OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ị Ga-emerili n’Agbanyeghị ‘Ogwu Dị Gị n’Anụ Ahụ́’
N’oge ikpeazụ a tara akpụ, ọtụtụ nsogbu ndị na-adụ adụ ka ogwu na-akpa ndị ohu Chineke aka ọjọọ. (2 Tim. 3:1) Olee otú anyị ga-esi tụkwasị Jehova obi ma die nsogbu ndị a? Leenụ vidio bụ́ “A Ga-emeghe Anya Ndị Ìsì” ka unu chọpụta ihe Talita Alnashi na ndị mụrụ ya mere. Zaakwanụ ajụjụ ndị a:
Olee ihe bụụrụ Talita “ogwu n’anụ ahụ́”?
Olee nkwa ndị dị na Baịbụl nyeere Talita na ndị mụrụ ya aka ịnọgide na-enwe olileanya?
Olee otú ndị mụrụ Talita si gosi na ha tụkwasịrị Jehova obi mgbe a wachara nwa ha anya?
Olee otú ndị mụrụ Talita si jiri ihe ndị nzukọ Jehova wepụtara nyere ya aka ịhụ Chineke n’anya?
Olee otú Talita si na-emekwu nke ọma n’ofufe Jehova n’agbanyeghị ‘ogwu dị ya n’anụ ahụ́’?
Olee otú akụkọ Talita si gbaa gị ume?