọ ahụmahụ ọ bụla dị ụtọ ha nwere.
Abụ nke 140 na Ekpere
Chetakwa na a ga-ebu ụzọ kpọnyere ọgbakọ abụ ọhụrụ a ka ha gee. Ya kpọchaa, gwa ụmụnna ka ha bụzie ya.