Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb24 Septemba p. 5-16
  • Septemba 16-22

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Septemba 16-22
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
mwb24 Septemba p. 5-16

SEPTEMBA 16-22

ABỤ ỌMA 85-87

Abụ nke 41 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ebe Eze Devid ji obi ya niile na-ekpe ekpere.

1. Ekpere Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi

(Nkeji 10)

Rịọ Jehova ka o mee ka ị na-enwe ọṅụ (Ọma 86:4)

Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịna-erubere ya isi (Ọma 86:11, 12; w12 5/15 25 ¶10)

Ka obi sie gị ike na Jehova ga-aza ekpere gị (Ọma 86:6, 7; w23.05 13 ¶17-18)


JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Ọnwụnwa bịara m, m̀ na-ekpechikwu ekpere anya ma na-ekpete ya aka?’​—Ọma 86:3.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 86:11​—Gịnị ka ekpere Devid na-akụziri anyị banyere obi mmadụ? (it-1 1058 ¶5)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ọma 86:1–87:7 (th ihe ọmụmụ nke 12)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 3 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa onye sịburu gị na ihe ndị na-eme n’ụwa na-echu ya ụra ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 7 nọmba nke 4)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) lff isi nke 15 nọmba nke 5. Gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl kwurịta ndokwa i mere ka ọ mụọ ihe mgbe ị na-agaghị anọ ya n’izu ọzọ. (lmd isi nke 10 nọmba nke 4)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 83

7. Ike Agwụla Gị

(Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Kpọnye VIDIO. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee ihe ndị nwere ike ime mgbe ụfọdụ ka ike ịga ozi ọma chọwa ịgwụ anyị?

  • Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwe ka ike gwụ anyị?

8. Nọgide Na-agwa Ndị Mmadụ Ka Gị na Ha Mụwa Baịbụl

(Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ebe otu nwanna nwaanyị na-ezi otu nwaanyị ozi ọma n’ebe a na-abanye n’ụgbọala.
Ebe otu di na nwunye kwụ n’akụkụ ihe a na-akwagharị akwagharị nke ha ji na-akọsa banyere “Baịbụl Anyị Na-amụrụ Ndị Mmadụ n’Anaghị Ha Ego.” Otu nwaanyị nke na-agafe ebe ahụ lere anya n’ihe ahụ a na-akwagharị akwagharị.
Ebe otu di na nwunye gara ozi ọma ụlọ n’ụlọ. Ha na-enye otu nwoke broshọ “Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi.”

Ị̀ malitela iji broshọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’ọnwa a anyị na-eme mkpọsa pụrụ iche? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụrịrị na obi atọgbuola gị. Ọ ga-abụkwa na obi dị ndị ọzọ ụtọ. Ma, ọ bụrụ na e nwebeghị onye ị maliteere ọmụmụ Baịbụl, o nwere ike ịbụ na ị na-eche ma mbọ ị na-agba ọ̀ bakwadịrị uru? Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na obi na-ada gị mbà maka na e nwebeghị onye ị malitere ịmụrụ Baịbụl?

Kpọnye VIDIO bụ́ “Anyị Na-eme Ka A Mata na Anyị Bụ Ndị Ozi Chineke . . . Anyị Na-enwe Ndidi”​—Mgbe Anyị Nọ n’Ozi Ọma. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú 2 Ndị Kọrịnt 6:4, 6 ga-esi enyere anyị aka ma o yie ka ozi anyị anaghị aga nke ọma?

  • Olee mgbanwe ndị i nwere ike ime ma i chee na mbọ ndị ị na-agba ịmalite ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl enwebeghị isi?

Cheta na ihe na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ abụghị mmadụ ole anyị maliteere ọmụmụ Baịbụl ma ọ bụ mmadụ ole anyị na-amụrụ Baịbụl. Kama, ihe na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ bụ ịmara na mbọ anyị na-agba na-eme Jehova obi ụtọ. (Luk 10:17-20) N’ihi ya, akwụsịla iso na-eme mkpọsa a pụrụ iche ebe ị ma na ‘ọrụ Onyenwe anyị ị na-arụsi ike abụghị na nkịtị.’​—1 Kọr. 15:58.

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 14 ¶21-25, igbe 14A

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 39 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya