Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp21 nke 2 p. 7-9
  • Olee Mgbe Ụwa Ga-agwụ? Ihe Jizọs Kwuru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Mgbe Ụwa Ga-agwụ? Ihe Jizọs Kwuru
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • LEGODỊ IHE ABỤỌ JIZỌS KWURU GBASARA ỌGWỤGWỤ ỤWA:
  • IHE NDỊ GA NA-EME N’ỤWA
  • “OGE IKPEAZỤ”
  • MGBE ỤWA GA-AGHỌ PARADAỊS DỊ NSO
  • A Zaa Ajụjụ Anọ Banyere Ọgwụgwụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
wp21 nke 2 p. 7-9
Ebe Jizọs na-akọwara ndịozi ya ihe ndị ga-egosi na ọgwụgwụ ụwa dị nso.

Olee Mgbe Ụwa Ga-agwụ? Ihe Jizọs Kwuru

Dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu nke a ụzọ, mgbe Baịbụl kwuru gbasara ọgwụgwụ ụwa, ọ pụtaghị ọgwụgwụ ụwa a anyị bi na ya. Ọ pụtaghịkwanụ na a gaghịzi enwe ndị ga-ebi n’ụwa a. Kama, ihe ọ pụtara bụ na a ga-ebibi ndị ọjọọ niile. Ma Baịbụl, ò kwuru kpọmkwem mgbe a ga-ebibi ndị ọjọọ niile?

LEGODỊ IHE ABỤỌ JIZỌS KWURU GBASARA ỌGWỤGWỤ ỤWA:

“N’ihi ya, na-echenụ nche, maka na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge ọ ga-abụ.”​—MATIU 25:13.

“Na-elenụ anya, mụrụnụ anya, n’ihi na unu amaghị oge ọ ga-abụ.” ​—MAK 13:33.

N’ihi ya, o nweghị onye nọ n’ụwa ma kpọmkwem mgbe Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume n’ụwa. Ma Chineke nwere “oge” a kapịrị ọnụ ọ ga-ebibi ha, ya bụ, “ụbọchị na awa” ọ ga-eme otú ahụ. (Matiu 24:36) Ma ihe a ọ̀ pụtara na o nwetụdịghị otú mmadụ ga-esi ama na ọgwụgwụ adịla nso? Mbanụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ihe ga na-eme n’ụwa ha ga-eji ama na ọgwụgwụ adịla nso.

IHE NDỊ GA NA-EME N’ỤWA

Ihe ndị Jizọs kwuru ga na-eme n’ụwa ga-abụ ihe àmà “nke ọgwụgwụ oge a.” Jizọs kwuru, sị: “Mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha. A ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche.” (Matiu 24:​3, 7) O kwukwara na a ga-enwe “ọrịa na-efe efe” n’ebe dị iche iche. (Luk 21:11) Ị̀ na-ahụ ka ihe ndị a Jizọs kwuru na-emezu?

Taa, agụụ, agha, ala ọma jijiji, na ajọ ọrịa dị iche iche akpaala ndị mmadụ aka ọjọọ n’ụwa. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2004, nnukwu ala ọma jijiji mere n’Oké Osimiri India gburu ihe dị ka narị puku mmadụ abụọ na puku iri abụọ na ise (225,000). N’ime afọ atọ, ọrịa koronavaịrọs tara isi ihe dị ka nde mmadụ isii na narị puku itoolu (6,900,000) n’ụwa niile. Jizọs kwuru na a ga-eji ụdị ihe ndị a ama na ọgwụgwụ ụwa adịla nso.

“OGE IKPEAZỤ”

Baịbụl kpọrọ oge a ga-enwe tupu ọgwụgwụ abịa ‘oge ikpeazụ.’ (2 Pita 3:​3, 4) Baịbụl kwukwara na 2 Timoti 3:​1-5 na ihe a ga-eji ama oge ikpeazụ bụ na àgwà ndị mmadụ ga-ajọgbu onwe ha. (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “Ihe Ndị Ga Na-eme Tupu Ọgwụgwụ Abịa.”) Ị̀ na-ahụ ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha, ndị anyaukwu, ndị tigbuo zọgbuo, na ndị na-akpa àgwà ọjọọ ndị ọzọ taa? Ihe a ndị mmadụ na-eme so n’ihe ndị na-egosi na ọgwụgwụ ụwa dị ezigbo nso.

Oge ikpeazụ, ọ̀ ga-anọ afọ ole? Baịbụl kwuru na ọ bụ naanị ‘ntakịrị oge.’ Ntakịrị oge ahụ gachaa, Chineke ebibie “ndị na-ebibi ụwa.”​—Mkpughe 11:​15-18; 12:12.

Agha

Ebe ndị agha na-akwa mgbọ.
  • N’afọ 2007 ruo n’afọ 2017, ndị nwụrụ n’agha nakwa ndị ndị ọjọọ gburu ji ihe karịrị okpukpu abụọ mụbaa

Ọrịa

Ebe otu nwoke ahụ́ na-adịghị nọ n’ụlọ ọgwụ.
  • Ụfọdụ ọrịa ndị kacha egbu ndị mmadụ bụ ọrịa obi, ọrịa strok, ọrịa akpa ume, ọrịa ụmụaka a mụrụ ọhụrụ, afọ ọsịsa, ọrịa kansa, na ụkwara nta

Agụụ

Ebe otu nwatakịrị nwaanyị agụụ na-anyụ ịkpakwu ji efere.
  • N’afọ 2021, ihe dị ka mmadụ iri n’ime otu narị mmadụ ọ bụla bi n’ụwa ahụghị tụrụ rachaa. Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu nwatakịrị n’ime ụmụaka atọ ọ bụla anaghị eri ezigbo nri, nke mere ka ha ghara ito nke ọma

Ikwusa Ozi Ọma n’Ụwa Niile

Ebe Ndịàmà Jehova ji ihe a na-akwagharị akwagharị na-ekwusa ozi ọma na-ezi otu nwoke ozi ọma.
  • Ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova asatọ na narị puku isii (8,600,000) na-ekwusa ozi ọma na narị mba abụọ na iri anọ (240). Ha na-enye ndị mmadụ akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị otu puku (1,000) asụsụ

MGBE ỤWA GA-AGHỌ PARADAỊS DỊ NSO

Chineke ewepụtala ụbọchị na awa ọ ga-ebibi ndị ajọ omume. (Matiu 24:36) Ma e nwekwara ozi ọma ọzọ. Ozi ọma ahụ bụ na ‘o nweghị onye Chineke chọrọ ka e bibie.’ (2 Pita 3:9) Ọ na-enye anyị niile ohere ka anyị mata ya ma na-erubere ya isi. Gịnị mere o ji eme otú ahụ? Ọ bụ maka na ọ chọghị ka e bibie anyị mgbe a ga-ebibi ndị ọjọọ, kama ọ chọrọ ka anyị biri n’ụwa ọhụrụ ya mgbe ọ ga-aghọ paradaịs.

Chineke ahaziela ka e zie ndị bi ná mba niile ozi ọma ka ha mata ihe ha ga-eme ka ha nwee ike ibi n’ụwa ọhụrụ ya mgbe Alaeze ya ga na-achị ụwa. Jizọs sịrị na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke “n’ebe niile n’ụwa.” (Matiu 24:14) Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa niile na-eji ọtụtụ ijeri awa ezi ndị mmadụ ozi ọma ma na-akụziri ha Baịbụl. Ozi ọma a na-eme ka ndị mmadụ nwee olileanya. Jizọs sịrị na a ga-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile tupu ọgwụgwụ abịa.

Oge ọchịchị ụmụ mmadụ ga-agwụ eruola eruo. Ma ozi ọma dịnụ bụ na e nwere ike ịzọpụta gị mgbe a ga-ebibi ụwa a, gị ebirikwa n’ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere anyị ná nkwa. N’isiokwu ọzọ, anyị ga-eleba anya n’ihe ị ga-eme ka i nwee ike ibi n’ụwa ọhụrụ ahụ.

IHE NDỊ GA NA-EME TUPU ỌGWỤGWỤ ABỊA

“Oge ikpeazụ ga-adị oké egwu, taakwa akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-etu ọnụ, ndị mpako, ndị na-ekwulu ndị ọzọ, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-anaghị ekele onye meere ha ihe, ndị na-agharịpụ ndị ọzọ, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla, ndị na-ekwutọ ndị ọzọ, ndị na-anaghị ejideli onwe ha, ndị tigbuo zọgbuo, ndị ihe ọma na-anaghị amasị, ndị na-eme ndị enyi ha ihe ọjọọ, ndị isi ike, ndị onwe ha na-ebu isi, ndị ihe bụ́ mkpa ha bụ ikpori ndụ, ọ bụghị ịhụ Chineke n’anya, ndị na-eme ka hà ji ife Chineke kpọrọ ihe, ma ha anaghị erubere ya isi.”​—2 TIMOTI 3:​1-5.

Ihe Jizọs kwuru gbasara “oge ikpeazụ” na-emesi anyị obi ike na ụwa ọhụrụ dị nso

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya