ỌGỌST 18-24
ILU 27
Abụ nke 102 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Otú Ezigbo Ndị Enyi Si Abara Anyị Uru
(Nkeji 10)
Ezigbo ndị enyi anyị ga-akata obi nye anyị ndụmọdụ e kwesịrị inye anyị (Ilu 27:5, 6; w19.09 5 ¶12)
Ezigbo ndị enyi anyị nwere ike ịma otú ha ga-esi nyere anyị aka karịa ndị ikwu anyị (Ilu 27:10; it-2 491 ¶3)
Ezigbo ndị enyi anyị na-enyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma (Ilu 27:17; w23.09 10 ¶7)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ilu 27:21—Olee otú otuto si egosi ụdị mmadụ anyị bụ? (w06 9/15 19 ¶11)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ilu 27:1-17 (th ihe ọmụmụ nke 5)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye ahụ nọ n’okpukpe na-ekweghị na Kraịst. (lmd isi nke 6 nọmba nke 5)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gosi ya vidio si n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)
6. Okwu
(Nkeji 5) ijwyp isiokwu nke 75—Isiokwu: Gịnị Ka M Ga-eme ma Enyi M Kpasuo M Iwe? (th ihe ọmụmụ nke 14)
Abụ nke 109
7. “Nwanne Nke Na-enyere Enyi Ya Aka n’Oge Nsogbu”
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Jehova enyela anyị ụmụnna zuru ụwa ọnụ bụ́ ndị anyị ga-esi n’ime ha nweta ndị enyi hụrụ anyị n’anya. Ọ bụ eziokwu na anyị na ndị niile nọ n’ọgbakọ nwere ike ịdị ná mma, ma mmadụ ole n’ime ha bụ ezigbo enyi anyị? Mmadụ na mmadụ na-abụ ezigbo enyi ma ha mata ibe ha nke ọma, tụkwasị ibe ha obi, na-agwa ibe ha otú obi dị ha, na-emekọ ihe ọnụ, na-enyekwara ibe ha aka. N’ihi ya, anyị ga-agbarịrị mbọ tupu anyị emeta ezigbo enyi ma nọgide na-abụ ezigbo enyi. Ime ihe ndị a na-ewekwa oge.
Gụọ Ilu 17:17. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị mere anyị ji kwesị imeta ezigbo ndị enyi ugbu a tupu oké mkpagbu amalite?
Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:12, 13. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Olee otú ime ihe e kwuru n’amaokwu ndị a ga-esi nyere anyị aka imeta ndị enyi?
Kpọnye VIDIO Bụ́ “E Nwere Oge Kwesịrị Ekwesị Maka Ihe Ọ Bụla”—Imeta Ndị Enyi Na-ewe Oge. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị ka ị mụtara na vidio a banyere imeta ndị enyi?
Ihe mbụ i nwere ike ime iji meta mmadụ enyi bụ ịmụmụrụ onye ahụ ọnụ ọchị ma ọ bụ ikele ya ekele. Ihe ọzọ abụrụ igosi ya na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi. Ọ na-ewe oge tupu mmadụ na mmadụ abụrụ ezigbo enyi. N’ihi ya, nwee ndidi. I mee ihe ndị a, gị na onye ahụ nwere ike imecha bụrụ enyi ruo mgbe ebighị ebi.
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 10-11