ỌGỌST 11-17
ILU 26
Abụ nke 88 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Zere “Onye Nzuzu”
(Nkeji 10)
Ọtụtụ mgbe, a naghị akwanyere “onye nzuzu” ùgwù (Ilu 26:1; it-2 729 ¶6)
Ọ na-adịkarị mkpa ka a dọsie “ndị nzuzu” aka ná ntị ike (Ilu 26:3; w87 10/1 19 ¶12)
A naghị atụkwasị “onye nzuzu” obi (Ilu 26:6; it-2 191 ¶4)
IHE Ọ PỤTARA: Na Baịbụl, okwu bụ́ “onye nzuzu” pụtara onye na-anaghị eche echiche nke ọma, nke na-ejighị iwu Chineke kpọrọ ihe.
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ilu 26:4, 5—Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ilu abụọ a anaghị emegide ibe ha? (it-1 846)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ilu 26:1-20 (th ihe ọmụmụ nke 5)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Jiri traktị malite mkparịta ụka. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gị na ya kwurịtakwuo ihe dị na traktị i nyere ya n’oge gara aga unu kwurịtara. (lmd isi nke 7 nọmba nke 4)
6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
(Nkeji 5) Nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ka ọ kwadebe izi onye ikwu ya ozi ọma. (lmd isi nke 11 nọmba nke 5)
Abụ nke 94
7. Na-amụ Ihe Ka “Ị Mara Ihe, A Zọpụtakwa Gị”
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Pọl onyeozi chetaara Timoti uru ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ ọ mụtara bido n’oge ọ bụ nwata bara. Ihe ndị ahụ nyeere Timoti aka ‘ịmara ihe, nke ga-emekwa ka a zọpụta ya.’ (2 Tim. 3:15) Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị iwepụta oge ọ ga-eji na-agụ ma na-amụ Baịbụl n’ihi na eziokwu ndị dị na ya bara ezigbo uru. Ma, ọ bụrụkwanụ na ịmụ ihe anaghị atọ anyị ụtọ?
Gụọ 1 Pita 2:2. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Ànyị ga-amụtali ime ka ịmụ Baịbụl na-atọ anyị ụtọ?
Gịnị ka anyị ga-eme ka ịmụ Okwu Chineke ‘na-agụ anyị agụụ’?—w18.03 29 ¶6
Olee otú ihe ndị nzukọ Jehova wepụtara na-adị n’ekwentị nakwa na kọmputa nwere ike isi nyere anyị aka ịmụtakwu ihe mgbe anyị na-agụ ma ọ bụ na-amụ Baịbụl?
Kpọnye VIDIO Bụ́ Ihe Nzukọ Jehova Na-eme—Ihe Ga-enyere Gị Aka na JW Library. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Olee otú JW Library® sirila baara gị uru?
Olee ihe ndị dị na ya na-amasị gị iji amụ ihe?
Olee ihe ndị dị na ya ị ga-achọ ịmata ihe ha na-arụ ma bido iji ha amụ ihe?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 8-9