Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
NỌVEMBA 5-11
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 20–21
“Ị̀ Hụrụ M n’Anya Karịa Ihe Ndị A?”
ihe ụfọdụ a kọwara na Jọn 21:15, 17, nwtsty
Jizọs sịrị Saịmọn Pita: Ọ bụ obere oge Pita gọnahụchara Jizọs ugboro atọ ka ya na Jizọs kwurịtara okwu a. Jizọs jụrụ Pita ugboro atọ ma ọ̀ hụrụ ya n’anya iji chọpụta ihe dị Pita n’obi. Na nke ugboro atọ, o ‘wutere Pita.’ (Jọn 21:17) Na Jọn 21:15-17, okwu Grik abụọ bụ́ a·ga·paʹo, na phi·leʹo e dere n’amaokwu ndị ahụ ka a sụgharịrị ịhụnanya na Baịbụl Igbo anyị. Jizọs jụrụ Pita ugboro atọ sị: “Ị̀ hụrụ m n’anya?” Pita sikwa n’obi ya zaghachi Jizọs ugboro atọ na ọ ‘hụrụ ya n’anya.’ Ugboro atọ ahụ Pita gwara Jizọs na ọ hụrụ ya n’anya, Jizọs gwara ya na ịhụnanya ahụ kwesịrị ime ka ọ na-azụ ma ọ bụ na-akụziri ndị na-eso ya ihe, ma na-elekọta ha. Ọ bụ ndị na-eso ụzọ a ka ọ kpọrọ “ụmụ atụrụ m.” (Jọn 21:16, 17; 1 Pita 5:1-3) Jizọs nyere Pita ohere ka o kwuo ugboro atọ na ọ hụrụ ya n’anya, ma nyezie ya ọrụ ilekọta atụrụ ya. Jizọs si otú a mee ka o doo anya na ya agbagharala Pita maka ịgọnahụ ya ugboro atọ.
ị̀ hụrụ m n’anya karịa ihe ndị a?: Ụfọdụ ndị na-aghọta na okwu a sụgharịrị “karịa ihe ndị a” kwesịrị ịbụ “karịa ndị a.” Ha na-ekwu na o nwere ike ịpụta na Jizọs na-ajụ Pita, sị: “Ị̀ hụrụ m n’anya karịa otú i si hụ ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ n’anya” ma ọ bụ “ị̀ hụrụ m n’anya karịa otú ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ hụrụ m.” Ma, ọ ga-abụ na ihe Jizọs na-ajụ Pita bụ ma ọ̀ hụrụ ya n’anya karịa azụ̀ ndị ahụ ha ka gbutere ma ọ bụ ọrụ ịkụ azụ̀ ya. O yiri ka Jizọs ọ na-ajụ ya, sị: ‘Ị̀ hụrụ m n’anya karịa ịchụ akụnụba? Ya bụrụ otú ahụ, na-azụ atụrụ m.’ Ajụjụ ahụ dabara adaba n’ihi otú Pita sibu were ọrụ ịkụ azụ̀. N’agbanyeghị na Pita so ná ndị mbụ Jizọs kpọrọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya (Jọn 1:35-42), o soroghị Jizọs jewa ozi oge niile ozugbo. Kama, o soturu ya, ma mechaa laghachị n’ọrụ ịkụ azụ̀ ya. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, Jizọs kpọrọ ya, ya ahapụ nnukwu ọrụ ịkụ azụ̀ ya na-anaghị enye ya ohere, ma ghọọ onye “na-akụta mmadụ.” (Mat. 4:18-20; Luk 5:1-11) Obere oge Jizọs nwụchara, Pita gwara ndịozi ndị ọzọ na ya na-agaghachị n’ọrụ ịkụ azụ̀ ya, ha esoro ya. (Jọn 21:2, 3) Ọ ga-abụrịrị na Jizọs ji oge a na-eme ka Pita mara na o kwesịrị ikpebi nke ọ ga-ebute ụzọ ná ndụ ya: Ọ̀ ga-ebute ọrụ ịkụ azụ̀ ya ụzọ, nke azụ̀ ndị ahụ nọ ha n’ihu nọchiri anya ya, ka ọ̀ ga-ebute ọrụ ịzụ atụrụ Jizọs ụzọ, ya bụ, ịkụziri ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ ihe?—Jọn 21:4-8.
nke ugboro atọ: Pita gọnahụrụ Onyenwe ya ugboro atọ; Jizọs nyeziri ya ohere ugboro atọ ikwu na ọ hụrụ ya n’anya. Mgbe Pita kwuchara ya, Jizọs gwara ya ka o bute ihe gbasara Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ ya, na ọ bụ ya ga-egosi na ọ hụrụ ya n’anya n’eziokwu. Pita na ụmụnna ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi ga na-azụ, na-elekọta ma na-eme ka okwukwe atụrụ Kraịst sikwuo ike. Ọ bụ eziokwu na ndị a so ná ndị e tere mmanụ, a ka kwesịrị ịna-akụziri ha Okwu Chineke.—Luk 22:32.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe a kọwara na Jọn 20:17, nwtsty
Kwụsị ịrapara m n’ahụ́: Okwu Grik bụ́ haʹpto·mai nwere ike ịpụta “imetụ aka” ma ọ bụ “ịrapara n’ahụ; ijide ihe aka.” Ụfọdụ Baịbụl sụgharịrị ihe a Jizọs kwuru ka ọ bụrụ: “Emetụla m aka.” Ma, Jizọs anaghị agwa Meri Magdalin ka ọ ghara imetụ ya aka, ebe ọ bụ na o gbochighị ụmụ nwaanyị ndị ọzọ hụrụ ya mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ ‘ijide ya n’ụkwụ.’ (Mat. 28:9) O nwere ike ịbụ na Meri Magdalin chere na Jizọs na-achọ ịlaghachi n’eluigwe ozugbo. Ebe ọ na-achọghị ka Onyenwe ya hapụ ya, o jidesiri ya ike ka ọ ghara ịpụ. Iji mee ka obi sie ya ike na ọ laghachiwabeghị, Jizọs gwara Meri ka ọ kwụsị ịrapara ya n’ahụ́, kama, ka ọ gaa gwa ndị na-eso ụzọ ya na ya ebiliela n’ọnwụ.
ihe a kọwara na Jọn 20:28, nwtsty
Onyenwe m na Chineke m: Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụ Jizọs ka Tọmọs gwara okwu a ma onye o bu n’obi kwuo ya bụ Chineke bụ́ Nna Jizọs. Ndị ọzọ ana-ekwu na okwu Grik mbụ e ji dee ya gosiri na ọ bụ Jizọs ka ọ na-agwa okwu. Ọ bụrụgodị na ọ bụ eziokwu, anyị kwesịrị iji ihe ndị ọzọ gbara amaokwu ahụ gburugburu ghọta ihe o bu n’obi kwuo “Onyenwe m na Chineke m” n’amaokwu a. Ebe ọ bụ na Jizọs ebula ụzọ zie ozi ka a gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m arịgokwuru Nna m na Nna unu nakwa Chineke m na Chineke unu,” e nweghị ihe mere a ga-eji kwuwa na Tọmọs chere na Jizọs bụ Chineke onye pụrụ ime ihe niile. (Gụọ ihe a kọwara na Jọn 20:17) Tọmọs anụtụla ebe Jizọs na-ekpegara “Nna” ya ekpere na-akpọ ya “onye naanị ya bụ ezi Chineke.” (Jọn 17:1-3) N’ihi ya, ọ ga-abụ na ihe mere Tọmọs ji kpọọ Jizọs “Chineke m” bụ maka ihe ndị a: O weere Jizọs ka “chi,” ọ bụghị Chineke onye pụrụ ime ihe niile. (Gụọ ihe a kọwara na Jọn 1:1) O nwekwara ike ịbụ na ọ kpọrọ ya Chineke otú ahụ ndị ohu Chineke n’oge gara aga si kpọọ ndị mmụọ ozi nọchiri anya Jehova, Jehova n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọ ga-abụ na ọ nụla banyere ụfọdụ ndị na-agwa ndị mmụọ ozi Chineke zitere okwu ka à ga-asị na ha na-agwa Jehova Chineke okwu. Mgbe ụfọdụkwa ọ na-abụ onye dere akụkọ ahụ na Baịbụl kpọrọ ndị mmụọ ozi, Jehova. (Tụlee Jen. 16:7-11, 13; 18:1-5, 22-33; 32:24-30; Ikpe 6:11-15; 13:20-22.) N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na Tọmọs kpọrọ Jizọs “Chineke m” iji gosi na ọ ghọtara na Jizọs bụ onye nnọchiteanya Chineke ma ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ezi Chineke ahụ.
NỌVEMBA 12-18
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌRỤ NDỊOZI 1-3
“Chineke Awụkwasị Ọgbakọ Ndị Kraịst Mmụọ Nsọ”
w86 12/1 29 ¶4-5, 7
Inye Onyinye Nke Na-enye Ọṅụ
N’ụbọchị a malitere ọgbakọ Ndị Kraịst n’afọ 33, puku mmadụ atọ ahụ e mere baptizim ọhụrụ ‘na ibe ha nọ na-ekerịta ihe, na-erikọ nri, na-ekpekọkwa ekpere.’ Gịnị mere ha ji mee ya? Ọ ga-eme ka ọ dịrị ha mfe ịnọgide “na-ege ntị n’ozizi ndịozi” nke ga-eme ka okwukwe ha sikwuo ike.—Ọrụ 2:41, 42.
Ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu bịara na Jeruselem bu n’obi ịnọ ebe ahụ naanị maka Ememme Pentikọst. Ma, ndị nke ghọrọ Ndị Kraịst kpebiziri ịnọtụkwu na Jeruselem ka ha mụtakwuo ihe ndị ga-eme ka okwukwe ha sikwuo ike. Nke a meziri ka e nwee mkpa ihe oriri na ụlọ ebe ha ga-anọ. Ụfọdụ ndị ọbịa ahụ ejighi ego ga-ezuru ha ma ha nọtụkwuo, ebe ụfọdụ ji nke zuuru ha, ya amafọkwa. N’ihi ya, ha malitere ịtụkọta ego nakwa ihe ndị ha nwere ka e jiri ya nyere ndị nke nwere mkpa aka.—Ọrụ 2:43-47
E nwere ndị rere ala ha nakwa ihe ndị ọzọ ha nwere ha iji nweta ego ha ga-eji enye aka. O nweghị onye a manyere ire ihe o nwere ma ọ bụ inye onyinye, o nweghịkwa onye a chọrọ iji ihe a a na-atụkọta mee ka ọ daa ogbenye. Ọ pụtaghịkwa na ndị nke bara ọgaranya rere ihe niile ha nwere, dazie ogbenye. Kama ọ bụ ọmịiko ha nwere maka ụmụnna ha ndị nọ ná mkpa mere ha ji ree ihe ndị ha nwere, ma were ego niile ha retara nye onyinye ka e nwee ike ime ka ozi Alaeze na-aga n’ihu.—Tụlee 2 Ndị Kọrịnt 8:12-15.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 61 ¶1
Jizọs Kraịst
“Onye Nnọchiteanya Ukwu nke ndụ.” Jịzọs ji ndụ ya zuru okè chụọ àjà iji gosi obi ọma Nna ya nwere n’ebe anyị nọ. Àjà a ọ chụrụ mere ka ndị na-eso ụzọ ya a họọrọ nwee ike iso ya chịa n’eluigwe nakwa ka e nwee ụmụ mmadụ ga-ebi n’ụwa mgbe Alaeze ya ga na-achị. (Mat. 6:10; Jọn 3:16; Efe. 1:7; Hib. 2:5) Jizọs si otú a bụrụ “Onye Nnọchiteanya Ukwu nke ndụ” maka mmadụ niile. (Ọrụ 3:15) Ihe mbụ okwu Grik a sụgharịrị “Onye Nnọchiteanya Ukwu” pụtara bụ “Onyeisi ndị na-edu ndu.” Ọ bụkwa okwu yiri ya ka a sụgharịrị “onye na-achị anyị” n’Ọrụ 7:27, 35, mgbe a na-ekwu banyere Mozis n’Izrel.
it-1 129 ¶2-3
Ònye ka e ji dochie anya Judas Iskarịọt ka o mee ka ndịozi zuo iri na abụọ?
Ebe ọ bụ na Judas Iskarịọt ekwesịghị ntụkwasị obi nwụọ, e nweziri ndịozi iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi. N’oge ahụ a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ya anọọkwa n’ụwa abali iri anọ, o nweghị onye ọ họpụtara ka ọ nọchie Judas. Ma ihe dị ka ụbọchị iri tupu Pentikọst, a bịara hụ na ọ dị mkpa ka e jiri onye ọzọ dochie anya Judas. Pita kwughachiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ nke gosiri na e kwesịrị iji onye ọzọ dochie ya, ọ bụghị n’ihi na ọ nwụrụ kama n’ihi na o kwesịghị ntụkwasị obi nwụọ. (Ọrụ 1:15-22; Ọma 69:25; 109:8; tụlee Mkpu. 3:11.) Mgbe Jems onyeozi nwụrụ, o nweghị ihe gosiri na a chọwara iji onye ọzọ dochie ya.—Ọrụ 12:2.
Ihe Pita kwuru gosikwara na onye a ga-eji edochi onyeozi ga-abụrịrị onye ma Jizọs n’onwe ya, ya abụrụkwa na o ji anya ya hụ ihe ndị o mere, ọrụ ebube ndị ọ rụrụ nakwa karịchaa, na ọ nọ ya mgbe e si n’ọnwụ kpọlite Jizọs. N’ihi ya, o doro anya na ọ gaghị ekwe omume ịna-enwe ndị ga na-anọchi ndịozi ka oge na-aga, ọ gwụkwala ma ọ̀ bụ Chineke ji aka ya họpụta onye ahụ. Tupu Pentikọst, e nwere ụmụ nwoke ruru ihe niile a a chọrọ maka onye ga-anọchi onyeozi. A kpọpụtara abụọ n’ime ha ka e were otu n’ime ha dochie anya Judas na-ekwesịghị ntụkwasị obi. N’iburu ihe e dere n’Ilu 16:33 n’uche, ha fere nza, ya ama Matayas, a họrọ ya ma “gụnye ya n’onye so ná ndịozi iri na otu ahụ.” (Ọrụ 1:23-26) N’ihi ya, o so na “mmadụ iri na abụọ ahụ” doziri nsogbu ahụ bilitere gbasara ndị na-eso ụzọ na-asụ Grik (Ọrụ 6:1, 2), ọ ga-abụkwa na Pọl gụnyere ya na “mmadụ iri na abụọ ahụ” ndị Jizọs pụtara n’ihu ha mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ na 1 Ndị Kọrịnt 15:4-8. N’ụbọchị Pentikọst, e nweziri ndịozi iri na abụọ e ji tọọ ntọala Izrel nke Chineke.
NỌVEMBA 19-25
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌRỤ NDỊOZI 4–5
“Ha Nọgidere Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu”
it-1 128 ¶3
Onyeozi
Ọrụ ha n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Mmụọ nsọ Chineke wụsara ndịozi n’ụbọchị Pentikọst mere ka ha nwee obi ike. Ọrụ Ndịozi isi mbụ ruo isi ise kọrọ otú ndịozi si jiri obi ike zie ndị mmadụ ozi ọma banyere mbilite n’ọnwu Jizọs n’agbanyeghị na ndị ọchịchị nọ na-atụ ha mkpọrọ, na-akụ ha ihe ma na-eyikwa ha egwu na a ga-egbu ha. Obere oge mgbe Pentikọst gachara, otú mmụọ nsọ si nyere ndịozi aka ha ana-elekọta ọgbakọ Ndị Kraịst mere ka ọ mụbaa. (Ọrụ 2:41; 4:4) Ná mmalite, ọ bụ naanị na Jeruselem ka ha na-ezi ozi ọma, ma ha mechara ruo Sameria, n’oge na-adịghịkwa anya, ozi ọma ruru n’ebe niile n’ụwa n’oge ahụ.—Ọrụ 5:42; 6:7; 8:5-17, 25; 1:8.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 514 ¶4
Nkume Isi Nkuku
Abụ Ọma 118:22 kwuru na nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ ga-aghọ “isi nkuku” (Hib., roʼsh pin·nahʹ). Jizọs kwughachiri ihe a e kwuru n’Abụ Ọma, ma gosi na ọ bụ ya bụ “nkume isi nkuku bụ́ isi.” (Mat. 21:42; Mak 12:10, 11; Luk 20:17) Otú ahụ ọ na-adị mfe ịhụ nkume dị n’ọnụ ọnụ elu ụlọ, ka o doro anya na Jizọs Kraịst bụ nkume isi nkuku ahụ bụ́ isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ, nke e ji tụnyere ụlọ nsọ ime mmụọ. Pita kwukwara na ọ bụ Kraịst ka a na-ekwu gbasara ya n’Abụ Ọma 118:22, na-egosi na ọ bụ Jizọs bụ “nkume ahụ” ndị na-ewu ụlọ jụrụ nke Chineke mere ka ọ ghọọ “isi nkuku.”—Ọrụ 4:8-12; gụọkwa 1 Pita 2:4-7.