Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb24 Mach p. 9-16
  • Eprel 1-⁠7

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eprel 1-⁠7
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
mwb24 Mach p. 9-16

EPREL 1-7

ABỤ ỌMA 23-25

Abụ nke 4 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. “Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”

(Nkeji 10)

Jehova na-edu anyị (Ọma 23:1-3; w11 5/1 31 ¶3)

Jehova na-echebe anyị (Ọma 23:4; w11 5/1 31 ¶4)

Jehova na-enye anyị nri (Ọma 23:5; w11 5/1 31 ¶5)

Ebe onye ọzụzụ atụrụ ku nwa atụrụ ma na-elebara ya anya.

Jehova na-elekọta ndị na-efe ya otú ahụ onye ọzụzụ atụrụ hụrụ atụrụ ya n’anya si elekọta ha.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee otú Jehova sirila lekọta mụnwa?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 23:3​—Olee ihe bụ́ ‘ụzọ ziri ezi,’ oleekwa ihe ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịhapụ ya? (w11 2/15 24 ¶1-3)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ọma 23:1–24:10 (th ihe ọmụmụ nke 5)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gụọrọ otu onye gwara gị na otú e si emebisị ụwa anyị a na-ewute ya otu amaokwu Baịbụl ga-agba ya ume. (lmd isi nke 2 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gosi onye natara broshọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi otú anyị na ndị mmadụ si eji ya amụ Baịbụl. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) lff isi nke 14 nọmba nke 4 (lmd isi nke 11 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 54

7. Anyị Anaghị Ege Ndị Anyị Na-amaghị Olu Ha Ntị

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ebe onye ọzụzụ atụrụ na onye atụrụ na-amaghị na-akpọ otu ìgwè atụrụ. Atụrụ ndị ahụ gere onye na-azụ ha ntị ma soro ya.

Atụrụ nkịtị na-amata olu onye na-azụ ya, na-esokwa ya. Ma, ha na-agbara onye ha na-amaghị ọsọ maka na ha amaghị olu ya. (Jọn 10:5) Anyị na-ege ntị n’olu Jehova na Jizọs bụ́ ndị anyị tụkwasịrị obi, ndị hụkwara anyị n’anya ma na-azụ anyị ka atụrụ. (Ọma 23:1; Jọn 10:11) Ma anyị anaghị ege ndị anyị na-amaghị olu ha ntị, bụ́ ndị na-eji “ụgha” agbalị ime ka okwukwe anyị gharazie isi ike.​—2 Pita 2:1, 3.

Jenesis isi nke atọ mere ka anyị mata oge mbụ a nụrụ olu onye a na-amaghị onye ọ bụ n’ụwa. Setan ji aghụghọ gakwuru Iv otú Iv na-agaghị amata onye ọ bụ n’eziokwu. O mere ka à ga-asị na ọ hụrụ Iv n’anya, ya arọgharịa ihe Jehova kwuru, kwuokwa na Jehova eburughị Iv ihe ọma n’obi. Ọ dị mwute na Iv gere ya ntị, kpataziere ya na ezinụlọ ya nnukwute nsogbu.

Taa, Setan na-agbalị ime ka anyị nwewe obi abụọ gbasara Jehova na nzukọ ya. Otú o si eme ya bụ ịkọsa akụkọ ndị na-adịghị mma, akụkọ ndị e tinyere nnu na ose, na akụkọ ndị bụ́ okpookpo ụgha. Anyị nụ olu onye anyị na-amaghị, anyị kwesịrị iri mbọmbọ. Ige onye ahụ ntị, ọ bụrụgodị obere oge, maka na anyị chọrọ ịnụ ihe ọ ga-ekwu, nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. Okwu ole ka Setan kwuru tupu ya eduhie Iv mgbe ha nọ na-akparịta ụka? (Jen. 3:1, 4, 5) Ma, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na onye hụrụ anyị n’anya anyị ma ama eburu ihe ọma n’obi na-achọ ịkọrọ anyị ihe na-adịghị mma gbasara nzukọ Jehova?

Kpọnye VIDIO bụ́ Ka Anyị Ghara Ige ‘Ndị Anyị Na-amaghị Olu Ha’ Ntị. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

Gịnị ka ị mụtara n’ihe Joy mere mgbe mama ya chọrọ igosi ya akụkọ ndị na-adịghị mma gbasara nzukọ Jehova?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr nkebi nke 3, isi nke 8 ¶1-7 na vidio kọwara isiokwu a na-amụ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 55 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya