EPREL 8-14
ABỤ ỌMA 26-28
Abụ nke 34 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Ihe Devid Mere Ka O Nwee Ike Ijidesi Jehova Aka Ike
(Nkeji 10)
Devid rịọrọ Jehova ka ọ nụchaa ya (Ọma 26:1, 2; w04 12/1 14 ¶8-9)
Devid zeere mkpakọrịta ọjọọ (Ọma 26:4, 5; w04 12/1 15 ¶12-13)
Devid ji ofufe Jehova kpọrọ ihe (Ọma 26:8; w04 12/1 16 ¶17-18)
Ọ bụ eziokwu na e nwere oge ndị Devid mejọrọ ihe, ma o ji ‘obi ya niile jeere Jehova ozi.’ (1 Eze 9:4) Otú a Devid si hụ Jehova n’anya ma jiri obi ya niile jeere ya ozi gosiri na o jidesiri Jehova aka ike.
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ọma 27:10—Olee otú amaokwu a ga-esi akasi anyị obi ma ọ dị anyị ka ezigbo ndị enyi anyị hà ahapụla anyị? (w06 7/15 28 ¶15)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ọma 27:1-14 (th ihe ọmụmụ nke 2)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Jiri otu traktị so n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe zie ya ozi ọma. (th ihe ọmụmụ nke 3)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gị na ya kwurịta ajụjụ dị n’azụ traktị i nyere ya mgbe mbụ ị bịara na nke ya. Gosi ya jw.org, meekwa ka ọ hụ otu n’ime ihe ndị o nwere ike ịchọta na ya. (lmd isi nke 9 nọmba nke 3)
6. Okwu
(Nkeji 5) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 3—Isiokwu: A Gaghịzi Na-emetọ Ikuku na Mmiri. Ụwa Ga-abụzi Paradaịs. (th ihe ọmụmụ nke 13)
Abụ nke 128
7. Ndị Na-eto Eto Na-anaghị Ebi Ndụ Rụrụ Arụ
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ndị Kraịst na-eto eto kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ha ghara ịna-ebi ndụ rụrụ arụ. Ha ga na-agba mbọ ka anụ ahụ́ ha na-ezughị okè nakwa afọ ndụ ha nọ na ya, bụ́ mgbe agụụ mmekọahụ na-eme ka o siere ha ike ime ihe ziri ezi, ghara ime ka ha mee omume rụrụ arụ. (Rom 7:21; 1 Kọr. 7:36) Ha ga na-agbakwa mbọ ka ha merie nsogbu ndị ọzọ na-enye ha mgbe niile ka ha kwaa iko, ma ịkwa iko nke nwoke na nwoke ma nke nwaanyị na nwaanyị. (Efe. 2:2) Anyị ji ndị na-eto eto nọgidere na-erubere Jehova isi eme ọnụ.
Kpọnye VIDIO bụ́ Ihe Mere Mgbe M Na-eto Eto—Olee Otú M Ga-esi Merie Ndị Na-anwa M Ka M Kwaa Iko? Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Olee nsogbu ndị ọgbọ Cory na Kamryn nọ na-enye ha?
Gịnị nyeere ha aka ijidesi Jehova aka ike?
Olee ihe ndị e kwuru na Baịbụl nwere ike inyere gị aka imeri ọnwụnwa ndị yiri nke ha?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 8 ¶8-15, igbe 8A