NỌVEMBA 10-16
ABỤ SOLOMỌN 3-5
Abụ nke 31 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Àgwà Ọma Bara Uru
(Nkeji 10)
Otú nwa agbọghọ Shulem si agwa ndị ọzọ okwu gosiri na o nwere àgwà ọma (Abụ Solo. 4:3, 11; w15 1/15 30 ¶8)
E ji nwa agbọghọ a tụnyere ubi a gbara ogige maka na o merụghị onwe ya emerụ (Abụ Solo. 4:12; w00 11/1 11 ¶17)
Àgwà ọma bara uru karịa mma elu ahụ́. Anyị niile nwekwara ike ịna-akpa àgwà ọma (g05 1/8 21 ¶2-5)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee àgwà ọma ndị ọzọ na-akpa kacha amasị m?’
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Abụ Solo. 3:5—Gịnị mere nwa agbọghọ Shulem ji jiri “ele na nne mgbada bi n’ọhịa” na-arịọ “ụmụ nwaanyị Jeruselem” ka ha ṅụọrọ ya iyi? (w06 11/15 18 ¶4)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Abụ Solo. 4:1-16 (th ihe ọmụmụ nke 2)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa onye ị hụrụ n’ozi ụlọ n’ụlọ otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 6 nọmba nke 4)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gosi onye ahụ otú e si achọta ihe na jw.org n’asụsụ ya. (lmd isi nke 4 nọmba nke 3)
6. Okwu
(Nkeji 5) ijwbq isiokwu nke 131—Isiokwu: Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ntecha na Iyi Ọla? (th ihe ọmụmụ nke 1)
Abụ nke 36
7. Lụọ Naanị Onye Na-eso Ụzọ Onyenwe Anyị (Jen. 28:2)
(Nkeji 8)
8. Ị̀ Ga-abụ Ezigbo Di Ma Ọ Bụ Ezigbo Nwunye?
(Nkeji 7) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ị̀ na-achọ nwoke ma ọ bụ nwaanyị ị ga-alụ? Ọ bụrụ na ụmụnna ndị na-achọ di ma ọ bụ nwaanyị eleruo gị anya, ihe ha na-ahụ ọ̀ bụ nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị nwere ezigbo àgwà? Mmadụ nwere ike na-akpatụ àgwà ka ezigbo Onye Kraịst, ma ka oge na-aga, ọ na-egosi ụdị onye ọ bụ n’eziokwu.
Dee otu amaokwu Baịbụl dabara na nke ọ bụla n’ime àgwà ndị a ezigbo Onye Kraịst na-akpa.
Ịhụ Jehova n’anya na inwe okwukwe na ya
Ịbụ ezigbo onyeisi ezinụlọ ma ọ bụ ịbụ nwaanyị na-erubere di ya isi
Ịchọ ihe ga-abara ndị ọzọ uru na inwe ezigbo ịhụnanya
Ichezi echiche echezi, imeru ihe n’ókè, na ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị
Ịrụsi ọrụ ike na ịgba mbọ
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 34-35