Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb24 Nọvemba p. 12-13
  • Disemba 23-29

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Disemba 23-29
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
mwb24 Nọvemba p. 12-13

DISEMBA 23-29

ABỤ ỌMA 119:121-176

Abụ nke 31 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Otú Anyị Ga-esi Ghara Ịna-akpatara Onwe Anyị Obi Mgbawa

(Nkeji 10)

Jiri iwu Chineke kpọrọ ihe (Ọma 119:127; w18.06 17 ¶5-6)

Kpọọ omume ọjọọ asị (Ọma 119:128; w93 4/15 17 ¶12)

Na-ege Jehova ntị, emejọkwala ihe otú “ndị na-amaghị ihe” na-eme (Ọma 119:130, 133; Ilu 22:3)

Baịbụl a saghere asaghe nke dị n’akụkụ mkpụrụ ego ọlaedo na ọkpụrụkpụ ọlaedo.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee ihe ndị m kwesịrị imezi ma a bịa n’iji iwu Chineke kpọrọ ihe ma ọ bụ n’ịkpọ omume ọjọọ asị?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 119:160​—N’ihi ihe e kwuru n’amaokwu a, olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya? (w23.01 2 ¶2)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ọma 119:121-152 (th ihe ọmụmụ nke 2)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gosi mmadụ otú ọ ga-esi chọta ihe ga-amasị ya na jw.org. (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) Gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl, nke na-anaghị abịachi ọmụmụ ihe anya, kwurịta okwu. (lmd isi nke 12 nọmba nke 4)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 121

7. Ekwela Ka Ego Mee Ka Ahụ́ Niile Na-afụ Gị Ụfụ

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ndị hụrụ ego n’anya emeela “ka ahụ́ niile na-afụ ha ụfụ ka ndị mara onwe ha mma aghara aghara.” (1 Tim. 6:9, 10) N’okpuru ebe a, e dere ụfọdụ nsogbu ga-abịara anyị ma anyị hụ ego n’anya ma kwe ka ọ bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị.

  • Anyị na Jehova agaghị adị n’ezigbo mma.​—Mat. 6:24

  • O nweghị mgbe akụnụba ga-eju anyị afọ.​—Ekli. 5:10

  • Ọ ga-esikwuru anyị ike izere omume rụrụ arụ, ma ịgha ụgha ma izu ohi ma ịghọ aghụghọ. (Ilu 28:20) Imekwanụ ihe ndị ahụ ga-eme ka obi anyị na-ama anyị ikpe, mee ka anyị nwee aha ọjọọ, meekwa ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma

Foto si na vidio bụ́ “Ihe Ndị Ị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịna-emefusị Ego Gị.” Ebe otu nwata nwoke ji ihe e ji echekwa ego n’aka.

Gụọnụ Ndị Hibru 13:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ego anya ka anyị ghara ịkpatara onwe anyị obi mgbawa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

Ọ bụrụgodị na anyị ahụghị ego n’anya, anyị ga-akpatara onwe anyị obi mgbawa ma ọ bụrụ na anyị anaghị akpachara anya n’otú anyị si emefu ego.

Kpọnye KATUUN A NA-ESE NA BỌỌDỤ Bụ́ Ihe Ndị Ị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịna-emefusị Ego Gị. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

    Foto si na vidio bụ́ “Ihe Ndị Ị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịna-emefusị Ego Gị.” Ebe otu nwata nwoke na otu nwata nwaanyị na-edepụta ihe ndị dị ha ezigbo mkpa na ihe ndị na-adịchaghị ha mkpa, ha dekwara ego ole nke ọ bụla ga-efu. Nke nwoke dere ihe e ji ege egwú, akpụkpọ ụkwụ, ihe oriri, na tiket e ji agba ụgbọ okporo ígwè. Nke nwaanyị dere pọọsụ, elekere a na-agba n’aka, ihe oriri, na mmanụ ụgbọala.
  • Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme atụmatụ otú anyị ga-esi emefu ego tupu anyị emefuo ya, oleekwa otú anyị ga-esi eme ya?

  • Foto si na vidio bụ́ “Ihe Ndị Ị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịna-emefusị Ego Gị.” Ebe nwata nwaanyị ahụ zụrụ nche anwụ abụọ mgbe mmiri na-ezo. Ọ zụrụ otu maka yanwa, zụọ otu maka nwanne ya nwoke. Mana, nwanne ya nwoke ji ego nke ya zụọ aịs krim.
  • Gịnị mere o ji dị mma ịna-echekwatụ ego?

  • Foto si na vidio bụ́ “Ihe Ndị Ị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịna-emefusị Ego Gị.” Ebe kaadị e ji azụrụ ihe tụrụ otu nwata nwoke ịga n’aka, kaadị ọzọ e ji azụrụ ihe a na-achị ya ọchị.
  • Gịnị mere na ọ dịghị mma ikoro ụgwọ aghara aghara?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr nkebi nke 5, isi nke 19 ¶1-6, vidio kọwara isiokwu a na-amụ, igbe 19A

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 101 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya