Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
MACH 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ ROM 12-14
“Otú Ndị Kraịst Si Egosi Ịhụnanya”
it-1 55
Ọmịiko
Ndị Kraịst kwesịrị inwe ịhụnanya (na Grik, phi·la·del·phiʹa, nke pụtara, “ịhụnanya nwanne”) maka Ndị Kraịst ibe ha niile. (Rom 12:10; Hib. 13:1; gụọkwa 1 Pita 3:8.) Ha kwesịrị ịdị ná mma, na-emekọ ihe ọnụ ma dịrị n’otu ka ụmụnne si n’otu ezinụlọ. Ọ bụ eziokwu na Ndị Kraịst hụrụ ibe ha n’anya, ma a na-agba ha ụme ka ha hụ ibe ha n’anya n’ụzọ zuru ezu.—1 Tesa. 4:9, 10.
A na-ejikarị okwu Grik bụ́ phi·loʹstor·gos, nke pụtara “inwe ọmịiko,” akọwa mmadụ na ibe ya ịdị n’ezigbo mma. A na-ejikarị otu n’ime okwu ndị e si na ha nweta phi·loʹstor·gos bụ́ sterʹgo, akọwa ụdị ọmịiko ndị si n’otu n’ezinụlọ na-enwere ibe ha. Pọl gbara Ndị Kraịst ume ka ha nwee ụdị ọmịiko a. (Rom 12:10) Pọl kwukwara na n’oge ikpeazụ, ọtụtụ ndị ga-abụ ndị “na-enweghị obi mmadụ,” (na Grik, aʹstor·goi) kwuokwa na ụdị ndị a kwesịrị ọnwụ.—2 Tim. 3:3; Rom 1:31, 32.
MACH 11-17
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ ROM 15-16
“Na-arịo Jehova Maka Ntachi Obi na Nkasi Obi”
w89 12/1 24 ¶3
‘Nwapụta nke Izi Ezi Ịhụnanya Unu’
N’ezie, e kwesịrị ịkpaliworị ụmụnna ha bụ ndị Jentaịl ịgbatara ha ọsọ enyemaka. E kwuwerị, ha ji ndị Kraịst ahụ nọ na Jeruselem “ụgwọ” pụrụ iche. Ọ́ bụghị na Jeruselem ka ozi ọma ahụ si gbasaa rute ndị Jentaịl? Pọl kwuru, si: “Ọ bụrụ na ndị Juu bụ́ ndị Kraịst sooro ndị Jentaịl kerịta ihe onwunwe ime mmụọ ha, ọ bụ ibu ọrụ pụtara ìhè nke dịkwasịrị ndị Jentaịl ịtụnye ụtụ maka mkpa ihe onwunwe ha nwere.”— Ndị Rom 15:27, The New English Bible.
it-1 858 ¶5
Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu
Ọ bụ Mesaya ahụ ma ọ bụ Kraịst bụ mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa nke a ga-esi n’aka ya gọzie ndị ezi omume niile n’ụwa. (Gal. 3:8, 14) Mgbe mbụ e kwuru banyere “mkpụrụ” ahụ bụ mgbe e nupụchaara Chineke isi n’Iden, ya bụ, tupu a mụọ Ebel. (Jen. 3:15) Ihe a mere ihe dị ka puku afọ anọ gara aga tupu e kpughee “ihe nzuzo ahụ dị nsọ” nke mere ka a mata na ọ bụ Mesaya bụ “mkpụrụ” ahụ. N’eziokwu, e zoro ya “site na mgbe gara aga a na-amaghị ama.”—Rom 16:25-27; Efe. 1:8-10; 3:4-11.
MACH 18-24
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ KỌRỊNT 1-3
“Ị̀ Bụ Onye Anụ Ahụ́ Na-achị Ka Ọ̀ Bụ Onye Mmụọ Nsọ Na-achị?”
it-2 1193 ¶1
Amamihe
Ụwa a e weere ka ndị ma ihe jụrụ onyinye Chineke si n’aka Kraịst nye anyị, sị na ọ bụ ihe nzuzu. Ndị ọchịchị ya e weere ka ndị ma nke a na-akọ na ndị nwere ike ime mkpebi dị mma ‘kpọgidekwara Onyenwe anyị dị ebube n’osisi.’ (1 Kọr. 1:18; 2:7, 8) Ma ugbu a, Chineke na-eme ka a mata na ndị nwere amamihe n’ụwa a bụ ndị nzuzu, na-emenyekwa ha ihere. O ji ihe ndị ahụ ha weere ka “ihe nzuzu nke Chineke” na ụmụ mmadụ ndị ha weere ka ndị nzuzu, ndị na-adịghị ike, na ndị e lelịrị anya, na-emezu nzube ya dị ebube. (1 Kọr. 1:19-28) Pọl chetaara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt na “amamihe nke usoro ihe a [na] nke ndị na-achị usoro ihe a,” ga-ala n’iyi. Ọ bụ ya mere Pọl akụzighị gbasara ya n’ozi ọma ya. (1 Kọr. 2:6, 13) Ọ dọrọ Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi aka ná ntị ka ha ghara ikwe ka e jiri “nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị,” mata ha n’ọnyà.—Kọl. 2:8; tuleekwa amaokwu nke 20-23.
