Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb25 Septemba p. 12-13
  • Ọktoba 13-19

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọktoba 13-19
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
mwb25 Septemba p. 12-13

ỌKTOBA 13-19

EKLIZIASTIS 7-8

Abụ nke 39 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. ‘Gaa n’Ebe A Na-eru Uju’

(Nkeji 10)

Na-ewepụta oge na-akasi ndị na-eru uju obi (Ekli. 7:2; it “Iru Uju” ¶9)

Na-ekwu gbasara àgwà ọma ndị e ji mara onye ahụ nwụrụ anwụ iji kasie ndị na-eru uju ọnwụ ya obi (Ekli. 7:1; w19.06 23 ¶15)

Soro ndị na-eru uju kpee ekpere (w17.07 15-16 ¶16)

Ebe otu di na nwunye gara ileta otu nwanna nwoke nwunye ya nwụrụ. Ha na-egosi ya foto ha na nwunye ya sere. Ihu bụ ha sọ ọchị na foto ahụ.

IHE I KWESỊRỊ ICHETA: Ọ na-adịkarị ndị mmadụ nwụnahụrụ mkpa ka Ndị Kraịst ibe ha na-enyere ha aka ruo oge ụfọdụ.​—w17.07 16 ¶17-19.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ekli. 7:20-22​—Olee otú amaokwu ndị a ga-esi enyere anyị aka ikpebi ma ànyị ga-aga gwa onye mejọrọ anyị okwu ka ànyị ga-ahapụwa? (w23.03 31 ¶18)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ekli. 8:1-13 (th ihe ọmụmụ nke 10)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Chọpụta isiokwu ga-amasị onye ahụ, meekwa ndokwa otú gị na ya ga-esi akparịta mgbe ọzọ. (lmd isi nke 2 nọmba nke 4)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. (lmd isi nke 2 nọmba nke 3)

6. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gosi onye ahụ ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ya bụ, jw.org. (lmd isi nke 9 nọmba nke 4)

7. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 5) Ihe Ngosi. ijwfq isiokwu nke 50​—Isiokwu: Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ele Olili Ozu Anya? (th ihe ọmụmụ nke 17)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 151

8. Mee Ka Okwukwe I Nwere na A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ Sikwuo Ike

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Foto si na vidio bụ́ “Na-eme Ka Ụmụ Nwaanyị Ndị Okwukwe Ha Siri Ike​—Mata.” Ebe Mata na Meri ji obi ụtọ na-aga ịmakụ Lazarọs mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ.

Nkwa Jehova kwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ bụ otú n’ime eziokwu anyị kacha jiri kpọrọ ihe. Ọ na-akụziri anyị banyere àgwà dị iche iche Jehova nwere, dị ka ike, amamihe, ebere, ma karịchaa, ịhụnanya ọ hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị.​—Jọn 3:16.

Ọ bụrụ na okwukwe anyị nwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ siri ike, anyị agaghị na-echegbukarị onwe anyị maka nsogbu ndị na-abịara anyị. (2 Kọr. 4:16-18) Obi ga na-eru anyị ala, anyị akarakwa obi mgbe a na-akpagbu anyị, mgbe anyị na-arịa ọrịa, ma ọ bụkwanụ mgbe mmadụ nwụnahụrụ anyị. (1 Tesa. 4:13) Anyị agaghị enweli ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị enweghị okwukwe na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (1 Kọr. 15:19) Gbaa mbọ mee ka okwukwe i nwere na ihe ọma a anyị na-atụ anya ya ga-emezu na-esikwu ike.

Gụọ Jọn 11:21-24. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Mata si gosi na okwukwe o nwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ siri ike?

  • Olee otú e si gọzie ya maka na o nwere okwukwe?​—Jọn 11:38-44

Kpọnye VIDIO Bụ́ Na-eme Ka Ụmụ Nwaanyị Ndị Okwukwe Ha Siri Ike​—Mata. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere i ji jiri olileanya i nwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ kpọrọ ihe?

  • Gịnị ka ị ga-eme ka okwukwe i nwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ na-esikwu ike?

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 26-27

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 124 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya