NỌVEMBA 17-23
ABỤ SOLOMỌN 6-8
Abụ nke 34 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Bụrụ Mgbidi, Ọ Bụghị Ibo Ụzọ
(Nkeji 10)
Nwa agbọghọ Shulem nwere ụmụnne ndị nwoke. Ha achọghị ka nwanne ha nwaanyị mebie (Abụ Solo. 8:8, 9; it “Abụ Solomọn” ¶11)
Obi ruru nwa agbọghọ Shulem ala maka na o meriri ọnwụnwa ndị bịaara ya (Abụ Solo. 8:10; yp 188 ¶2)
Ndị na-eto eto kwesịrị ịna-eme ihe a o mere (yp2 33)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee otú m ga-esi enyere ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di ma ọ bụ ụmụnna nwoke na-alụbeghị nwunye n’ọgbakọ anyị aka ka ha bụrụ mgbidi, ọ bụghị ibo ụzọ?’
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Abụ Solo. 8:6—Olee otú o si bụrụ na ezigbo ịhụnanya dị ka “ọkụ nke Jaa”? (w15 1/15 29 ¶3)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Abụ Solo. 7:1-13 (th ihe ọmụmụ nke 12)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Jiri kaadị jw.org malite mkparịta ụka. (lmd isi nke 4 nọmba nke 4)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Jiri traktị malite mkparịta ụka n’ebe a na-azụ ahịa. (lmd isi nke 1 nọmba nke 4)
6. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Jiri obi ụtọ kpanyere mmadụ ụka, ma ụka gị na ya na-akparịta ga-ebi tupu gị enwee ike izi ya ozi ọma. (lmd isi nke 2 nọmba nke 4)
7. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 5) Ihe Ngosi. ijwfq isiokwu nke 43—Isiokwu: Ndịàmà Jehova Hà Tiri Iwu Gbasara Otú Nwoke na Nwaanyị Ga-esi Na-akpa Tupu Ha Alụọ? (th ihe ọmụmụ nke 7)
Abụ nke 121
8. Gbaaranụ Ịkwa Iko Ọsọ
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
N’akwụkwọ Abụ Solomọn, nwa okorobịa na-azụ atụrụ gwara nwa agbọghọ Shulem ka ha abụọ soro pụtụ apụ. (Abụ Solo. 2:10-14) Ọ bụ eziokwu na ọ ga-abụ na nwa okorobịa ahụ ebughị ihe ọjọọ n’obi, ma ụmụnne nwa agbọghọ ahụ nyere ya ọrụ ọ ga-arụ iji gbochie ya iso nwa okorobịa ahụ pụọ. (Abụ Solo. 2:15) Ha ma na ọ bụrụ na nwanne ha nwaanyị na nwa okorobịa ọ hụrụ n’anya anọrọ naanị ha, ha nwere ike ime omume rụrụ arụ.
Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha ‘gbaara ịkwa iko ọsọ.’ (1 Kọr. 6:18) Anyị kwesịrị izere ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị mee ihe ọjọọ. Onye si n’ike mmụọ nsọ dee Abụ Solomọn dekwara, sị: “Onye ma ihe hụ nsogbu, ọ na-aga zoo, ma ndị na-amaghị ihe na-agara banye ná nsogbu, ha na-atakwa ahụhụ ya.”—Ilu 22:3.
Kpọnye VIDIO Bụ́ Chineke “Maara Ihe Nzuzo Niile nke Obi.” Jụzie ụmụnna ajụjụ a:
Gịnị na gịnị ka ị mụtara na vidio a anyị lere?
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 36-37