Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb25 Septemba p. 14-15
  • Ọktoba 20-26

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọktoba 20-26
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
mwb25 Septemba p. 14-15

ỌKTOBA 20-26

EKLIZIASTIS 9-10

Abụ nke 30 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Na-ele Ọnwụnwa Ndị Na-abịara Gị Anya Otú Kwesịrị Ekwesị

(Nkeji 10)

Anyị ma na ọnwụnwa ndị na-abịara anyị apụtaghị na Jehova na-ewere anyị iwe (Ekli. 9:11; w13 8/15 14 ¶20-21)

Anyị anaghị atụ anya na ihe niile ga na-agaziri anyị n’ụwa Setan a (Ekli. 10:7; w19.09 4 ¶10)

Anyị kwesịrị ịna-ewepụta oge anyị ga-eji jiri ihe ọma ndị Jehova nyere anyị na-eme onwe anyị obi ụtọ, ma n’oge ihe siiri anyị ike (Ekli. 9:7, 10; w11 10/15 8 ¶1-2)

Ebe otu nwaanyị nọ n’akụkụ mmiri na-ele anya n’eluigwe.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ekli. 10:12-14​—Olee aka ná ntị amaokwu ndị a na-adọ anyị gbasara ịgba asịrị? (it “Ịgba Asịrị, Ikwutọ Mmadụ” ¶4, 8)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ekli. 10:1-20 (th ihe ọmụmụ nke 11)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Malite ịkpanyere onye ihu na-adịchaghị mma ụka. (lmd isi nke 3 nọmba nke 4)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kụziere onye na-echegbu onwe ya n’ihi otú ihe si sie ike otu n’ime “Eziokwu Ndị Na-amasị Anyị Ịkụziri Ndị Ọzọ.” Jiri ihe e kwuru n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya mee ya. (lmd isi nke 4 nọmba nke 4)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) lff nchịkọta isi nke 17, ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ, na ihe ị ga-agba mbọ mee. (lmd isi nke 12 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 47

7. Jehova Ga-enyere Gị Aka n’Oge Nsogbu

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ọnwụnwa na nsogbu dị iche iche na-abịara anyị kwa ụbọchị. Ma, ụfọdụ ọnwụnwa na-abịara anyị na mberede, ha nwekwara ike ime ka obi gbawaa anyị nke na ike ga-agwụcha anyị, obi adaa anyị mbà, ya adịkwa anyị ka anyị na Jehova adịghịzi ná mma. Ònye ga-enyere anyị aka ma ọ dị anyị otú a? Oleekwa ihe anyị kwesịrị ime?

N’agbanyeghị ụdị ọnwụnwa bịaara anyị, Jehova ka ‘na-echebe anyị.’ (Aịza. 33:6) Ihe ga-enyere anyị aka ịtụkwasị Jehova obi bụ ịdị umeala n’obi na imeru ihe n’ókè. (Ilu 11:2) Ọ bụrụ na ọdachi adakwasị anyị, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị wepụta oge lebara onwe anyị ma ọ bụ onye anyị hụrụ n’anya anya, mee mkpebi dị mma, ma ọ bụkwanụ wepụta oge ruo uju.​—Ekli. 4:6.

Ebe ọ bụ na Jehova na-eji ụmụnna anyị akasi anyị obi, anyị kwesịkwara ịdị njikere ịgwa ha ka ha nyere anyị aka ma ọ bụ nabata aka ha ga-enyere anyị. Na-echeta na ụmụnna gị hụrụ gị n’anya nke ukwuu, obi ga-atọkwa ha ụtọ inyere gị aka.

Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:7-9. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ịgbasi mbọ ike na-eme ihe ndị anyị na-eme n’ofufe anyị na-efe Jehova, ma n’oge ọ na-esiri anyị ike ime otú ahụ?

Foto si na vidio bụ́ “Jehova Nọ Ndị Obi Ha Tiwara Etiwa Nso.” Ebe Nwanna Septer na nwunye ya na-eru uju ọnwụ nwa ha.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Jehova Nọ Ndị Obi Ha Tiwara Etiwa Nso. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú Jehova si nyere Nwanna Septer na nwunye ya aka?

  • Olee otú ụmụnna anyị si nyere ha aka?

  • Olee ihe ọzọ ị mụtara n’ihe ha mere?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 28, okwu mmalite nkebi nke 6, na isi nke 29

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 28 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya