Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Bekee Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
MEE 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 32-34
“Ihe Gosiri na A Ga-akpọghachite Ndị Izrel”
it-1-E 105 ¶2
Anatọt
Jeremaya bụ onye Anatọt, ma ndị obodo ya weere ya ka ‘onye amụma na-enweghị ihe ọ datara.’ Ha nọkwa na-achọ igbu ya n’ihi na ọ na-ekwusa okwu Jehova. (Jere. 1:1; 11:21-23; 29:27) Ihe a mere ka Jehova kwuo na ọ ga-ala obodo ahụ n’iyi. Mgbe oge ya ruru, o mere ka ndị Babịlọn bịa bibie ha. (Jere. 11:21-23) Tupu, Jeruselem adaa, Jeremaya zụtara ala n’Anatọt iji gosi na a ga-esi n’ebe a dọọrọ ndị Izrel n’agha kpọghachite ha. (Jere. 32:7-9) Ndị mbụ ha na Zerubabel so lọghachite dị narị ndị ikom iri abụọ na asatọ bụ́ ndị Anatọt. Anatọt sokwa n’ebe ndị a bịara birighachi n’ime ha ọzọ.—Ezra 2:23; Nehe. 7:27; 11:32.
MEE 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 35-38
it-2-E 1228 ¶3
Zedekaya
Ihe gosiri na eze Zedekaya bụ onye ụjọ bụ na mgbe ndị isi obodo ya mechara gwa ya na ha chọrọ ka e gbuo Jeremaya, ọ zara ha, sị: “Lee! Ọ nọ n’aka unu. N’ihi na ọ dịghị ihe ọ bụla eze pụrụ igbochi unu ime.” Ma, mgbe e mechara, Zedekaya kwere ka Ibe-melek kpọrọ ndị ikom iri atọ gaa napụta Jeremaya. Mgbe e mechakwara, Zedekaya na Jeremaya kparịtara ụka. O kwere Jeremaya nkwa na ya agaghị egbu ya, nakwa na ya agaghị enyefe ya n’aka ndị na-achọ igbu ya. Ma, Zedekaya tụrụ ụjọ ihe ndị Juu sonyeere ndị Kaldia nwere ike ime ya. Ọ bụ ya mere ọ ji jụ ịchịliri ndị isi Babịlọn aka elu dị ka Jeremaya gwara ya. Ihe ọzọ gosikwara na ọ bụ onye ụjọ bụ na ọ gwara Jeremaya ka ọ ghara ịgwa ndị isi Babịlọn ahụ ihe ya na ya kparịtara.—Jere. 38:1-28.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2-E 759
Ndị Rikab
Obi tọrọ Jehova ụtọ n’ihi otú ndị Rikab si rube isi. Ha rubeere nna ha ochie isi. Ma, ndị Juda erubereghị Onye kere ha isi. (Jere. 35:12-16) Chineke kwere ndị Rikab nkwa, sị: “Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye si n’ụlọ Jọnadab nwa Rikab nke ga na-eguzo n’ihu m mgbe niile.”—Jere. 35:19.
MEE 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 39-43
“Jehova Ga-akwụghachi Onye Ọ Bụla Dị Ka Ọrụ Ya Si Dị”
it-2-E 1228 ¶4
Zedekaya
Otú Jeruselem Si Daa. N’ikpeazụ, n’afọ 607 T.O.N.K., “n’afọ nke iri na otu nke ọchịchị Zedekaya, n’ọnwa nke anọ, n’abalị itoolu n’ọnwa ahụ,” ndị agha wabatara na Jeruselem. N’abalị ụbọchị ahụ, Zedekaya na ndị agha ya gbapụrụ n’obodo ahụ. Ma, a chụkwutere Zedekaya na mbara ọzara Jeriko ma kpụrụ ya gakwuru Nebukadneza na Ribla. A nọ n’ihu Zedekaya gbuo ụmụ ya. Ebe ọ bụ na Zedekaya dị naanị ihe dị ka afọ iri atọ na abụọ n’oge ahụ, ọ ga-abụrịrị na ụmụ ya ka dị ntakịrị. Mgbe ọ hụchara ọnwụ ụmụ ya, a rụkpọsịrị ya anya, tụọkwa ya ịga ọla kọpa ma kpụrụ ya laa Babịlọn, tụba ya n’ụlọ mkpọrọ ruo ụbọchị ọ nwụrụ.—2 Eze 25:2-7; Jere. 39:2-7; 44:30; 52:6-11; tụleekwa Jere. 24:8-10; Eze 12:11-16; 21:25-27.
