Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb24 Julaị p. 10-16
  • Ọgọst 5-11

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọgọst 5-11
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
mwb24 Julaị p. 10-16

ỌGỌST 5-11

ABỤ ỌMA 70-72

Abụ nke 59 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. “Kọọrọ Ọgbọ Na-abịa Abịa” Banyere Ike Chineke

(Nkeji 10)

Jehova chebere Devid n’oge ọ bụ nwata (Ọma 71:5; w99 9/1 18 ¶17)

Jehova kwadoro Devid mgbe o mere agadi (Ọma 71:9; g04 10/8 23 ¶3)

Devid kọọrọ ndị na-eto eto akụkọ ndụ ya, si otú ahụ gbaa ha ume (Ọma 71:17, 18; w14 1/15 23 ¶4-5)

Ihe a bụ ezinụlọ ahụ e gosiri n’izu bú nke a ụzọ n’isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Ga-eme Ka Ofufe Ezinụlọ Na-aga Nke Ọma.” Ha kpọrọ otu di na nwunye merela agadi ka ha bịa soro ha nwee ofufe ezinụlọ. Ha ji obi ụtọ na-ege ntị nke ọma mgbe di na nwunye ahụ na-egosi ha foto ma na-akọrọ ha akụkọ ndụ ha.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee nwanna nọterela aka n’ọgbakọ m ga-achọ ịgba ajụjụ ọnụ n’oge Ofufe Ezinụlọ anyị?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 72:8​—Olee otú nkwa Jehova kwere Ebreham na Jenesis 15:18 si mezuo n’oge Eze Solomọn na-achị? (it-1 768)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ọma 71:1-24 (th ihe ọmụmụ nke 5)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Ọ bụrụ na onye ahụ amalite ịrụ ụka, jiri obiọma kwụsị mkparịta ụka gị na ya. (lmd isi nke 4 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kwuo ihe ga-eme ka gị na onye ikwu gị na-ekwetabeghị ka a mụwara ya Baịbụl kwutọpụ okwu unu malitere n’oge gara aga. (lmd isi nke 8 nọmba nke 4)

6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 5) Okwu. ijwfq 49—Isiokwu: Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Gbanwee Ihe Ụfọdụ Ha Kweere? (th ihe ọmụmụ nke 17)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 76

7. Ihe Ndị Unu Nwere Ike Iji Eme Ofufe Ezinụlọ

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ebe ezinụlọ ahụ e gosiburu kwụ ọtọ na-amụ abụ Alaeze.
Ebe ezinụlọ ahụ na-ekiri ihe omume tiivi anyị.
Ebe otu n’ime ụmụ ha ndị nwaanyị na-aza ajụjụ mama ya jụrụ ya mgbe ha na-amụgharị ihe ọ ga-ekwu n’oge Ofufe Ezinụlọ ha.

Oge Ofufe Ezinụlọ bụ oge dị mkpa ụmụaka ga-eji mụta ịna-eme ihe “otú Jehova chọrọ.” (Efe. 6:4) Ịmụ ihe anaghị adị mfe, ma ọ na-atọ ụtọ. Ọ na-akacha atọ ụmụaka ụtọ ma ịmụtakwu eziokwu Baịbụl bido ịgụ ha agụụ. (Jọn 6:27; 1 Pita 2:2) Kwuo isi ihe dị n’igbe bụ́ “Ihe Ndị E Nwere Ike Iji Eme Ofufe Ezinụlọ.” Ọ ga-enyere ndị nne na nna aka ime ka Ofufe Ezinụlọ ha na-aba uru ma na-atọ ụtọ. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee nke ị ga-achọ ime n’ime aro ndị a a tụrụ?

  • Ò nwere ihe ọzọ ị chọpụtarala na-aba ezigbo uru ma e jiri ya mee ofufe ezinụlọ?

IHE NDỊ E NWERE IKE IJI EME OFUFE EZINỤLỌ

BAỊBỤL:

  • Geenụ ọgụgụ Baịbụl dịịrị izu nke a na-egere egere ma ọ bụkwanụ unu ekenye onye nke ọ bụla amaokwu ndị ọ ga-agụpụta. Otu onye gụchaa, ibe ya agụọ. Ọ bụrụ na e nwere ndị dị iche iche kwuru okwu n’ebe unu na-agụ, onye nke ọ bụla nwere ike inwe onye ọ ga na-agụpụta ihe o kwuru

  • Si n’ihe e kwuru n’ọgụgụ Baịbụl dịịrị izu kwadebe ajụjụ ụfọdụ. Gwa onye nke ọ bụla ka ọ họrọ otu ajụjụ ma meere ya nchọnchọ. Onye ọ bụla nweziri ike ikwu ihe ndị o metara na nchọnchọ

  • Jụọ otu ajụjụ ma ọ bụ kwuo otu nsogbu nwere ike ịbịa. Gwazie onye nke ọ bụla ka o jiri akwụkwọ bụ́ Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova mee nchọnchọ ma chọpụta ihe Baịbụl kwuru banyere ya

  • Jirinụ akụkọ a kọrọ na Baịbụl mee ihe nkiri

  • N’izu ọ bụla, deenụ otu amaokwu Baịbụl n’ihu otu mpempe akwụkwọ. Dezienụ ihe amaokwu ahụ kwuru n’azụ mpempe akwụkwọ ahụ. Unu nwere ike inweta amaokwu ndị unu ga-ede ma unu gaa n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A, nke dị na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs. Gbalịzienụ bute amaokwu ahụ n’isi. Leekwanụ mpempe akwụkwọ ndị unu dere n’izu ndị gara aga ka unu mara ma ùnu ga-echetali ihe amaokwu ndị dị na ha kwuru

  • Mụọnụ otu ebe n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi

  • Gwa ndị ezinụlọ unu ka ha chọta isiokwu ha ga-eji kwuo okwu n’ebe a kpọrọ “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara” ma ọ bụkwanụ n’ebe a kpọrọ “Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara,” nke dị n’ebe a kpọrọ IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI na jw.org

ỌMỤMỤ IHE:

  • Kwadebenụ ihe ụfọdụ a ga-amụ n’ọmụmụ ihe

  • Kwadebenụ ma mụgharịanụ azịza ndị unu ga-aza. Na-elenụ anya n’oge mgbe onye ọ bụla na-aza nke ya

  • Mụọnụ abụ Alaeze

  • Kwadebenụ ma mụgharịanụ ihe na-agba ume unu ga-agwa mmadụ tupu ọmụmụ ihe ọzọ unu ga-aga ebido ma ọ bụkwanụ mgbe a gbasara

  • Ka onye e kenyere ihe omume nwa akwụkwọ mụgharịa ya n’ihu mmadụ niile nọ n’ezinụlọ

OZI ỌMA:

  • Kwadebenụ maka ozi ụlọ n’ụlọ

  • Kwadebenụ maka nletaghachi

  • Kwuonụ oge unu nwere ike izi mmadụ ozi ọma mgbe unu na-anọghị n’ozi, unu amụgharịzie otú unu ga-esi jiri obiọma bido ịkpanyere onye ahụ ụka

  • Kwurịtanụ ihe ndị unu ga-achọ ime iji jekwuo ozi n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, n’oge ndị ọrụ ji ezurutụ ike, ma ọ bụ n’oge e mechiri akwụkwọ

MKPA NDỊ UNU NWERE N’EZINỤLỌ UNU:

  • Mụgharịanụ ihe unu ga-eme n’ihi otu ihe merenụ ma ọ bụkwanụ nke nwere ike ime. O nwere ike ịbụ ihe gbasara ịdị iche n’ụwa, mmadụ ịchọ anyị okwu, nwoke na nwaanyị ịkpa, ma ọ bụkwanụ ime ememme ụfọdụ

  • Meenụ ihe ngosi ebe ụmụaka ga-eme ka hà bụ ndị nne na nna, nne na nna emee ka hà bụ ụmụ ha. Ụmụaka ga-eme nchọnchọ n’otu isiokwu ma nyere nne na nna ha aka ịghọta ihe isiokwu ahụ na-ekwu

IHE NDỊ ỌZỌ UNU NWERE IKE IME:

  • Leenụ ihe omume tiivi anyị ma kwurịtanụ ihe unu mụtara na ya

  • Gụọnụ otu isiokwu ma ọ bụ kirienụ vidio si na jw.org, unu ekwurịtazie ihe unu mụtara na ya

  • Lebanụ anya n’otu ihe gbara n’ebe a kpọrọ “Ndị Na-eto Eto” ma ọ bụ “Ụmụaka” nke dị n’ebe a kpọrọ IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI na jw.org

  • Kwụrịtanụ ihe ndị unu deturu mgbe unu gara mgbakọ ukwu ma ọ bụ mgbakọ sekit

  • Kirienụ otu ihe e kere eke ma ọ bụ meenụ nchọnchọ gbasara ihe ahụ, unu ekwurịtazie ihe ọ na-akụziri anyị gbasara Jehova

  • Mgbe ụfọdụ, kpọọnụ onye ọzọ ka o soro unu n’ofufe ezinụlọ unu, unu agbaa ya ajụjụ ọnụ

  • Kwurịtanụ ihe ndị unu chọrọ imekwu n’ozi Jehova, kwuokwanụ otú unu ga-esi eme ha

  • Chọtanụ otu ihe unu ga-emekọ ọnụ, dị ka ịrụ otu ihe a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl, ise map ma ọ bụ chaatị

Kpọnye VIDIO bụ́ Na-eme Ka Ofufe Ezinụlọ Unu Na-akakwu Mma. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Olee otú di nwere ike isi mee ka ofufe ezinụlọ na-atọ nwunye ya ụtọ ma ọ bụrụ na ha enweghị ụmụaka n’ezinụlọ ha?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 13 ¶1-6, vidio kọwara isiokwu a na-amụ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 123 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya