Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Bekee Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JUN 5-11
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 51-52
“Okwu Jehova Na-emezu Otú Ahụ O Si Kwuo Ya”
it-2-E 360 ¶2-3
Ndị Midia
Na Ndị Peshia emerie Babịlọn. N’ihe dị ka narị afọ asaa na iri atọ na abụọ T.O.N.K., Aịzaya onye amụma kwuru na Jehova ga-akpali ndị Midia ibuso Babịlọn agha. Ndị Midia bụ “ndị ọ na-enweghị ihe ha ji ọlaọcha kpọrọ, ndị na-enweghịkwa mmasị ọ bụla n’ọlaedo. Ha ga-eji ụta ha gbajaa ọbụna ụmụ okorobịa” ndị Babịlọn. (Aịza. 13:17-19; 21:2) N’ebe a, a kpọrọ naanị “Midia” aha. Ma, o nwere ike ịbụ na ndị Peshia sokwa ya. Ndị Grik oge ochie na-akọ akụkọ ihe mere eme na-akpọkarị naanị Midia ma ha kwuwe gbasara Midia na Peshia. Na ndị Midia enweghị ihe ha ji ọlaọcha na ọlaedo kpọrọ gosiri na ihe bụ́ mkpa ha bụ ibibi Babịlọn, ọ bụghị ịkwakọrọ ngwongwo ndị Babịlọn. N’ihi ya, ha agaghị ekwe ana aka azụ ma ọ bụ onyinye ọ bụla a ga-enye ha ka ha ghara ibibi Babịlọn. Ngwá agha bụ́ isi ndị Midia na ndị Peshia ji alụ agha bụ ụta. Ọ ga-abụ na ha ji ụta ndị a ‘gbajasịa ụmụ okorobịa’ ndị Babịlọn. Mgbe ụfọdụ, ha na-ejikwa ọla kọpa arụ ụta ndị ahụ (tụlee Ọma 18:34). Ha na-apị akụ ha nke ọma otú ọ ga-abami abami n’ahụ́ mmadụ.—Jere. 51:11.
Jeremaya kwuru (Jeremaya 51:11, 28) na “ndị eze niile nke ndị Midia” so ná ndị nọ na-ebuso Babịlọn agha. Ebe ọ bụ na ọ sịrị “ndị eze,” ọ pụtara na ọ ga-abụ na e nwere eze ọzọ ma ọ bụ ndị eze ọzọ nọ n’okpuru Saịrọs. Ihe a adịghị ịtụnanya n’ihi na ndị oge ahụ na-emekarị ụdị ihe ahụ. (Tụlee Jere. 25:25.) Ọ bụ ya mere na mgbe ndị agha Midia, Peshia, Ilam na agbụrụ ndị ọzọ nọ gburugburu merichara Babịlọn, ọ bụ Darayọs onye Midia ka “e mere eze ịchị alaeze ndị Kaldia.” O nwere ike ịbụ Eze Saịrọs onye Peshia mere ya eze.—Dan. 5:31; 9:1.
it-2-E 459 ¶4
Nabonidus
E kwuru n’Ihe Ndekọ Nabonidus gbasara abalị ahụ Babịlọn dara, sị: “Ụsụụ ndị agha Saịrọs banyere Babịlọn n’alụghị ọgụ.” Nke a pụtara na o nwere ike ịbụ na ndị agha Babịlọn alụsoghị ha ọgụ, otú ahụ Jeremaya buru n’amụma na ‘ndị dike nke Babịlọn ga-akwụsị ịlụ agha.’—Jere. 51:30.
it-1-E 237 ¶1
Babịlọn
Malite n’oge ahụ e busoro Babịlọn agha na 539 T.O.N.K., Babịlọn bidoro jiri nwayọọ nwayọọ na-ada. Ma, ha lụsoro eze na-achị ha ọgụ ugboro abụọ, ya bụ, eze Peshia bụ́ Dayarọs nke Mbụ (Histaspis). Ma, e meriri ha kpamkpam na nke abụọ ya. Mgbe e mechara, ha lụsoro Zaksis nke Mbụ agha, ma o meriri ha, bukọrọkwa ihe ha. Alegzanda Onye Ukwu bu n’obi iji Babịlọn mere isi obodo ya. Ma, ọ nwụrụ na mberede n’afọ 323 T.O.N.K. Nikatọ meriri Babịlọn n’afọ 312 T.O.N.K. bụkọrọ ọtụtụ ngwongwo ha buga n’akụkụ osimiri Taịgris. Ọ chọrọ iji ha rụọ isi obodo ọhụrụ ọ na-arụ na Seliushia. Ma, obodo Babịlọn ka dịkwa, e nwekwara ụfọdụ ndị Juu fọrọ na ya n’oge ndịozi Jizọs. Ọ bụ ya mere Pita onyeozi ji gaa Babịlọn, dị ka o kwuru n’akwụkwọ ozi ya. (1 Pita 5:13) Ihe e dere n’ihe ndị mgbe ochie e nwetara n’ebe ahụ gosiri na ụlọ arụsị Bel nọ n’obodo Babịlọn ruo ihe dị ka n’afọ 75 O.N.K. N’ihe dị ka n’agbata afọ 301 na afọ 400 O.N.K., ọ ghọọla mkpọmkpọ ebe. O mechakwara bụrụ “ikpo nkume.”—Jere. 51:37.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2-E 444 ¶9
Ugwu
Na-anọchi anya ọchịchị. Na Baịbụl, ugwu nwere ike ịnọchi anya alaeze ma ọ bụ ọchịchị. (Dan. 2:35, 44, 45; tụlee Aịza. 41:15; Mkpu. 17:9-11, 18.) N’ihi otú Babịlọn si merie ọtụtụ obodo n’agha ma bibie ha, Baịbụl kpọrọ ya “ugwu na-ebibi ihe.” (Jere. 51:24, 25) Mgbe otu ebe n’akwụkwọ Abụ Ọma na-ekwu banyere ihe Jehova mere ndị ọchịagha dị iche iche, ọ sịrị: “Ìhè ekpuchiwo gị, ị dị ebube karịa ugwu dị iche iche anụ ọhịa jupụtara.” (Ọma 76:4) Ọ ga-abụ na “ugwu dị iche iche anụ ọhịa jupụtara” pụtara alaeze dị iche iche na-akpa ike. (Tụlee Nehọ. 2:11-13.) Devid kwuru banyere Jehova, sị: “I mewo ka ugwu m guzosie ike n’ihi amara gị.” Ọ ga-abụ na ihe ọ na-ekwu bụ na Jehova ebuliela alaeze ya elu ma mee ka o guzosie ike. (Ọma 30:7; tụlee 2 Sam. 5:12.) Otú a anyị matara na ugwu nwere ike ịnọchi anya alaeze dị iche iche, ọ ga-enyere anyị aka ịghọta “ihe yiri oké ugwu na-ere ọkụ” e kwuru okwu ya ná Mkpughe 8:8. Ebe ọ bụ na e kwuru na ihe ahụ yiri oké ugwu na-ere ọkụ, ọ pụtara na ihe ahụ ga-abụ ọchịchị nke nwere ike ibibi ihe otú ahụ ọkụ si ebibi ihe.
it-2-E 882 ¶3
Osimiri
Igwe ndị agha. Jeremaya kwuru na mkpọtụ ndị agha bịara ịlụso Babịlọn ọgụ “dị ka nke ebili mmiri nke oké osimiri.” (Jere. 50:42) Mgbe o kwuru na “oké osimiri” ga-erikpu Babịlọn, ọ ga-abụ na ihe ọ na-ekwu bụ na ndị agha Midia na Peshia ga-enubata na Babịlọn bibie ya.—Jere. 51:42; tụlee Dan. 9:26.
JUN 19-25
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZIKIEL 1-5
“Obi Dị Ezikiel Ụtọ Ịkpọsa Ozi Chineke”
it-1-E 1214
Eriri Afọ
Ọ bụ n’eriri afọ anyị ka nri anyị riri si abanye anyị n’ahụ́. E ji ya tụnyere otú nri ime mmụọ si abami anyị n’obi. Ọ bụ ya mere e ji gwa Ezikiel n’ọhụụ ka ọ taa akwụkwọ mpịakọta ahụ ka o juputa n’ime eriri afọ ya. Ihe ọ pụtara bụ na Ezikiel ga-agba mbọ ghọta ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ahụ nke ọma ma na-atụgharị uche na ya, si otú ahụ mee ka ọ bamie ya n’obi. Akwụkwọ mpịakọta ahụ ọ tara gbara ya ume, meekwa ka ọ mata ihe ọ ga-ekwu.—Ezik. 3:1-6; tụlee Mkpu. 10:8-10.