AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 40-41
Jehova Napụtara Josef
Josef ghọrọ ohu na onye mkpọrọ ruo ihe dị ka afọ iri na atọ tupu Jehova anapụta ya. Ma, o kweghị ka iwe ju ya obi n’oge ahụ ọ na-ata ahụhụ. Kama nke ahụ, o si n’ihe ndị ahụ mere ya mụta ọtụtụ ihe. (Ọma 105:17-19) Ọ ma na Jehova agbahapụghị ya. Olee otú Josef si nọgide na-eme ihe ọma ndị ọ ga-emeli n’oge ahụ ọ na-ata ahụhụ?
Ọ rụsiri ọrụ ike ma kwụwa aka ya ọtọ. Nke a mere ka Jehova gọzie ya.—Jen. 39:21, 22
O nyeere ndị ọzọ aka kama ịchọwa otú ọ ga-esi megwara ndị na-emegbu ya.—Jen. 40:5-7
Olee otú akụkọ Josef ga-esi nyere m aka idi nsogbu m?
Olee otú m ga-esi na-eme ihe ọma ọ bụla m ga-emeli n’agbanyeghị nsogbu m ruo mgbe Jehova ga-anapụta m n’Amagedọn?