MACH 3-9
ILU 3
Abụ nke 8 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi
(Nkeji 10)
Tụkwasị Jehova obi, ọ bụghị onwe gị (Ilu 3:5; ijwbv isiokwu nke 14 ¶4-5)
Gosi na ị tụkwasịrị Jehova obi. Otú ị ga-esi egosi ya bụ ịchọ ka ọ na-eduzi gị na isoro nduzi ya (Ilu 3:6; ijwbv isiokwu nke 14 ¶6-7)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘M̀ na-achọ ka Jehova na-eduzi m n’ihe niile m na-eme ná ndụ m?’
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ilu 3:3—Olee otú anyị nwere ike isi yiri ịhụnanya na ịbụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi ka ihe olu, deekwa ha edee n’obi anyị? (w06 9/15 17 ¶6)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ilu 3:1-18 (th ihe ọmụmụ nke 12)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Zaghachi onye kwuru ihe ndị na-achọghị ịnụ ozi ọma na-ekwukarị. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 4) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Gwa onye ahụ gbasara jw.org, nyekwa ya kaadị jw.org. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)
6. Okwu
(Nkeji 5) w11 3/15 14 ¶7-10—Isiokwu: Gosi na Ị Tụkwasịrị Chineke Obi Mgbe Ndị Mmadụ Na-enweghị Mmasị n’Ozi Ọma Ị Na-ezisa. (th ihe ọmụmụ nke 20)
Abụ nke 124
7. Gosi na Ị Tụkwasịrị Nzukọ Jehova Obi
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
O nwere ike ịdịtụrụ anyị mfe ịtụkwasị ntụziaka si n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl e si n’ike mmụọ nsọ dee, obi. Ma, o nwere ike ịka siere anyị ike ịtụkwasị ntụziaka si n’aka ndị mmadụ na-ezughị okè na-eduzi nzukọ Jehova obi, karịchaa, ma ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ntụziaka ha nyere ma ọ bụ na ọ dịchaghị anyị mma.
Gụọ Malakaị 2:7. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị mere na o jughị anyị anya na Jehova na-eji ụmụ mmadụ na-ezughị okè eduzi ndị ya?
Gụọ Matiu 24:45. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị ntụziaka nzukọ Jehova na-enye anyị obi?
Gụọ Ndị Hibru 13:17. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akwado mkpebi ndị Jehova họpụtara idu ndị ya na-eme?
Kpọnye Vidio Si na Vidio Bụ́ Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2021—Agba nke 9. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Olee otú ntụziaka anyị nwetara n’oge ọrịa koronavaịrọs si mee ka ị tụkwasịkwuo nzukọ Jehova obi?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 22 ¶23-31, igbe 22A