Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
FEBỤWARỊ 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ ROM 1–3
“Nọgide Na-azụ Akọnuche Gị”
(Ndị Rom 2:14, 15) N’ihi na mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ, ndị na-enweghị iwu, sitere n’ọmụmụ na-eme ihe ndị dị n’iwu, ndị a, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu, ha bụụrụ onwe ha iwu. 15 Ọ bụ ha bụ ndị na-egosi na e dere isi ihe dị n’iwu ahụ n’obi ha, ebe akọ na uche ha so ha na-agba àmà, n’echiche nke ha kwa, ha bụ ndị a na-ebo ebubo ma ọ bụ ọbụna ndị a na-agọpụ.
Olee Otú Ị Ga-esi Na-enwe Ezi Akọnuche?
6 Ọ̀ bụ naanị ndị ohu Jehova ka e nyere akọnuche? Tụlee ihe Pọl onyeozi ji ike mmụọ nsọ kwuo: ‘Mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ, ndị na-enweghị iwu, sitere n’ọmụmụ na-eme ihe ndị dị n’iwu, ndị a, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu, ha bụụrụ onwe ha iwu. Ọ bụ ha bụ ndị na-egosi na e dere isi ihe dị n’iwu ahụ n’obi ha, ebe akọnuche ha so ha na-agba àmà, n’echiche nke ha kwa, ha bụ ndị a na-ebo ebubo ma ọ bụ ọbụna ndị a na-agọpụ.’ (Ndị Rom 2:14, 15) Ihe a dị n’ime anyị nke na-agbara anyị àmà nwere ike ime ka ọbụna ndị na-amatụdịghị iwu Jehova mee ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke mgbe ụfọdụ.
(Ndị Rom 2:15) Ọ bụ ha bụ ndị na-egosi na e dere isi ihe dị n’iwu ahụ n’obi ha, ebe akọ na uche ha so ha na-agba àmà, n’echiche nke ha kwa, ha bụ ndị a na-ebo ebubo ma ọ bụ ọbụna ndị a na-agọpụ.
Olee Otú Ị Ga-esi Na-enwe Ezi Akọnuche?
8 Olee otú ị ga-esi mee mkpebi metụtara akọnuche? O yiri ka naanị ihe ụfọdụ ndị na-eme bụ, ha nyochaa onwe ha, ha atụlee otú ha si ele ihe anya, kpebizie ihe ha ga-eme. Ha mechaa, ha nwere ike ikwu, sị, “Akọnuche m adịghị ama m ikpe.” Ihe nwere ike ịgụsi obi anyị agụụ ike, ọbụna mee ka akọnuche anyị hie ụzọ. Baịbụl kwuru, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite. Ònye pụrụ ịmara ya?” (Jeremaya 17:9) N’ihi ya, ihe na-agụ obi anyị ekwesịghị ịbụ ihe kacha mkpa anyị ga-echebara echiche. Kama nke ahụ, ihe mbụ anyị ga-echebara echiche bụ ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ.
9 Ọ bụrụ na anyị ejiri akọnuche a zụrụ azụ mee mkpebi, mkpebi anyị ga-egosi na anyị na-atụ egwu Chineke, ọ bụghị ime ihe anyị chọrọ. Tụlee otu ezigbo ihe atụ. Gọvanọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Nehemaya nwere ikike ịna ndị bi na Jeruselem ego na ụtụ isi. Ma, o meghị otú ahụ. N’ihi gịnị? Ime ihe na-adịghị Jehova mma site n’imegbu ndị Chineke amasịtụdịghị ya. Ọ sịrị: “Mụ onwe m emeghị otú ahụ n’ihi egwu Chineke.” (Nehemaya 5:15) Ezi ịtụ egwu Chineke dị oké mkpa, ya bụ, mmadụ iji obi ya dum na-atụ egwu ka ya ghara ime ihe na-adịghị Nna anyị nke eluigwe mma. Isi otú ahụ na-asọpụrụ Chineke ma na-atụ egwu ya ga-eme ka anyị si n’Okwu ya nweta nduzi mgbe anyị chọrọ ime mkpebi.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Ndị Rom 3:4) Tụfịakwa! Kama ka Chineke bụrụ onye eziokwu, ọ bụ ezie na mmadụ niile bụ ndị ụgha, ọbụna dị ka e dere, sị: “Ka e wee gosi na ị bụ onye ezi omume n’okwu gị, ka i wee merie mgbe a na-ekpe gị ikpe.”
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom
3:4. Mgbe echiche mmadụ gbara iche n’ihe Okwu Chineke na-ekwu, anyị ga-ekwe “ka Chineke bụrụ onye eziokwu” site n’ikwenye n’ihe e kwuru na Baịbụl ma mee ihe kwekọrọ n’uche Chineke. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi soro na-ekwusa ozi ọma ma na-enyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị nwere ike inyere ha aka ịhụ na Chineke bụ onye eziokwu.
(Ndị Rom 3:24, 25) a na-akpọkwa ha ndị ezi omume, nke bụ́ onyinye e nyere n’efu, site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ site ná ntọhapụ nke si n’ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ. 25 Chineke wepụtara ya dị ka àjà ime udo; udo a na-abịa site n’inwe okwukwe n’ọbara ya. Nke a bụ iji gosi ezi omume nke ya, n’ihi na ọ na-agbaghara mmehie ndị e mere n’oge gara aga mgbe Chineke nọ na-enwe ndidi;
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom
3:24, 25—Olee otú ‘ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ’ ga-esi kpuchie “mmehie ndị e mere n’oge gara aga” tupu a kwụọ ya? Amụma mbụ e buru banyere Mesaya ahụ, bụ́ nke e dekọrọ na Jenesis 3:15, mezuru n’afọ 33 O.A., bụ́ mgbe e gburu Jizọs n’elu osisi ịta ahụhụ. (Gal. 3:13, 16) Ma ozugbo Jehova buchara amụma ahụ, n’anya ya a kwụọlarị ụgwọ àjà mgbapụta ahụ, n’ihi na ọ dịghị ihe nwere ike igbochi Chineke imezu nzube ya. N’ụzọ dị otú a, Jehova nwere ike ịgbaghara mmehie ụmụ Adam ndị nwere okwukwe ná nkwa ahụ dabere n’àjà Jizọs Kraịst ka ga-eji ndụ ya chụọ n’ọdịnihu. Àjà mgbapụta ahụ mekwara ka o kwe omume na a ga-akpọlite ndị nwụrụ tupu oge Ndị Kraịst.—Ọrụ 24:15.
FEBỤWARỊ 11-17
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ ROM 4–6
“Chineke Mere Ka Anyị Mata Ịhụnanya Ya”
(Ndị Rom 5:8) Ma Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya ya, n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.
(Ndị Rom 5:12) N’ihi ya, dị nnọọ ka mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere—.
Chineke Mere Ka Anyị Mata Ịhụnanya Ya
5 Pọl mere ka anyị mara otú nke a si mee. Ọ sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Rom 5:12) Anyị kwesịrị ịghọta nke a n’ihi na Chineke mere ka e dee otú ndụ mmadụ si malite. Jehova kere mmadụ abụọ, bụ́ Adam na Iv. Onye kere ihe niile zuru okè, otú ahụkwa ka mmadụ abụọ mbụ, bụ́ nne na nna anyị mbụ, zuru. Chineke nyere ha naanị otu iwu ha ga-edebe, gwakwa ha na ha ga-anwụ ma ọ bụrụ na ha adaa iwu ahụ. (Jen. 2:17) Ma, ha họọrọ ime ihe ga-egbu ha, ya bụ, ha dara ezigbo iwu Chineke nyere ha, si otú a gosi na ha achọghị ka ọ bụrụ Onye Na-enye Iwu na Ọkaakaa.—Diut. 32:4, 5.
(Ndị Rom 5:13, 14) N’ihi na mmehie dị n’ụwa tupu Iwu ahụ, ma a dịghị agụrụ onye ọ bụla mmehie mgbe iwu na-adịghị. 14 Ka o sina dị, ọnwụ chịrị dị ka eze malite n’Adam ruo na Mozis, ọbụna chịa ndị na-emeghị mmehie nke yiri mmebi iwu Adam, bụ́ onye yiri onye ahụ nke gaje ịbịa.
Chineke Mere Ka Anyị Mata Ịhụnanya Ya
6 Adam emehiechaala tupu ya amụọ ụmụ, si otú ahụ bufee ụmụ ya niile mmehie na ihe ọ na-akpata. O doro anya na ha adaghị iwu Chineke otú Adam dara, n’ihi ya, ọ bụghị ikpe a mara Adam ka a mara ha, e nweghịkwa iwu e dere ede dị mgbe ahụ. (Jen. 2:17) Ma, ụmụ Adam ketara mmehie. N’ihi ya, mmehie na ọnwụ chịrị dị ka eze ruo mgbe Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ya nke mere ka o doo anya na ha bụ ndị mmehie. (Gụọ Ndị Rom 5:13, 14.) E nwere ike iji nsogbu mmehie e ketara eketa na-akpata tụnyere ọrịa ụmụ nwere ike ibute n’aka ndị mụrụ ha. N’agbanyeghị na ụfọdụ ụmụaka nọ n’ezinụlọ ahụ butere ọrịa ahụ, o nwere ike ọ gaghị abụ ha niile ga-ebute ya. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka mmehie dị. Anyị niile ketara mmehie n’aka Adam, n’ihi ya kwa, ọnwụ na-eche anyị niile. È nwere otú anyị ga-esi nwere onwe anyị?
(Ndị Rom 5:18) Ya mere, dị nnọọ ka a mara ụdị mmadụ niile ikpe site n’otu njehie, otú ahụkwa ka e si n’otu omume ziri ezi kpọọ ụdị mmadụ niile ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ.
(Ndị Rom 5:21) Ka gịnị wee mee? Ka obiọma na-erughịrị mmadụ wee chịa dị ka eze site n’ezi omume nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi site na Jizọs Kraịst Onyenwe anyị, dị nnọọ ka mmehie na ọnwụ chịrị dị ka eze.
Chineke Mere Ka Anyị Mata Ịhụnanya Ya
9 Gịnị ka okwu Grik a sụgharịrị ka ọ bụrụ “ịkpọ ụmụ mmadụ ndị ezi omume” nakwa ‘ịkpọ ụdị mmadụ niile ndị ezi omume’ pụtara? Otu onye na-asụgharị Baịbụl dere banyere nke a, sị: “E nwere ihe ya na ya yiri n’okwu ikpe. Ọ na-akọwa mgbanwe e nwere n’otú Chineke si na-ele mmadụ anya, ọ bụghị mgbanwe onye ahụ mere ná ndụ ya . . . Ọ dị ka iji Chineke tụnyere onyeikpe nke kpelaara onye a kpọtara n’ụlọikpe ya nke e boro ebubo na ọ bụ onye ajọ omume. Ma Chineke ekpebie ka a hapụ ya.”
10 Na gịnị ka “Onyeikpe nke ụwa dum” ga-agbakwasị ụkwụ kpebie ka a hapụ onye ajọ omume? (Jen. 18:25) Ihe mbụ Chineke mere iji mee ka nke a kwe omume bụ izite Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa n’ihi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Jizọs mere uche Nna ya ruo n’isi n’agbanyeghị na a nwara ya ọnwụnwa, kwaa ya emo, kwutọọkwa ya. O guzosiri ike n’ezi ihe ruo mgbe ọ nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ. (Hib. 2:10) Mgbe Jizọs chụrụ ndụ ya zuru okè n’àjà, o nyere ihe mgbapụta nke nwere ike ịtọhapụ ụmụ Adam, ma ọ bụ gbapụta ha ná mmehie na ọnwụ.—Mat. 20:28; Rom 5:6-8.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Ndị Rom 6:3-5) Ka ọ̀ bụ unu amaghị na anyị niile bụ́ ndị e mere baptizim ka anyị na Kraịst Jizọs dị n’otu bụ ndị e mere baptizim ka anyị nwụọ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ? 4 Ya mere, e liri anyị na ya site na baptizim e mere anyị ka anyị nwụọ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ, ka anyị onwe anyị wee na-ebi ndụ ọhụrụ otú ahụ, dị nnọọ ka e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst site n’ebube nke Nna ya. 5 N’ihi na ọ bụrụ na e mewo ka anyị na ya dị n’otu n’ọdịdị nke ọnwụ ya, n’ezie, a ga-emekwa ka anyị na ya dị n’otu n’ọdịdị nke mbilite n’ọnwụ ya;
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom
6:3-5—Gịnị ka mmadụ ịbụ onye e mere baptizim ka ya na Kraịst Jizọs dịrị n’otu na ịbụ onye e mere baptizim ịnwụ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ pụtara? Mgbe Jehova jiri mmụọ nsọ ya tee ndị na-eso ụzọ Kraịst mmanụ, ha na Jizọs na-abụ otu, ha esonyekwa n’ọgbakọ nke ndị e tere mmanụ, nke bụ́ ahụ́ Kraịst, ebe Kraịst n’onwe ya bụ Isi. (1 Kọr. 12:12, 13, 27; Kọl. 1:18) Otú a ka e si eme ha baptizim n’ime Kraịst Jizọs. E mekwara Ndị Kraịst e tere mmanụ ‘baptizim ịnwụ ụdị ọnwụ [Kraịst] nwụrụ’ n’ụdị na ha na-adị ndụ nke iji onwe ha chụọ àjà ma jụ olileanya ọ bụla nke ịdị ndụ n’ụwa. N’ihi ya, ọnwụ ha bụ ọnwụ iji ndụ ha chụọ àjà dị ka Jizọs ji ndụ nke ya chụọ, ọ bụ ezie na ọnwụ ha abụghị ihe mgbapụta. Ọ bụ mgbe ha nwụrụ a kpọlitekwa ha ibi ndụ n’eluigwe ka ha na-abụ ndị e mere baptizim ịnwụ ụdị ọnwụ Kraịst nwụrụ.
(Ndị Rom 6:7) N’ihi na a tọhapụwo onye nwụrụ anwụ ná mmehie ya.
Ànyị Ga-ahụ Ndị Nna Nna Anyị Nwụrụ Anwụ Ọzọ?
A kpọlite ndị ajọ omume n’ọnwụ, à ga-ekpe ha ikpe n’ihi ihe ha mere tupu ha anwụọ? Mba. Ndị Rom 6:7 kwuru na “a tọhapụwo onye nwụrụ anwụ ná mmehie ya.” Mgbe ndị ajọ omume nwụrụ, ha akwụọla ụgwọ mmehie ha. N’ihi ya, ọ bụ ihe ha mere mgbe a kpọlitechara ha n’ọnwụ ka a ga-eji kpee ha ikpe, ọ bụghị ihe ha mere n’amaghị ama tupu ha anwụọ. Olee uru ihe a Chineke buuru ha n’obi ga-abara ha?
FEBỤWARỊ 18-24
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ ROM 7–8
“Ì Ji ‘Ịtụsi Anya Ike Na-echere’?”
(Ndị Rom 8:19) N’ihi na ịtụsi anya ike nke ihe e kere eke na-echere mkpughe nke ụmụ Chineke.
Kwe Ka Jehova Mee Ka I Nwere Onwe Gị n’Ezie
17 Mgbe Pọl na-ekwu na Jehova ga-eme ka ndị ohu ya nọ n’ụwa nwere onwe ha n’ọdịnihu, o dere, sị: “Ịtụsi anya ike nke ihe e kere eke na-echere mkpughe nke ụmụ Chineke.” O kwukwara, sị: “A ga-emekwa ka ihe e kere eke nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Rom 8:19-21) “Ihe e kere eke” e kwuru n’ebe a bụ ụmụ mmadụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ndị ga-erite uru ná “mkpughe” a ga-ekpughe ụmụ Chineke e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Mgbe a ga-amalite ikpughe “ụmụ Chineke” bụ mgbe ha ga-esi n’eluigwe soro Kraịst bibie ndị ajọ omume niile ma mee ka “oké ìgwè mmadụ” banye n’ụwa ọhụrụ.—Mkpu. 7:9, 14.
(Ndị Rom 8:20) N’ihi na e doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu, ọ bụghị site n’ọchịchọ nke ya, kama site n’aka onye ahụ nke doro ya, ka o nwee olileanya
Ka Anyị Na-aṅụrị Ọṅụ n’Olileanya Anyị
11 Jehova nyere ụmụ mmadụ ihe ga-eme ‘ka ha nwee olileanya’ mgbe o kwere nkwa na ya ga-anapụta ha n’aka “agwọ mbụ ahụ,” bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, site n’aka “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa. (Mkpu. 12:9; Jen. 3:15) Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ isi sekpụ ntị ná “mkpụrụ” ahụ. (Gal. 3:16) Ọnwụ Jizọs na mbilite n’ọnwụ ya mere ka ndị mmadụ nwee olileanya na a ga-anapụta ha n’aka mmehie na ọnwụ. Mmezu olileanya ahụ gbasara ‘mkpughe a ga-ekpughe ụmụ Chineke.’ Ndị ahụ e tere mmanụ, bụ́ ndị e mere ka ha dị ebube, so ná “mkpụrụ” ahụ. A ‘ga-ekpughe’ ha mgbe ha ga-eso Kraịst bibie ụwa ọjọọ Setan. (Mkpu. 2:26, 27) Nke a ga-eme ka a zọpụta ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.—Mkpu. 7:9, 10, 14.
(Ndị Rom 8:21) na a ga-emekwa ka ihe e kere eke nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.
Ka Anyị Na-aṅụrị Ọṅụ n’Olileanya Anyị
12 N’Otu Puku Afọ ahụ Kraịst ga-achị, ahụ́ ga-eru ndị mmadụ Chineke ‘kere eke’ ala! N’oge ahụ, ụzọ ọzọ a ga-esi ‘kpughee’ “ụmụ Chineke” e mere ka ha dị ebube bụ na ha ga-eso Kraịst bụrụ ndị nchụàjà, nyere ndị mmadụ aka irite uru n’àjà mgbapụta ahụ Jizọs chụrụ. Mgbe Alaeze eluigwe ga na-achị ndị mmadụ, a ga-amalite ịnapụta ha n’aka mmehie na ọnwụ. A ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka ndị na-erubere Chineke isi ‘nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure.’ Ọ bụrụ na ha erubere Jehova isi na Puku Afọ ahụ nakwa mgbe a ga-ele ha ule ikpeazụ ná ngwụcha puku afọ ahụ, a ga-edenye aha ha ‘n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ’ ruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-enweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Mkpu. 20:7, 8, 11, 12) N’eziokwu, ọ bụ olileanya dị ebube!
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Ndị Rom 8:6) N’ihi na ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ọnwụ, ma ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo;
Ì Chetara?
Olee ihe dị iche ‘n’ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́’ na “ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ”? (Rom 8:6)
Onye ‘tụkwasịrị uche n’anụ ahụ́’ bụ onye uche ya niile dị n’ihe na-agụ ya agụụ na ihe ọ chọrọ. Ọ bụ ihe ọ na-ekwukarị gbasara ya na ihe riri ya isi. Onye ‘tụkwasịrị uche na mmụọ nsọ’ bụ onye na-eche echiche otú Chineke si eche; ọ bụ mmụọ nsọ na-eduzi ihe niile ọ na-eme. “Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́” pụtara ọnwụ. Ma, “ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ” pụtara ndụ na udo.—w16.12, peeji nke 15 ruo 17.
(Ndị Rom 8:26, 27) Otú ahụkwa, mmụọ nsọ na-enyekwara anyị aka n’adịghị ike anyị; n’ihi na anyị amaghị nsogbu nke anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ya dị ka ọ dị anyị mkpa ịdị na-ekpe, ma mmụọ nsọ n’onwe ya na-arịọrọ anyị arịrịọ mgbe anyị na-asụ ude n’ekwughị okwu. 27 Ma onye ahụ nke na-enyocha obi maara ihe bụ́ nzube nke mmụọ nsọ, n’ihi na ọ na-arịọrọ ndị nsọ arịrịọ dị ka Chineke si chọọ.
Gịnị Ka Ekpere Gị Na-egosi Banyere Gị?
20 Mgbe ụfọdụ, e nwere ike anyị agaghị ama ihe anyị ga-ekwu mgbe naanị anyị na-ekpe ekpere. Pọl dere, sị: “Anyị amaghị nsogbu nke anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ya dị ka ọ dị anyị mkpa ịdị na-ekpe, ma mmụọ nsọ n’onwe ya na-arịọrọ anyị arịrịọ mgbe anyị na-asụ ude n’ekwughị okwu. Ma onye ahụ [ya bụ, Chineke] nke na-enyocha obi maara ihe bụ́ nzube nke mmụọ nsọ.” (Rom 8:26, 27) Jehova mere ka e dee ọtụtụ ekpere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ na-anabata ekpere ndị a dị ka à ga-asị na ọ bụ anyị kpere ha, ma na-emere anyị ha. Chineke ma anyị, marakwa ihe ihe ndị o nyere ndị dere Baịbụl ike mmụọ nsọ ka ha kwuo pụtara. Jehova na-aza ekpere anyị mgbe mmụọ nsọ “na-arịọrọ” anyị arịrịọ. Ma, ka anyị na-amụ Okwu Chineke na-aga, ọ gaghịzi na-ara anyị ahụ́ ịmata ihe anyị ga-ekpe n’ekpere.
FEBỤWARỊ 25–MACH 3
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ ROM 9-11
“Ihe Atụ E Ji Osisi Oliv Mee”
(Ndị Rom 11:16) Ọ bụrụkwa na ihe e weere dị ka mkpụrụ mbụ dị nsọ, ntụ ọka ya a gwakọtara agwakọta dịkwa nsọ; ọ bụrụkwa na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, alaka ya dịkwa nsọ.
‘Lee Otú Amamihe Nke Chineke Si Dị Omimi!’
13 Pọl onyeozi ji ndị ọzọ sokwa ná mkpụrụ Ebreham tụnyere alaka ndị dị n’osisi oliv. (Rom 11:21) Osisi oliv a nke a kụrụ n’ubi na-anọchite anya otú Chineke ga-esi emezu ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebreham gbara. Mgbọrọgwụ osisi ahụ dị nsọ, ọ na-anọchikwa anya Jehova, na-egosi na ọ bụ Jehova na-enye Izrel nke Chineke ndụ. (Aịza. 10:20; Rom 11:16) Ogwe osisi oliv ahụ na-anọchite anya Jizọs, onye bụ́ isi ná mkpụrụ Ebreham. Alaka ya niile bụ ‘ọnụ ọgụgụ zuru ezu’ nke ndị ọzọ so bụrụ mkpụrụ Ebreham.
(Ndị Rom 11:17) Otú ọ dị, ọ bụrụ na a nyakapụrụ alaka ụfọdụ, ma nyado gị onwe gị n’etiti alaka ndị fọdụrụ, ọ bụ ezie na ị bụ oliv ọhịa, i wee ghọọ onye na-eketa òkè n’ọtụtụ ihe ọma dị na mgbọrọgwụ oliv ahụ,
(Ndị Rom 11:20, 21) Ọ dị mma! A nyakapụrụ ha n’ihi na ha enweghị okwukwe, ma ọ bụ okwukwe mere i ji guzoro. Kwụsị inwe echiche dị elu, kama na-atụ egwu. 21 N’ihi na ọ bụrụ na Chineke emereghị alaka ndị ahụ osisi ahụ bu pụta ụwa ebere, ọ gaghị emere gị ebere.
‘Lee Otú Amamihe Nke Chineke Si Dị Omimi!’
15 Ma, gịnị ka Jehova mere iji mezuo nzube ya? Pọl kwuru na a nyadoro alaka ụfọdụ si n’osisi oliv ọhịa n’osisi oliv nke ubi, ka ha wee nọchie alaka ndị a nyakapụrụ n’osisi oliv nke ubi. (Gụọ Ndị Rom 11:17, 18.) N’ihi ya, e nwere ike ikwu na a nyadoro Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị si mba ọzọ, ndị ụfọdụ n’ime ha nọ n’ọgbakọ ahụ dị na Rom, n’osisi oliv ihe atụ a. Ha si otú a soro ná mkpụrụ Ebreham. Ha dịbu ka alaka osisi oliv ọhịa, ha enwebughị olileanya iso n’ọgbụgba ndụ a pụrụ iche. Ma, Jehova mere ka ha nwee ike ịghọ ndị Juu ime mmụọ.—Rom 2:28, 29.
(Ndị Rom 11:25, 26) N’ihi na achọghị m ka unu ghara ịma banyere ihe nzuzo a dị nsọ, ụmụnna m, ka unu wee ghara ịbụ ndị nwere uche n’anya onwe ha: na ụfọdụ ndị Izrel ghọrọ ndị ihe na-adịkwaghị emetụ n’obi ruo mgbe ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke ndị mba ọzọ batara, 26 otú a ka a ga-esikwa zọpụta Izrel dum. Dị nnọọ ka e dere, sị: “Onye nnapụta ga-esi na Zayọn pụta wee mee ka ụmụ Jekọb kwụsị ime omume asọpụrụghị Chineke.
‘Lee Otú Amamihe Nke Chineke Si Dị Omimi!’
19 N’eziokwu, Jehova na-emezu nzube ya banyere “Izrel nke Chineke” n’ụzọ magburu onwe ya. (Gal. 6:16) Dị ka Pọl kwuru, ‘a ga-azọpụta Izrel dum.’ (Rom 11:26) Mgbe oge Jehova kara aka ruru, “Izrel dum,” ya bụ, ndị niile so n’Izrel nke Chineke, ga-aghọ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. O nweghị ihe ga-eme ka nzube Jehova ghara imezu!
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Ndị Rom 9:21-23) Gịnị? Ọkpụite ó nweghị ikike n’ebe ụrọ dị, isi n’otu ụrọ ọ gwakọtara kpụọ otu arịa ka e jiri ya mee ihe kwesịrị nsọpụrụ, kpụọkwa nke ọzọ ka e jiri ya mee ihe na-ekwesịghị nsọpụrụ? 22 Ọ bụrụ na Chineke ji ogologo ntachi obi dị ukwuu hapụ arịa ndị dịịrị ọnụma, bụ́ ndị a ga-ebibi ebibi, ọ bụ ezie na o nwere ọchịchọ igosi ọnụma ya na ime ka a mara ike ya, 23 ka o wee mee ka a mara ebube ya dị ukwuu n’ebe arịa ndị dịịrị ebere dị, bụ́ ndị ọ kwadebere maka ebube tupu oge eruo,
Kwe Ka Aka Ná Ntị Jehova Na-adọ Gị Kpụzie Gị
5 Ọ́ bụrụkwanụ na mmadụ agbaa isi akwara jụ ka Chineke kpụzie ya? Gịnịzi ka Chineke ga-eme onye ahụ? Chegodị ihe ọkpụite na-eme ma ọ bụrụ na ọ gaghị ejili ụrọ kpụọ ihe ọ chọrọ ịkpụ. O nwere ike iji ụrọ ahụ kpụta ụdị arịa ọzọ ma ọ bụkwanụ tụfuo ya. Ọ bụ ọkpụite ka a na-ata ụta ma ọ bụrụ na ihe ọ kpụrụ adịghị mma. Ma, Jehova na-akpụzi onye ọ bụla kwere ka ọ kpụzie ya. (Diut. 32:4) Ọ bụrụ na mmadụ ekweghị ka Jehova kpụzie ya, ọ bụ onye ahụ ka a ga-ata ụta. Jehova na-akpụzi onye kwere ka ọ kpụzie ya, onye na-ekweghị, ya ahapụ ya. Jehova na-eji ndị na-erubere ya isi eme ihe bara uru. Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ “arịa ndị dịịrị ebere.” Chineke akpụziela ha ka ha bụrụ ‘arịa ndị e ji eme ihe kwesịrị nsọpụrụ.’ Ma, ndị na-ekweghị erubere Chineke isi bụ “arịa ndị dịịrị ọnụma, bụ́ ndị a ga-ebibi ebibi.”—Rom 9:19-23.
(Ndị Rom 10:2) N’ihi na ana m agbara ha akaebe na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị;
it-1 1260 ¶2
Ịnụ Ọkụ n’Obi
Ịnụ ọkụ n’obi n’ezighị ezi. Mmadụ nwere ike ịna-anụ ọkụ n’obi n’ihe ọ na-eme, ma ya abụrụ na ihe ahụ ezighị ezi ma ọ bụkwanụ na Chineke anabataghị ya. Ụdị ihe a mere ọtụtụ ndị Juu n’oge ndịozi. Ha chere na ihe ga-eme ka ha bụrụ ndị ezi omume bụ ịgbalịsi ike na-edebe Iwu Mozis. Ma, Pọl mere ka ha ghọta na ịnụ ọkụ n’obi ha ezighị ezi n’ihi enweghị amamihe zuru ezu banyere Chineke. N’ihi ya, n’anya Chineke ha abụghị ndị ezi omume. Ha kwesịrị ibu ụzọ ghọta na ha bụ ndị mmehie ma si n’aka Kraịst laghachikwuru Chineke, ka ọ gụọ ha ná ndị ezi omume, ha enwerekwa onwe ha ma ghara ịbụ ndị ikpe mara n’ihi Iwu ahụ. (Rom 10:1-10) Sọl onye Tasọs, mekwara ụdị ihe a, o ji ịnụ ọkụ n’obi gabigara oké na-ekpe okpukpe ndị Juu nke mere o ji “na-akpagbu ọgbakọ Chineke ma na-agbalị ibibi ya.” O ji obi ya niile na-edebe Iwu ahụ iji bụrụ “onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.” (Gal. 1:13, 14; Fil. 3:6) Ma ịnụ ọkụ n’obi Pọl nwere maka okpukpe ndị Juu bụ nke na-ezighị ezi. O ji obi ya niile mee ihe ndị o mere. Ọ bụ ya mere Jehova ji si n’aka Kraịst meere ya ebere, mee ka ọ bata n’ezi ofufe.—1 Tim. 1:12, 13.