Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
ỌKTOBA 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 9-10
“Jizọs Na-elekọta Atụrụ Ya”
ihe e ji kọwaa Jọn 10:1, nwtsty
Ogige atụrụ
A na-arụ ogige atụrụ iji chebe ụmụ atụrụ ka ndị ohi ghara izuru ha ma ọ bụkwanụ ka anụ ọjọọ ghara iri ha. Ndị ọzụzụ atụrụ na-edowe atụrụ ha n’ogige atụrụ n’abalị. N’oge ochie, anaghị arụchi elu ogige atụrụ arụchi. Ha anaghị aha otu. A na-ejikarị nkume agba ogige a, ọ na-enwekwa naanị otu ọnụ ụzọ. (Ọnụ Ọgụ. 32:16; 1 Sam. 24:3; Zef. 2:6) Jọn kwuru banyere isi “n’ọnụ ụzọ” nke “onye nche ọnụ ụzọ” na-eche nche abanye n’ogige atụrụ. (Jọn 10:1, 3) N’ogige atụrụ nke obodo nwe, ihe karịrị otu ìgwè atụrụ nwere ike ịnọ na ya n’abalị. A na-enwekwa onye nche ọnụ ụzọ na-eche ha nche. N’ụtụtụ, onye nche ọnụ ụzọ ga-emeghere ndị ọzụzụ atụrụ ụzọ ka onye nke ọ bụla kpọrọ atụrụ nke ya. Onye ọzụzụ atụrụ ọ bụla na-akpọ atụrụ nke ya, ha na-amata olu ya ma soro ya. (Jọn 10:3-5) Jizọs kwuru banyere ihe a ha na-eme mgbe ọ na-eme ihe atụ otú o si elekọta ndị na-eso ụzọ ya.—Jọn 10:7-14.
ihe a kọwara na Jọn 10:16, nwtsty
ga-akpọtakwa ha: Ma ọ bụ “duru ha.” Okwu Grik bụ́ aʹgo a sụgharịrị ebe a nwere ike ịpụta “ịkpọta” ma ọ bụ “idu,” dabere n’ihe a na-ekwu. Otu Baịbụl e dere n’asụsụ Grik n’ihe dị ka afọ 200 dere okwu Grik ọzọ yiri ya (sy·naʹgo) n’amaokwu a. A na-asụgharịkarị okwu Grik a “ịchịkọta.” Dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma, Jizọs na-achịkọta, na-edu, na-echebe ma na-enye atụrụ ndị nọ n’ìgwè atụrụ a (a kpọkwara ha “ìgwè atụrụ nta” na Luk 12:32) nri. Ọ na-emekwara atụrụ ọzọ ya otu ihe ahụ. Ha niile na-aghọ otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ. Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ndị na-eso ụzọ ya ga-adị n’otu.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe a kọwara na Jọn 9:38, nwtsty
kpọọrọ ya isiala: Ma ọ bụ “hulatara ya; kwanyere ya ùgwù.” Mgbe ọ bụla e ji okwu Grik bụ́ pro·sky·neʹo na-akọwa banyere ife chi dị iche iche, a na-asụgharị ya “ife ofufe.” (Mat. 4:10; Luk 4:8) Ma n’amaokwu a, nwoke ahụ kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya, nke Jizọs gwọrọ, kpọọrọ ya isiala n’ihi na ọ ghọtara na Jizọs bụ onye nnọchiteanya Chineke. O wereghị Jizọs ka Chineke ma ọ bụ chi, kama, dị ka “Nwa nke mmadụ” ahụ e buru n’amụma nakwa Mesaya ahụ Chineke nyere ike. (Jọn 9:35) Mgbe ọ kpọọrọ Jizọs isiala, ọ ga-abụ na o mere ya otú ahụ ọtụtụ ndị e dere banyere ha n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mere. Ha hụ ndị amụma, ndị eze, ma ọ bụ ndị ọzọ na-anọchite anya Chineke, ha akpọọrọ ha isiala. (1 Sam. 25:23, 24; 2 Sam. 14:4-7; 1 Eze 1:16; 2 Eze 4:36, 37) Ọtụtụ mgbe, ihe mere ndị mmadụ ji kpọọrọ Jizọs isiala bụ iji gosi na obi dị ha ụtọ na Chineke mere ka ha mata onye Jizọs bụ ma ọ bụkwanụ na ha matara na Chineke ji ya na-arụ ọrụ.—Mat. 2:2; 8:2; 14:33; 15:25.
ihe a kọwara na Jọn 10:22, nwtsty
ememme nraranye: Aha ememme a n’asụsụ Hibru bụ Hanukkah (chanuk·kahʹ), nke pụtara “Nraranye.” A na-eme ya ụbọchị asatọ, malite n’abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Kislev, mgbe ọ fọrọ obere ka ọnwa Disemba gwụ, (sgd isi nke 19) iji cheta ụbọchị ha raara ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem nyefee Chineke nke ugboro abụọ ya n’afọ 165 Tupu Oge Ndị Kraịst. Eze Siria aha ya bụ Antiokọs Epifanes nke anọ kparịrị Jehova bụ́ Chineke ndị Juu mgbe o merụrụ ụlọ nsọ ya. Dị ka ihe atụ, ọ rụrụ ebe ọ ga na-achụrụ arụsị àjà n’elu nnukwu ebe ịchụàjà Jehova, bụ́ ebe a na-anọ achụrụ Jehova àjà nsure ọkụ kwa ụbọchị. N’abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Kislev, n’afọ 168 Tupu Oge Ndị Kraịst, Antiokọs mere ọtụtụ ihe iji merụọ ụlọ nsọ Jehova kpamkpam. O ji ézì chụọ àjà n’ebe ịchụàjà ahụ, were mmiri anụ ézì ahụ fesasịa n’ebe ịchụàjà ahụ. Ọ kpọkwara ọnụ ụzọ ámá ebe ịchụàjà ahụ ọkụ, kụtuokwa ebe ndị nchụàjà na-anọ. O bupụrụ ebe ịchụàjà ahụ e ji ọlaedo rụọ, tebụl a na-edowe achịcha a na-eche n’ihu Chineke na ihe ndọba oriọna e ji ọlaedo rụọ. Ọ raraziri ụlọ nsọ ahụ nye chi Zus nke Olimpọs. Mgbe afọ abụọ gachara, Judas Makabius weghaara obodo ahụ na ụlọ nso ya, e meekwa ka ụlọ nsọ ahụ dịghachi ọcha. Mgbe e mechara, a raara ya nyeghachi Jehova n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Kislev, afọ 165 Tupu Oge Ndị Kraịst, ya bụ kpọmkwem afọ atọ kemgbe Antiokọs nọ ebe ahụ chụọrọ chi Zus àjà. A maliteghachikwara ịnọ ebe ahụ achụrụ Jehova àjà nsure ọkụ kwa ụbọchị. O nweghị ihe e kwuru na Baịbụl gosiri na Jehova mere ka Judas Makabius merie eze Siria ahụ ma gwa ya ka ọ rụzigharịa ụlọ nsọ ahụ. Ma, Jehova ejitụla ndị mba ọzọ, dị ka Saịrọs onye Peshia mezuo ihe ọ chọrọ maka ofufe ya. (Aịza. 45:1) N’ihi ya, ọ dịghị njọ iche na Chineke nwere ike iji onye si ná mba ọ họọrọ mezuo uche ya. Akwụkwọ Nsọ kwuru na ụlọ nsọ ahụ ga-adị, a nọrọkwa na ya na-efe Jehova iji mezuo amụma ndị e buru gbasara Mesaya ahụ, ozi ya, nakwa àjà ọ ga-achụ. Ihe ọzọkwa bụ na ndị Livaị ga na-achụ àjà na ya ruo mgbe Mesaya ahụ ga-achụ àjà ka ukwu, ya bụ inye ndụ ya maka ụmụ mmadụ. (Dan. 9:27; Jọn 2:17; Hib. 9:11-14) A gwaghị Ndị Kraịst ka ha na-eme Ememme Nraranye. (Kọl. 2:16, 17) Ma, e nweghị ihe gosiri na Jizọs ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya katọrọ ime ememme a.
ỌKTOBA 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 11–12
“Nwee Ọmịiko Ka Jizọs”
ihe ụfọdụ a kọwara na Jọn 11:24, 25, nwtsty
Amaara m na ọ ga-ebili: Mata chere na Jizọs na-ekwu gbasara mbilite n’ọnwụ a ga-enwe n’ọdịnihu, n’ụbọchị ikpeazụ. (Jọn 6:39) O kwetasiri ike na ihe a ga-eme eme. Ụfọdụ ndị ndú okpukpe n’oge ahụ, a na-akpọ ndị Sadusii, ekwetaghị na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ n’agbanyeghị na ọ bụ nkụzi doro anya e dere n’Akwụkwọ Nsọ. (Dan. 12:13; Mak 12:18) Ndị Farisii ekwere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ma, Mata ma na Jizọs kụziri na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ. Ọ makwa na e nweela ndị ọ kpọlitere, ma o nweghị nke n’ime ha a kpọlitere nọruru ihe Lazarọs nwanne ya nọrọ tupu a kpọlite ha.
Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ: Ọnwụ Jizọs nwụrụ mere ka o kwe omume ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Mgbe a kpọlitechara Jizọs, Jehova nyere ya ikike ịkpọlilte ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ na ime ka ndị mmadụ dịrị ndụ ebighị ebi. (Jọn 5:26) Ná Mkpughe 1:18, Jizọs kpọrọ onwe ya “onye dị ndụ” nke ji “mkpịsị ugodi nke ọnwụ na nke Hedis.” N’ihi ya, Jizọs bụ olileanya nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. O kwere nkwa imeghe ili ma nye ndị nwụrụ anwụ ndụ, ụfọdụ ga-eso ya achị n’eluigwe, ebe ndị nke ọzọ ga-anọ n’ụwa mgbe Alaeze ya ga-achị ụwa.—Jọn 5:28, 29; 2 Pita 3:13.
ihe ụfọdụ a kọwara na Jọn 11:33-35, nwtsty
na-akwa ákwá: Okwu Grik maka ‘ịkwa ákwá’ na-apụtakarị ibe ákwá otú mmadụ ga-anụ ya. Ọ bụkwa ya ka e ji kọwaa ihe Jizọs mere mgbe ọ na-ekwu banyere mbibi Jeruselem na-abịanụ.—Luk 19:41.
ọ sụrụ ude . . . o nyekwara ya nsogbu: Okwu abụọ a e ji kwuo otú obi dị Jizọs gosiri na ihe ahụ wutere ya nke ukwuu. Okwu Grik a sụgharịrị “sụrụ ude” (em·bri·maʹo·mai) na-egosi ihe imetụ mmadụ n’ahụ́. Ma n’ebe a, o gosiri na ihe a wutere Jizọs nke ukwuu nke na ọ sụrụ ude. Okwu Grik a sụgharịrị “nyekwara ya nsogbu” (ta·rasʹso) nwere ike ịpụta obi ịjọ mmadụ njọ. Ọ pụtara “ihe inye mmadụ ezigbo nsogbu n’obi; ime ka mmadụ ruo ezigbo uju ma ọ bụ nwee ihe mgbu.” Ọ bụkwa otu okwu a ka e ji kọwaa otú obi dị Jizọs mgbe ọ na-ekwu banyere Judas ịrara ya nye na Jọn 13:21.—Jọn 11:35.
n’ime mmụọ ya: Okwu Grik bụ́ pneuʹma a sụgharịrị n’amaokwu a nwere ike ịpụta ihe dị mmadụ n’obi nke na-eme ka mmadụ kwuo ma ọ bụ mee ihe o mere.
Anya mmiri gbara: Ọ bụ otu okwu Grik bụ́ da·kryʹo a sụgharịrị “anya mmiri gbara” n’amaokwu a ka a sụgharịkwara “anya mmiri” na Luk 7:38; Ọrụ 20:19, 31; Hib. 5:7; Mkpu. 7:17; 21:4. Ma a na-ejikarị ya akọwa anya mmiri ịgba mmadụ karịa mmadụ ibepụta ákwá ebepụta. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ọ bụ naanị ebe a ka e dere na “anya mmiri gbara” mmadụ. Ọ dịkwa iche ‘n’ịkwa ákwá’ e dere na Jọn 11:33 (gụọ ihe a kọwara n’amaokwu a), e ji kọwaa ákwá Meri na ndị Juu ndị ọzọ bere. Jizọs ma na ya na-aga ịkpọlite Lazarọs, ma o wutere ya nke ukwuu na ndị enyi ya ọ hụrụ n’anya na-eru uju. Ịhụnanya na ọmịiko o nweere ha mere ka anya mmiri gbaa ya n’ihu ọha. Akụkọ a mere ka o doo anya na Jizọs na-enwere ndị mmehie Adam mere ka onye ha nwụọ ọmịiko.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe a kọwara na Jọn 11:49, nwtsty
nnukwu onye nchụàjà: Mgbe ụmụ Izrel nọọrọ onwe ha, nnukwu onye nchụàjà na-arụgide ọrụ ya ruo mgbe ọ nwụrụ. (Ọnụ Ọgụ. 35:25) Ma mgbe ndị Rom chịwara ha, ọ bụ ndị isi ndị ọchịchị Rom nyere ikike na-ahọpụta ma ọ bụ na-ewepụ nnukwu onye nchụaja. Ndị Rom họpụtara Keyafas ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà. Keyafas bụ nnukwu onye nchụàjà ma ọru ya nke ọma ma dịrị akọ. Ọ rụtekwara ọrụ ahụ aka karịa ndị nke bu ya ụzọ. A họpụtara ya n’ihe dị ka n’afọ 18, ya anọgidekwa n’ọrụ ya ruo n’ihe dị ka afọ 36. Mgbe Jọn kwuru na Keyafas bụ nnukwu onye nchụàjà n’afọ ahụ, ya bụ, n’afọ 33, ọ ga-abụ na ọ na-ekwu na afọ ahụ e gburu Jizọs so n’afọ ndị Keyafas bụ nnukwu onye nchụàjà.—Gụọ sgd isi nke 16 ka ị hụ ebe o nwere ike ịbụ na ụlọ Keyafas dị.
ihe ụfọdụ a kọwara na Jọn 12:42, nwtsty
ndị na-achị achị: N’ebe a, okwu Grik maka “ndị na-achị achị” nwere ike ịpụta ndị so ekpe ikpe n’ụlọikpe ukwu ndị Juu bụ́ Sanhedrin. Ọ bụkwa ya ka e dere na Jọn 3:1 ebe kwuru gbasara Nikọdimọs onye sokwa ná ndị na-ekpe ikpe n’ụlọikpe ahụ.—Jọn 3:1.
ịchụpụ ha n’ụlọ nzukọ: Ọ bụ naanị na Jọn 9:22; 12:42; na 16:2 ka e dere okwu Grik a bụ́ a·po·sy·naʹgo·gos. Ndị mmadụ na onye a chụpụrụ n’ụlọ nzukọ anaghị emekọ ihe, ha na-ewere ya ka onye a jụrụ ajụ. Imeso mmadụ otú a ga-eme ka ihe siere onye ahụ na ezinụlọ ya ike. Ụlọ nzukọ bụ ebe a na-anọ akụzi ihe. Ma mgbe ụfọdụ, a na-anọ ebe ahụ ekpe ikpe, apịa onye dara iwu ihe, ma ọ bụ ekpebi onye a ga-achụpụ n’ụlọ nzukọ.—Mat. 10:17.
ỌKTOBA 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 13–14
“M Na-enye Unu Ihe Nlereanya”
ihe a kọwara na Jọn 13:5, nwtsty
ịsa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya: Ihe ụmụ Izrel oge ochie na-eyikarị n’ụkwụ bụ sandal. Sandal ahụ na-ekpuchi naanị ọbọ ụkwụ, e jirizie eriri kegide ya n’elu ụkwụ. N’ihi ya, e nweghị ihe ga-eme ka ụkwụ onye na-eme njem ghara iru unyi n’ihi na uzuzu ma ọ bụ apịtị na-ejukarị n’ụzọ. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ omenala na onye chọrọ ịbanye n’ụlọ mmadụ ga-eyipụ akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ bụrụ na onye ọ gara na nke ya na-ele ọbịa nke ọma, ọ ga-ahụ na a sara ụkwụ ya. E nwere ebe dị iche iche e kwuru gbasara ịsa ụkwụ na Baịbụl. (Jen. 18:4, 5; 24:32; 1 Sam. 25:41; Luk 7:37, 38, 44) Mgbe Jizọs sara ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya, o ji ya kụziere ha na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi ma na-ejere ibe ha ozi.
ihe a kọwara na Jọn 13:12-14, nwtsty
kwesịkwara: Ma ọ bụ “jikwa ụgwọ.” Ndị Grik na-ekwukarị okwu Grik a sụgharịrị “kwesịkwara” ebe a mgbe ha na-ekwu okwu ego. Ọ na-apụtakarị “iji mmadụ ụgwọ; ihe e ji ụgwọ imere mmadụ.” (Mat. 18:28, 30, 34; Luk 16:5, 7) N’amaokwu a nakwa n’ebe ndị ọzọ, o nwere ike ịpụta iji ụgwọ imere mmadụ ihe ma ọ bụ ihe mmadụ kwesịrị imere ibe ya.—1 Jọn 3:16; 4:11; 3 Jọn 8.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Jọn 14:6) Jizọs wee sị ya: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.
ihe a kọwara na Jọn 14:6, nwtsty
Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ: Jizọs bụ ụzọ n’ihi na ọ bụ naanị n’aka ya ka anyị nwere ike isi kpee ekpere, Chineke anụ ya. Ọ bụkwa ya bụ “ụzọ” ụmụ mmadụ na Chineke ga-esi adịghachi ná mma. (Jọn 16:23; Rom 5:8) Jizọs bụ eziokwu n’ihi na ọ kụziri eziokwu ma mee ihe ọ kụziri. O mezukwara ọtụtụ amụma ndị gosiri na ọ bụ ya ka Chineke ji na-emezu nzube ya. (Jọn 1:14; Mkpu. 19:10) Amụma ndị a ghọrọ “ee [ma ọ bụ mezuru] site na ya.” (2 Kọr. 1:20) Jizọs bụ ndụ n’ihi na o ji ndụ ya chụọ àjà ka ụmụ mmadụ nwee ike inweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” ya bụ, “ndụ ebighị ebi.” (1 Tim. 6:12, 19; Efe. 1:7; 1 Jọn 1:7) Ọ ga-aghọkwara ọtụtụ nde mmadụ a ga-akpọlite n’ọnwụ “ndụ.” Ha ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs.—Jọn 5:28, 29.
ihe a kọwara na Jọn 14:12, nwtsty
ọrụ karịrị ọrụ ndị a: Jizọs anaghị ekwu na ọrụ ebube ndị na-eso ụzọ ya ga-arụ ga-akarị nke ya. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na ebe ha ga-ezi ozi ọma ga-akarị ebe o ziri, ha ga-ezi ọtụtụ ndị ozi ọma, oge ha ga-eji ezi ndị mmadụ ozi ọma ga-akarịkwa nke ya. Ihe Jizọs kwuru gosiri na ọ tụrụ anya na ndị na-eso ụzọ ya ga-arụrụ ọrụ ahụ gaa n’ihu.
ỌKTOBA 22-28
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 15–17
“Unu Abụghị nke Ụwa”
ihe a kọwara na Jọn 15:19, nwtsty
ụwa: N’ebe a, okwu Grik bụ́ koʹsmos pụtara ụmụ mmadụ ndị na-anaghị efe Chineke. Ọ bụ naanị n’Oziọma Jọn ka e kwuru na Jizọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya abụghị nke ụwa ma ọ bụ na ha esighị n’ụwa. Jọn dekwara ugboro abụọ ọzọ Jizọs kwuru ya n’ekpere ikpeazụ ya na ndị na-eso ụzọ ya kpekọrọ ọnụ.—Jọn 17:14, 16.
ihe a kọwara na Jọn 15:21, nwtsty
n’ihi aha m: Na Baịbụl, e kwuo okwu “aha,” o nwere ike ịnọchi anya onye na-aza aha ahụ, ihe e ji mara onye ahụ, na ihe niile gbasara onye ahụ. (Matiu 6:9) A bịa n’aha Jizọs, ihe ọ nọchiri anya ya gụnyere ikike na ọkwá Nna ya nyere ya. (Mat. 28:18; Fil. 2:9, 10; Hib. 1:3, 4) Ihe Jizọs na-akụzi n’ebe a bụ ihe mere ndị bụ́ nke ụwa ji emegide ndị na-eso ụzọ ya. Ọ bụ n’ihi na ha amaghị onye ahụ nke zitere ya. Ịmara Chineke ga-eme ka ha ghọta ihe aha Jizọs nọchiri anya ya. (Ọrụ 4:12) Ọ pụtara na ha ga-aghọta na Jizọs bụ Onye Ọchịchị Chineke họpụtara, Eze nke ndị eze onye ọ bụla kwesịrị ịkpọrọ isiala iji nweta ndụ.—Jọn 17:3; Mkpu. 19:11-16; tụlee Ọma 2:7-12.
it-1 516
Obi Ike
Ndị Kraịst kwesịrị inwe obi ike ma ọ bụrụ na ha agaghị amụta àgwà ndị kpọrọ Jehova asị na-akpa, ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ n’agbanyeghị na ụwa kpọrọ ha asị. Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ụwa, unu na-enwe mkpagbu, ma nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.” (Jọn 16:33) O nweghị mgbe Ọkpara Chineke kwere ka ihe ụwa na-eme megharịa ya anya, kama, o meriri ụwa n’ihe niile n’ihi na o nweghị mgbe o mere ka ha. Otú Jizọs si jiri àgwà ọma ya merie ụwa nwere ike ime ka anyị nwee obi ike iṅomi ya ma ghara ịbụ nke ụwa, meekwa ka anyị ghara ịkpawa àgwà ka ụwa.—Jọn 17:16.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe ụfọdụ a kọwara na Jọn 17:21-23, nwtsty
otu: Ma ọ bụ “ịdị n’otu.” Jizọs kpere ekpere ka ndị na-eso ụzọ bụrụ “otu” otú ahụ ya na Nna ya bụ “otu,” ya bụ, ka ha na-emekọ ihe ọnụ ma nwee otu obi. (Jọn 17:22) Ná 1 Kọr. 3:6-9, Pọl kọwara otú Ndị Kraịst si adị n’otu ka ha na ibe ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.—Gụọ 1 Kọr. 3:8; Jọn 10:30; 17:11.
ka ha wee dị n’otu n’ụzọ zuru okè: Ma ọ bụ “ka ịdi n’otu ha zuo ezuo.” N’amaokwu a, Jizọs jikọtara ịdị n’otu n’ụzọ zuru okè na ịbụ onye Nna ya hụrụ n’anya. Ihe a o kwuru dabara n’ihe e kwuru na Kọl. 3:14. Ebe ahụ sịrị: “Ịhụnanya . . . bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” Ịdị n’otu a apụtaghị na ikike ndị na-eso ụzọ ya niile ga-aha otu, àgwà ha abụrụ otu, otú ha si eche echiche abụrụkwa otu. Kama, ọ pụtara na ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-adị n’otu n’otú ha si eme ihe, n’ihe ha kweere nakwa n’ihe ha na-akụzi.—Rom 15:5, 6; 1 Kọr. 1:10; Efe. 4:3; Fil. 1:27.
ihe a kọwara na Jọn 17:24, nwtsty
tọọ ntọala ụwa: Okwu Grik maka “tọọ ntọala” ka a sụgharịrị “ịtụrụ ime” ná Ndị Hibru 11:11, mgbe a na-ekwu banyere “mkpụrụ nke afọ” ma ọ bụ nwa. N’amaokwu a, “tọọ ntọala ụwa” pụtara mgbe Adam na Iv malitere ịmụ ụmụ. Jizọs kpọrọ Ebel aha mgbe ọ na-ekwu banyere mgbe “a tọrọ ntọala ụwa.” Ọ ga-abụ n’ihi na ọ bụ ya bụ onye mbụ n’ime ụmụ Adam nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi nakwa onye mbụ ‘e dere aha ya n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ ahụ malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.’ (Luk 11:50, 51; Mkpu. 17:8) Ihe ndị a Jizọs gwara Nna ya n’ekpere gosiri na Chineke hụrụ Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’anya tupu Adam atụwa Iv nwunye ya ime.
ỌKTOBA 29– NỌVEMBA 4
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 18–19
“Jizọs Gbaara Eziokwu Ahụ Àmà”
ihe ụfọdụ a kọwara na Jọn 18:37, nwtsty
gbaara . . . àmà: N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu Grik ndị a sụgharịrị “ịgba àmà” nwere ọtụtụ ihe ha pụtara. A na-ejikarị ha akọwa mmadụ ịgba àmà ihe merenụ ma ọ bụ onye ji anya ya hụ ihe merenụ. Ma, ha nwekwara ike ịpụta “ikwusa; ikwu ihe ga-eme ka ekweta ihe; ikwu okwu ọma banyere ihe.” Ọ bụghị naanị na Jizọs gbara àmà ma kwusaa eziokwu ndị doro ya anya, o bikwara ndụ ya otú mere ka amụma niile e buru na nkwa niile Nna ya kwere bụrụ eziokwu. (2 Kọr. 1:20) E buru amụma banyere ihe niile Alaeze Chineke na Mesaya ya ga-eme. Ihe niile Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa, ma ndụ ya o ji chụọ àjà mezuru amụma niile e buru gbasara ya, gụnyere onyinyo nke ihe ọma gaje ịbịa nke dị n’Iwu ahụ. (Kọl. 2:16, 17; Hib. 10:1) E nwere ike ikwu na Jizọs si n’okwu ya na omume ya “gbaara eziokwu àmà.”
eziokwu: Ihe Jizọs na-ekwu abụghị gbasara eziokwu nkịtị, kama ọ bụ eziokwu gbasara nzube Chineke. Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ ná nzube Chineke bụ na Jizọs, “nwa Devid,” ga-abụ Nnukwu Onye Nchụàjà nakwa Eze nke Alaeze Chineke. (Mat. 1:1) Jizọs kwuru na ihe kacha mkpa mere o ji bịa n’ụwa jee ozi bụ ka o kwusaa eziokwu banyere Alaeze ahụ. Ndị mmụọ ozi kwusakwara banyere Alaeze ahụ tupu a mụọ Jizọs nakwa mgbe a mụrụ ya na Betlehem nke Judia, bụ́ obodo a mụrụ Devid.—Luk 1:32, 33; 2:10-14.
ihe a kọwara na Jọn 18:38a, nwtsty
Gịnị bụ eziokwu?: Ọ ga-abụ na Paịlet na-ajụ ihe bụ́ eziokwu nkịtị, ọ bụghị “eziokwu” Jizọs na-ekwu banyere ya. (Jọn 18:37) Ọ bụrụ na ihe mere o ji jụọ Jizọs ajụjụ ahụ bụ ka ọ mata ihe bụ́ eziokwu, Jizọs gaara aza ya ajụjụ ahụ. Ma ọ ga-abụ na Paịlet jụrụ ajụjụ ahụ iji gosi na o kweghị na e nwere ihe bụ́ eziokwu. E nwere ike ikwu na ihe ọ na-ekwu bụ, “Olee ihe bụ́ eziokwu? E nweghị ihe dị otú ahụ.” O cheredịghị ka Jizọs zaa ya ajụjụ ahụ, ya apụọ gakwuru ndị Juu n’èzí.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe a kọwara na Jọn 19:30, nwtsty
kubie ume: Ụfọdụ ndị kwuru na okwu Grik a sụgharịrị “kubie ume” pụtara na Jizọs ji aka ya kwụsị ịgba mbọ ka ọ ghara ịnwụ ebe ọ bụ na e mechawo ihe niile. O ji obi ya niile ‘wụpụrụ ọnwụ mkpụrụ obi ya.’—Aịza. 53:12; Jọn 10:11.
ihe a kọwara na Jọn 19:31, nwtsty
Ụbọchị Izu Ike ahụ bụ nke ukwu: Naịsan 15 bụ́ ụbọchị na-esote ụbọchị Ememme Ngabiga na-abụ ụbọchị izu ike n’agbanyeghị ụbọchị ọ dabara n’izu. (Lev. 23:5-7) Ma ọ bụrụ na Ụbọchị Izu ike a dabakwara n’Ubọchị Izu Ike nke izu ahụ (ụbọchị nke asaa n’izu ndị Juu, nke na-ebido mgbe anyanwụ dara na Fraịdee ruo mgbe anyanwụ dara na Satọdee), a na-akpọ ya Ụbọchị Izu Ike “nke ukwu.” Jizọs nwụrụ na Fraịdee, ọ bụkwa ụdị ụbọchị izu ike a ka e nwere n’ụbọchị sotere ụbọchị ọ nwụrụ. N’agbata afọ 29 na afọ 35, ọ bụ naanị n’afọ 33 ka Naịsan 14 dabara na Fraịdee. N’ihi ya, nchọpụta a kwadoro na ọ bụ na Naịsan 14 afọ 33 ka Jizọs nwụrụ.