AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 38-39
O Nweghị Mgbe Jehova Hapụrụ Josef
N’oge niile Josef nọ na-ata ahụhụ, Jehova mere ka “ihe niile ọ na-eme na-aga nke ọma,” meekwa ka “ihe ya na-amasị onyeisi na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ.” (Jen. 39:2, 3, 21-23) Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ a?
Nsogbu bịara anyị, ọ pụtaghị na Jehova ajụla anyị.—Ọma 34:19
Anyị kwesịrị ileru anya ala chọpụta otú Jehova si na-agọzi anyị ma na-ekele ya.—Fil. 4:6, 7
Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga na-elekọta anyị.—Ọma 55:22