it-2-E 482
Nebuzaradan
Nebukadneza nyere Nebuzaradan iwu ka ọ tọhapụ Jeremaya. Nebuzaradan mere otú ahụ, jirikwa olu ọma gwa Jeremaya okwu. Ọ gwakwara ya ka ọ họrọ ihe ọ chọrọ ime, na ya ga-elekọta ya ma nye ya ihe ndị dị ya mkpa. Nebuzaradan bụ́kwa onye na-ekwuchite ọnụ eze Babịlọn, họpụtara Gedalaya ka ọ bụrụ onyeisi nke ndị Juu fọrọnụ. (2 Eze 25:22; Jere. 39:11-14; 40:1-7; 41:10) Mgbe ihe dị ka afọ ise gachara, ya bụ, ihe dị ka n’afọ 602 T.O.N.K., Nebuzaradan dọkwaara ndị Juu ndị ọzọ n’agha. Ha nwere ike ịbụ ndị gbagara n’obodo ndị ọzọ dị nso.—Jere. 52:30.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1-E 463 ¶4
Ọgụgụ Oge
A nọchibidoro Jeruselem nke ikpeazụ ya n’afọ nke itoolu nke ọchịchị Zedekaya, ya bụ, n’afọ 609 T.O.N.K. Jeruselem mechara daa n’afọ nke iri na otu nke ọchịchị ya, ya bụ, n’afọ 607 T.O.N.K. Oge a dabara n’afọ nke iri na itoolu nke ọchịchị Nebukadneza (ya bụ, ma e bido n’oge ọ rịgooro n’oche ọchịchị n’afọ 625 T.O.N.K. gụwa ya). (2 Eze 25:1-8) N’ọnwa nke ise n’afọ 607 T.O.N.K (ya bụ, n’ọnwa Ab, nke dabara na Julaị na Ọgọst) a gbara obodo ahụ ọkụ, kwatuo mgbidi ya, dọrọkwa ọtụtụ n’ime ndị nọ na ya n’agha laa. Ma, a hapụrụ “ụfọdụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha” n’ala ahụ. Ha nọkwa n’ala ahụ ruo mgbe e gburu Gedalaya, bụ́ onye Nebukadneza họpụtara, ya emezie ka ha gbalaa Ijipt, obodo Juda atọgbọrọzie n’efu. (2 Eze 25:9-12, 22-26) Ihe a mere n’ọnwa nke asaa, ya bụ, n’ọnwa Etanim (ma ọ bụ Tishri, nke dabara na Septemba na Ọktoba). N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị n’Ọktoba 1, 607 T.O.N.K. ka afọ iri asaa ahụ Jeruselem ga-atọgbọrọ n’efu malitere, gwụzie n’afọ 537 T.O.N.K. N’ọnwa nke asaa nke afọ 537 T.O.N.K., ndị Juu mbụ a tọhapụrụ lọrutere na Juda, nke mere ya afọ iri asaa obodo ahụ tọgbọọrọ n’efu kpamkpam.—2 Ihe 36:21-23; Ezra 3:1.
MEE 22-28
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 44-48
“Kwụsị ‘Ịna-achọrọ Onwe Gị Ihe Ukwu’”
it-1-E 430
Kimọsh
Mgbe Jeremaya onye amụma na-ebu amụma banyere ọdachi ga-adakwasị Moab, o kwuru na a ga-adọrọ chi kachanụ ndị Moab nwere bụ́ Kimọsh na ndị nchụàjà ya na ndị isi ya n’agha laa. Ihere ga-eme ndị Moab n’ihi na ha ga-ahụ na chi ha adịghị ike, otú ahụ ihere Betel mere alaeze ebo iri nke Izrel. O nwere ike ịbụ na ihe kpatara ya bụ ofufe a nọ na Betel fee chi nwa ehi.—Jere. 48:7, 13, 46.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2-E 422 ¶2
Moab
O nweghị otú a ga-esi kwuo na amụma ndị e buru gbasara obodo Moab emezughị nnọọ otú ahụ e si buo ha. Kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, o nweghịzi ndị bụ́ ndị Moab. (Jere. 48:42) Taa, obodo ndị e weere ka obodo ndị Moab, ya bụ, Nibo, Heshbọn, Aroa, Bet-gemọl, na Bel-mion bụzi mkpọmkpọ ebe. O nweghịkwa onye ma maka obodo ndị ọzọ.
MEE 29–JUN 4
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 49-50
“Jehova Na-agọzi Ndị Dị Umeala n’Obi ma Na-enye Ndị Dị Mpako Ntaramahụhụ”
it-1-E 54
Ndị Mmegide
Mgbe ndị Chineke na-ekwesịghị ntụkwasị obi, Chineke gbara nkịtị ka ndị na-emegide ha merie ha ma bukọrọ ihe ha. (Ọma 89:42; Ákwá 1:5, 7, 10, 17; 2:17; 4:12) Ndị mmegide ndị a chere na ọ bụ chi ha mere ha ji merie. Ha na-eto onwe ha na-etokwa chi ha, na-eche na o nweghị ihe Jehova ga-eme ha maka ihe ha mere ndị ya. (Diut. 32:27; Jere. 50:7) Ihe a mere ka Jehova kpebie na ya ga-emenyerịrị ndị mmegide a ihere (Aịza. 1:24; 26:11; 59:18; Nehọ. 1:2). O mekwara otú ahụ n’ihi aha nsọ ya.—Aịza. 64:2; Eze 36:21-24.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1-E 94 ¶6
Ụmụ Amọn
Ọ ga-abụ na mgbe Tiglat-piliza nke Atọ na otu n’ime ndị nọchiri ya zilagara ndị si n’alaeze ebe ugwu nke Izrel, (2 Eze 15:29; 17:6), ụmụ Amọn bịaziri biri n’ala ndị ebo Gad. O nweela mgbe ha lụsoro Jefta agha n’ihi ebe ahụ. Mana, ha emerighị. (Tụleekwa Ọma 83:4-8.) N’ihi ihe a, Jehova si n’ọnụ Jeremaya onye amụma baara ụmụ Amọn mba maka ịnara ndị ebo Gad ihe nketa ha. Ọ gwakwara ha banyere mbibi gaje ịbịakwasị ha na chi ha bụ́ Malkam. (Jere. 49:1-5) Ụmụ Amọn mekwara ihe ọjọọ ọzọ n’elu nke ha mere eme. Ha zigara ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ka ha wakpoo ndị Juda mgbe Eze Jehoyakim na-achị.—2 Eze 24:2, 3.