MACH 25-31
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ KỌRỊNT 4-6
“Ntakịrị Ihe Iko Achịcha Na-eme Ka Ntụ Ọka Dum A Gwakọtara Agwakọta Koo Eko”
it-2 230
Ihe Iko Achịcha
Pọl onyeozi ji otu ihe a mee ihe atụ mgbe ọ gwara ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Kọrịnt ka ha chụpụ otu nwoke na-akwa iko n’ọgbakọ ha. Ọ gwara ha, sị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ntakịrị ihe iko achịcha na-eme ka ntụ ọka dum a gwakọtara agwakọta koo eko? Wepụnụ ihe iko achịcha ochie ahụ, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta, dị ka unu bụ ihe na-ekoghị eko. N’ihi na, n’ezie, a chụwo nwa atụrụ ememme ngabiga anyị n’àjà, ya bụ, Kraịst.” O mechara kọwaa ihe ọ kpọrọ “ihe iko achịcha.” Ọ sịrị: “N’ihi ya, ka anyị na-eme ememme ahụ, n’ejighị ihe iko achịcha ochie, n’ejighịkwa ihe iko achịcha bụ́ ihe ọjọọ na ajọ omume, kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko bụ́ izi ezi na eziokwu na-eme ya.” (1 Kọr. 5:6-8) N’ebe a, Pọl ji achịcha ndị Juu ji eme Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko, bụ́ nke ha na-eme ozugbo ha mechara Ememme Ngabiga, gosi ihe nwere ike ime n’ọgbakọ Kraịst. Otú ahụ ihe na-eko achịcha si eme ka ntụ ọka koo, ka ọgbakọ niile ga-esi ghara ịdị ọcha n’anya Jehova ma ọ bụrụ na a chụpụghị nwoke ahụ nọ na-akpa àgwà ọjọọ nwere ike imebi ndị nọ n’ọgbakọ. Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt kwesịrị iwepụ “ihe na-eko achịcha” ahụ ozugbo n’etiti ha, otú ahụ ndị Izrel si eme ka ihe iko achịcha ọ bụla ghara ịdị n’ụlọ ha n’oge ememme ahụ.
it-2 869-870
Setan
Gịnị ka ‘inyefe mmadụ n’aka Setan, ka e bibie mmetụta anụ ahụ́ na-enwe,’ pụtara?
Mgbe Pọl na-agwa ọgbakọ dị na Kọrịnt ihe ha ga-eme gbasara otu nwoke siri ọnwụ na-edina nwunye nna ya, o kwuru, sị: “nyefee nwoke dị otú ahụ n’aka Setan ka e bibie mmetụta anụ ahụ́ na-enwe.” (1 Kọr. 5:5) Ihe a Pọl kwuru gosiri na ha kwesịrị ịchụpụ nwoke ahụ n’ọgbakọ ha, ka ha na ya kwụsị imekọ ihe ọ bụla. (1 Kọr. 5:13) Inyefe ya n’aka Setan ga-eme ka o si n’ọgbakọ pụọ banyezie n’ụwa Setan bụ chi ya na onye na-achị ya. Dị ka “ihe iko achịcha” dị n’ime “ntụ oka,” nwoke a bụ “anụ ahụ́,” ma ọ bụ onye na-eme ihe anụ ahụ́ chọrọ, n’ọgbakọ ahụ. Ọ bụrụ na ọgbakọ ahụ ewepụ nwoke ahụ na-edina nwunye nna ya, ọgbakọ ahụ ji ofufe Chineke kpọrọ ihe emeriela “anụ ahụ́” ahụ nọ n’etiti ha. (1 Kọr 5:6, 7) Otu ihe ahụ ka Pọl mere mgbe o nyefere Haịmeniọs na Alegzanda n’aka Setan n’ihi na ha ejighị okwukwe ha na akọnuche dị mma kpọrọ ihe. Ọ bụ ya mere okwukwe ha ji nyụọ ka ọkụ.—1 Tim. 1:20.
it-2 211
Iwu
Iwu E Nyere Ndị Mmụọ Ozi. Ndị mmụọ ozi ka ụmụ mmadụ, ma ha na-erubere iwu Chineke isi. (Hib. 1:7, 14; Ọma 104:4) O nwedịrị mgbe Jehova machiri onye iro ya bụ́ Setan ime ihe ụfọdụ. (Job 1:12; 2:6) Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi ma na ọ bụ Jehova bụ Onyeikpe Kacha Elu. Ọ bụ ya mere mgbe ya na Setan sere okwu, ọ gwara ya, sị: “Ka Jehova baara gị mba.” (Jud 9; tụlee Zek. 3:2) Jehova Chineke mere ka ndị mmụọ ozi niile nọrọ n’okpuru Jizọs Kraịst. (Hib. 1:6; 1 Pita 3:22; Mat. 13:41; 25:31; Fil. 2:9-11) Ọ bụ ya mere Jizọs ji dunye otu mmụọ ozi ka ọ gaa zie Jọn ozi. (Mkpu. 1:1) Ma ná 1 Ndị Kọrịnt 6:3 Pọl kwuru na ụmụnna Kraịst ga-eso kpee ndị mmụọ ozi ikpe. O nwere ike ịbụ maka na ha ga-eso Kraịst buo agha mgbe a ga-ebibi ndị mmụọ ọjọọ.