ỌKTOBA 6-12
EKLIZIASTIS 5-6
Abụ nke 42 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
Ebe ndị Izrel na-ege ntị nke ọma mgbe onye nchụàjà na-akọwa Iwu Mosis
1. Otú Anyị Si Egosi na Anyị Na-akwanyere Chineke Ukwu Anyị Ezigbo Ùgwù
(Nkeji 10)
Anyị na-egosi na anyị na-akwanyere Chineke ùgwù n’ọmụmụ ihe anyị ma anyị yiri uwe dị mma bịa, dịrị mma n’anya ma na-ege ntị (Ekli. 5:1; w08 8/15 15-16 ¶17-18)
Anyị na-echebara ekpere anyị na-ekpe n’ihu ọha echiche, na-ekpekwa ya otú gosiri na anyị na-akwanyere Chineke ùgwù, ọ bụghị ikpe ya ka ọ dị ogologo (Ekli. 5:2; w09 11/15 11 ¶21)
Anyị na-emezu nkwa anyị kwere Chineke n’oge anyị nyefere ya onwe anyị (Ekli. 5:4-6; w17.04 6 ¶12)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ekli. 5:8—Olee otú amaokwu a ga-esi akasi anyị obi ma e megbuwe anyị? (w20.09 31 ¶3-5)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ekli. 5:1-17 (th ihe ọmụmụ nke 12)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(1 nkeji) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye ahụ chọrọ ka unu rụwa ụka. (lmd isi nke 4 nọmba nke 5)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kụziere mmadụ otu n’ime “Eziokwu Ndị Na-amasị Anyị Ịkụziri Ndị Ọzọ” nke dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 1 nọmba nke 3)
6. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gosi onye ahụ otu vidio si n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. (lmd isi nke 7 nọmba nke 3)
7. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
Abụ nke 160
8. Ị̀ Na-eji “Eziokwu Ndị Na-amasị Anyị Ịkụziri Ndị Ọzọ” Ezi Ozi Ọma?
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Kemgbe e wepụtara broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs, o nyerela anyị aka imekwu nke ọma n’otú anyị si akpanyere ndị mmadụ ụka. Ihe mere e ji nwee nkebi bụ́ Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara Nke A bụ ka o nyere anyị aka ịkụziri ndị mmadụ eziokwu ndị na-ataghị akpụ dị na Baịbụl ma anyị na ha kparịtawa ụka. (Hib. 4:12) Ị̀ matala ihe ndị e kwuru n’isiokwu itoolu e nwere ná nkebi ahụ a kpọrọ “Eziokwu Ndị Na-amasị Anyị Ịkụziri Ndị Ọzọ”?
Olee otú anyị nwere ike isi bido ịkụziri mmadụ eziokwu na-ataghị akpụ n’oge kwesịrị ekwesị ka anyị na ya na-akparịta ụka?—lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A
Olee isiokwu ndị kacha amasị ndị bi n’ókèala unu?
Gịnị ka ị ga-eme ka amaokwu Baịbụl ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A dokwuo gị anya?
Amaokwu Baịbụl ndị a ga na-edokwu anyị anya ma anyị jiri ha na-ekwusa ozi ọma. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ iji ha na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ugboro ugboro, anyị ga-ebugodị ụzọ chọta ndị anyị ga-ezi ozi ọma n’ókèala anyị.
Kpọnye VIDIO Bụ́ “A Na-eji Ígwè Amụcha Ígwè”—Ịchọtakwu Ndị A Ga-ezi Ozi Ọma. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị ga-enyere anyị aka ịchọtakwu ndị mmadụ n’ókèala anyị?
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 24-25