MACH 18-24
ABỤ ỌMA 19-21
Abụ nke 6 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. “Eluigwe Na-akọsa Ebube Chineke”
(Nkeji 10)
Ihe ndị Jehova kere na-akọsa ebube ya (Ọma 19:1; w04 1/1 8 ¶1-2)
Anyanwụ so n’ihe ndị dị ịtụnanya Chineke kere (Ọma 19:4-6; w04 6/1 11 ¶8-10)
Anyị kwesịrị isi n’ihe ndị Chineke kere mụta ihe (Mat. 6:28; km 3/12 7 ¶2)
IHE UNU NWERE IKE IJI EME OFUFE EZINỤLỌ: Leenụ ihe Jehova kere, unu ekwurịtazie ihe ọ na-akụziri anyị gbasara Jehova.
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ọma 19:7, 11—Olee uru dị iche iche iwu Jehova ga-abara anyị? (w22.3 4 ¶10)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ọma 19:1-14 (th ihe ọmụmụ nke 11)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Nye mmadụ akwụkwọ anyị ji akpọ ndị mmadụ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Jirikwa jw.org chọtara ya ebe dị ya nso a ga-anọ eme ya. (lmd isi nke 2 nọmba nke 3)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Nabata onye bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs maka na ọ hụrụ akwụkwọ ịkpọ òkù n’ọnụ ụzọ ya. Mee ndokwa ịza ya ajụjụ ndị o nwere. (lmd isi nke 3 nọmba nke 4)
6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 5) Okwu. ijwfq 45—Isiokwu: Gịnị Mere Otú Ndịàmà Jehova Si Eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Ji Dị Iche n’Otú Chọọchị Ndị Ọzọ Si Eme Ya? (th ihe ọmụmụ nke 6)
Abụ nke 141
7. Si n’Ihe E Kere Eke Mụta Ihe Ga-eme Ka Okwukwe Gị Sie Ike
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye VIDIO. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Olee otú ihe dị iche iche e kere eke si eme ka okwukwe gị sie ike n’ebe Chineke nọ?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 7 ¶16-23