OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Omume Dị Ọcha na Nkwanye Ùgwù Dị Ukwuu Na-eme Ka E Rite Mmadụ n’Uru
Àgwà ọma ụmụ nwaanyị ndị ghọrọ Ndị Kraịst mgbe ha lụchara di na-emekarị ka di ha bata n’ọgbakọ. Ma, o nwere ike ịdị mkpa ka ha die ihe isi ike ruo ọtụtụ afọ. (1 Pita 2:21-23; 3:1, 2) Ọ bụrụ na di gị na-emekpọ gị ọnụ, nọgide na-eji ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ. (Rom 12:21) Àgwà ọma gị nwere ike ime ka ihe ka mma karịadị okwu ọnụ gị.
Na-ewere ya na ọ bụ gịnwa nọ n’ọnọdụ di gị. (Fil. 2:3, 4) Gosi ya na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi, na-agbakwa mbọ na-arụ ọrụ gị nke ọma dị ka nwunye ma na-akwanyere ya ùgwù. Ya kwuwe okwu, na-ege ya ntị nke ọma. (Jems 1:19) Na-enwere ya ndidi, meekwa ka obi sie ya ike na ị hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụgodị na yanwa anaghị akwanyere gị ùgwù ma na-egosi na ọ hụrụ gị n’anya otú ahụ gịnwa si eme, ka obi sie gị ike na Jehova ji mbọ ị na-agba kpọrọ ihe.—1 Pita 2:19, 20.
LEENỤ VIDIO BỤ́ JEHOVA NA-ENYE ANYỊ IKE IBU IBU ANYỊ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:
Olee otú ihe si dịrị Grace Li mgbe ọ lụrụ di ọhụrụ?
Olee ihe mere o ji nwewe mmasị ịmụ Baịbụl?
Olee nsogbu o diri mgbe o mechara baptizim?
Olee ihe Nwanna Nwaanyị Li rịọrọ Jehova n’ekpere banyere di ya?
Olee ngọzi ndị Nwanna Nwaanyị Li nwetarala n’ihi omume ya dị ọcha na otú o si akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu?
Omume dị ọcha na nkwanye ùgwù dị ukwuu na-akpa ike