ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 6
Ihe Baịbụl Na-akụziri Anyị Gbasara Onye E Dere Uche Ya na Ya
“Dee ihe niile m na-agwa gị n’akwụkwọ.”—JERE. 30:2.
ABỤ NKE 96 Okwu Chineke Bụ Akụ̀
IHE ISIOKWU A NA-EKWUa
1. Olee ihe mere obi ji dị gị ụtọ maka Baịbụl?
OBI dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova Chineke nyere anyị Baịbụl. O si na ya agwa anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị taa. Ọ na-esikwa na ya eme ka anyị nwee olileanya magburu onwe ya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Nke kachanụ bụ na Jehova na-esi na Baịbụl eme ka anyị mata àgwà ndị o nwere. Ọ bụrụ na anyị echebara ọmarịcha àgwà ndị o nwere echiche, ọ na-eru anyị n’obi, meekwa ka anyị chọọ ịbụ ezigbo ndị enyi ya.—Ọma 25:14.
2. Olee ụzọ dị iche iche Jehova si mee ka ụmụ mmadụ mata onye ọ bụ?
2 Jehova chọrọ ka ndị mmadụ mata onye ọ bụ. N’oge ochie, Jehova si ná nrọ, n’ọhụụ, nakwa n’aka ndị mmụọ ozi zie ndị mmadụ ozi banyere onwe ya. (Ọnụ Ọgụ. 12:6; Ọrụ 10:3, 4) Ma, olee otú anyị ga-esi mụọ gbasara nrọ ndị a, ọhụụ ndị a, ma ọ bụkwanụ ozi ndị a si n’aka ndị mmụọ ozi ma ọ bụrụ na e deghị ha ede? Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji mee ka ụfọdụ ụmụ nwoke dee ihe ọ chọrọ ka anyị mara “n’akwụkwọ.” (Jere. 30:2) Ebe ọ bụ na “ihe ezi Chineke na-eme zuru okè,” obi kwesịrị isi anyị ike na otú o si ezi ụmụ mmadụ ozi magburu onwe ya, baakwa uru.—Ọma 18:30.
3. Olee otú Jehova si mee ka Baịbụl ka dịrị ruo taa? (Aịzaya 40:8)
3 Gụọ Aịzaya 40:8. Chineke esila n’Okwu ya gwa ndị ohu ya ihe bara uru duziri ha kemgbe ọtụtụ puku afọ. Olee otú o si kwe omume? Ihe mere ajụjụ a ji dị mkpa bụ na e dere Baịbụl ndị mbụ n’ihe ndị na-emebi emebi. N’ihi ya, e nweghị nke ọ bụla n’ime ha dị taa. Ma, Jehova hụrụ na e depụtara ihe ndị dị na Baịbụl mbụ ahụ. Ọ bụ eziokwu na ndị depụtara ya ezughị okè, ma ha sara anya ná mmiri depụta ya. Otu ọkà mmụta kwuru gbasara Akwụkwọ Nsọ Hibru, sị: “E nwere ike ikwu na e nweghị akwụkwọ ọ bụla ọzọ e dere n’oge ochie e depụtara ihe dị na ya otú a n’ewepụghị ya ihe ọ bụla.” N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ndị dị na Baịbụl anyị na-agụ taa bụ uche Jehova n’agbanyeghị na e dere Baịbụl n’ihe ndị nwere ike imebi emebi, na ọtụtụ afọ agaala kemgbe e dere ya, nakwa na ndị depụtara ihe dị na ya ezughị okè.
4. Olee ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?
4 Ọ bụ n’aka Jehova ka e si enweta “onyinye ọ bụla dị mma, nke zukwara okè.” (Jems 1:17) Baịbụl bụ otu n’ime onyinye ndị kacha mma Jehova nyere anyị. Ọ bụrụ na mmadụ enye anyị onyinye, ọ na-egosi na onye ahụ ma anyị nke ọma, marakwa mkpa anyị. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị Onye nyere anyị Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị agụọ Baịbụl, anyị na-amụta ọtụtụ ihe banyere Jehova. Anyị na-amụta na ọ ma anyị nke ọma, marakwa mkpa anyị. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe anyị si na Baịbụl mụta gbasara àgwà atọ Jehova nwere. Ha bụ: amamihe ya, otú o si ekpe ikpe ziri ezi, na ịhụnanya ya. Ka anyị buru ụzọ leba anya n’otú Baịbụl si egosi na Chineke nwere amamihe.
BAỊBỤL NA-EGOSI NA JEHOVA NWERE AMAMIHE
5. Olee otu ụzọ Baịbụl si egosi na Chineke nwere amamihe?
5 Jehova ma na amamihe ya dị anyị mkpa. Ọ bụkwa amamihe ya juru n’onyinye o nyere anyị bụ́ Baịbụl. Ndụmọdụ dị na Baịbụl na-abara ndị mmadụ uru. Baịbụl na-agbanwe ndụ ndị mmadụ. Mgbe Mosis dechara akwụkwọ ndị mbụ nke Baịbụl, ọ gwara ụmụ Izrel, bụ́ ndị Chineke, sị: “Ọ bụghị okwu na-agaghị abara unu uru, kama ọ bụ okwu ga-eme ka unu dị ndụ.” (Diut. 32:47) Ndị mere ihe ha mụtara n’Akwụkwọ Nsọ na-enwe obi ụtọ ná ndụ. (Ọma 1:2, 3) N’agbanyeghị na ọtụtụ afọ agaala kemgbe e dere Baịbụl, o meghị ka ihe e dere na ya ghara ịna-abara ndị mmadụ uru. Dị ka ihe atụ, ị gaa na jw.org n’isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ,” ị ga-ahụ ọtụtụ akụkọ ndị gosiri na Baịbụl na-akpa ezigbo “ike n’ime . . . ndị kwere ekwe” taa.—1 Tesa. 2:13.
6. Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na o nweghị akwụkwọ ọzọ dị ka Baịbụl?
6 E nweghị akwụkwọ ọzọ dị ka Okwu Chineke. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Onye e dere uche ya na ya bụ́ Jehova Chineke bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ naghị anwụ anwụ, amamihe ya enweghịkwa atụ. N’agbanyeghị na ụfọdụ akwụkwọ na-anọ ogologo oge karịa ndị dere ha, ihe ndị e dere na ha nwere oge ọ na-abụ o ruo, ha anaghịzi aba uru. Mana, ihe ndị dị na Baịbụl na-aba uru mgbe niile. Ha abaakwarala ndị mmadụ uru kemgbe ụwa. Ọ bụrụ na anyị ana-agụ Baịbụl ma na-atụgharị uche na ya, Onye e dere uche ya na ya na-eji mmụọ nsọ ya dị ike enyere anyị aka ịhụ otú anyị ga-esi eme ihe anyị mụtara ná ndụ anyị. (Ọma 119:27; Mal. 3:16; Hib. 4:12) N’eziokwu, Onye e dere uche ya na Baịbụl dị njikere inyere gị aka. Ihe a ga-eme ka ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịna-agụ Baịbụl mgbe niile.
Olee otú Baịbụl si mee ka ndị na-efe Jehova dịrị n’otu ma n’oge gara aga ma n’oge a? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8)
7. Olee otú Baịbụl si mee ka ndị na-efe Chineke n’oge ochie dị n’otu?
7 Ihe ọzọ gosiri na amamihe Chineke juru na Baịbụl bụ na ọ na-eme ka ndị na-efe Chineke dịrị n’otu. Mgbe ndị Izrel batara n’Ala Nkwa ahụ, ha bi n’ebe dị iche iche. Ụfọdụ na-akụ azụ̀, ụfọdụ ana-akpa anụmanụ, e nweekwa ndị na-akọ ugbo. Ndị Izrel bi n’otu ebe nwere ike ichefu ndị Izrel ibe ha bi n’ebe ndị ọzọ. Ma, Jehova haziri ka ndị Izrel na-abịakọta ọnụ mgbe ụfọdụ ka ha nụ ka a na-agụpụta Okwu ya ma na-akọwa ya. (Diut. 31:10-13; Nehe. 8:2, 8, 18) Chegodịnụ otú obi ga-adị onye Izrel na-efe Chineke mgbe ọ bịarutere Jeruselem hụ ihe nwere ike iru ọtụtụ nde ndị Izrel ibe ya si n’ebe dị iche iche gbakọta ọnụ ife Chineke. Jehova si otú ahụ nyere ndị ya aka ịdị n’otu. Mgbe e mechara hiwe ọgbakọ Ndị Kraịst, ndị nọ na ya bụ ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nakwa ndị si n’ebe dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ha bara ọgaranya, ụfọdụ abụrụ ogbenye. Mana n’ihi na ha ji Okwu Chineke kpọrọ ihe, ife ezi Chineke mere ka ha dịrị n’otu. Ihe ga-eme ka Ndị Kraịst ndị ahụ ghọta Okwu Chineke bụ ma Ndị Kraịst ibe ha na-enyere ha aka nakwa ma ha na-agbakọta ọnụ ife Chineke.—Ọrụ 2:42; 8:30, 31.
8. Olee otú Baịbụl si eme ka ndị Jehova dịrị n’otu taa?
8 Chineke anyị ma ihe ka na-eji Okwu ya bụ́ Baịbụl na-akụziri ndị ya ihe ma na-eme ka ha dịrị n’otu. Ọ bụ na Baịbụl ka o si eme ka anyị mata ihe niile anyị kwesịrị ịmata banyere ya. Anyị na-agbakọta mgbe niile ma anyị gaa ọmụmụ ihe na mgbakọ dị iche iche ka anyị nụ ka a na-agụ Baịbụl, na-akọwa ya, ma na-ekwurịta ya. Baịbụl bụ ihe dị mkpa Jehova na-eji eme ka ndị na-efe ya “jiri otu obi na-efe” ya.—Zef. 3:9.
9. Olee àgwà dị ezigbo mkpa anyị ga-enwe ka anyị nwee ike ịghọta Baịbụl? (Luk 10:21)
9 Ka anyị lee ụzọ ọzọ Jehova si egosi na o nwere amamihe. O mere ka e dee ọtụtụ ebe na Baịbụl otú ọ ga-abụ naanị ndị dị umeala n’obi ga-aghọta ya. (Gụọ Luk 10:21.) Ndị nọ n’ebe niile na-agụ Baịbụl. Otu ọkà mmụta sịrị na “ọ bụghị naanị na ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl, kama ọ bụkwa akwụkwọ ndị mmadụ kacha akpachapụ anya agụ.” Ma, ọ bụ naanị ndị dị umeala n’obi na-aghọta Baịbụl nke ọma, na-emekwa ihe o kwuru.—2 Kọr. 3:15, 16.
10. Olee otú ọzọ Baịbụl si egosi na Jehova nwere amamihe?
10 E nwekwara ihe ọzọ mere anyị ji ghọta na Baịbụl na-egosi na Jehova nwere amamihe. Jehova na-eji Okwu ya bụ́ Baịbụl na-akụziri ndị ya niile ihe. Ọ na-ejikwa ya akụziri anyị niile ihe ma na-akasi anyị obi n’otu n’otu. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịchọpụta na Jehova nwere mmasị n’ebe anyị nọ ma anyị gụọ Okwu ya bụ́ Baịbụl. (Aịza. 30:21) Ugboro ole ka ị gụrụ Baịbụl mgbe nsogbu bịaara gị ma chọpụta amaokwu Baịbụl ndị yiri ka ọ̀ bụ gị ka e bu n’obi dee ha? N’agbanyeghị ya, Baịbụl na-amasị ọtụtụ nde mmadụ. Oleezi otú o si bụrụ na ihe e dere na ya na-abara gịnwa uru? Ọ bụ n’ihi na Onye e dere uche ya na Baịbụl bụ Onye kacha onye ọ bụla mara ihe ma n’eluigwe ma n’ụwa.—2 Tim. 3:16, 17.
BAỊBỤL NA-EGOSI NA JEHOVA NA-EKPE IKPE ZIRI EZI
11. Olee otú Jehova si gosi na ya anaghị ele mmadụ anya n’ihu mgbe a na-ede Baịbụl?
11 Ikpe ziri ezi bụ àgwà ọzọ Jehova nwere. (Diut. 32:4) Onye na-ekpe ikpe ziri ezi anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Jehova anaghịkwanụ ele mmadụ anya n’ihu. (Ọrụ 10:34, 35; Rom 2:11) Asụsụ ndị e ji dee Baịbụl gosiri na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Ihe e ji dee akwụkwọ iri atọ na itoolu mbụ dị na Baịbụl bụ asụsụ Hibru. Ọ bụkwa asụsụ ndị na-efe Chineke n’oge ahụ kacha aghọta. Ma, n’oge ndịozi Jizọs, ọ bụ asụsụ Grik ka ndị mmadụ kacha aghọta. N’ihi ya, ihe e ji dee akwụkwọ iri abụọ na asaa ndị ikpeazụ dị na Baịbụl bụ asụsụ Grik. Jehova ekpebighị na ọ bụ naanị otu asụsụ ka a ga-eji ede Okwu ya bụ́ Baịbụl. Taa, ihe fọrọ obere ka o ruo ijeri mmadụ asatọ (8,000,000,000) bi n’ụwa na-asụ ọtụtụ asụsụ. Olee otú ndị a niile ga-esi mụta gbasara Jehova?
12. Olee otu ụzọ ihe e kwuru na Daniel 12:4 si emezu n’oge ikpeazụ a?
12 Jehova si n’ọnụ Daniel onye amụma kwe nkwa na n’oge ikpeazụ, “eziokwu a ga-amụta” na Baịbụl ‘ga-ehi nne.’ Ọtụtụ ndị ga-aghọta ya. (Gụọ Daniel 12:4.) Otu ihe na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta Baịbụl bụ na a na-asụgharị Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ ya, na-ebipụta ha ma na-ekesara ha ndị mmadụ. Baịbụl bụ akwụkwọ a kacha asụgharị ma na-ekesara ndị mmadụ n’ụwa niile. Baịbụl ndị oji ego achụ ntá ego na-ebipụta na-adị oké ọnụ mgbe ụfọdụ. Ma ndị Jehova asụgharịala Baịbụl ma ndị nke zuru ezu ma ndị na-ezughị ezu n’ihe karịrị narị asụsụ abụọ na iri anọ (240). Onye ọ bụla nwekwara ike inweta nke ya n’akwụghị ụgwọ ọ bụla. Ihe a na-eme ka ndị si ná mba niile na-anabata “ozi ọma Alaeze Chineke” tupu ọgwụgwụ abịa. (Mat. 24:14) Chineke anyị na-ekpe ikpe ziri ezi chọrọ ka ọtụtụ mmadụ mụọ Okwu ya bụ́ Baịbụl ma mụta gbasara ya. Ihe mere o ji mee ya bụ na ọ hụrụ anyị niile n’anya nke ukwuu.
BAỊBỤL NA-EGOSI NA CHINEKE HỤRỤ ANYỊ N’ANYA
13. Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na Baịbụl na-egosi na Jehova hụrụ anyị n’anya? (Jọn 21:25)
13 Baịbụl na-eme ka anyị mata na àgwà kachanụ Onye e dere uche ya na ya nwere bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Ka anyị legodị ihe Jehova mere ka e dee na Baịbụl na ihe ndị o mere ka a ghara ide na ya. Ihe ndị o mere ka e dee na Baịbụl bụ ihe ndị ga-enyere anyị aka ka anyị na ya dịrị ná mma, ka anyị nwee obi ụtọ ugbu a, nwetakwa ndụ ebighị ebi. Ma, ebe ọ bụ na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ gwaghị anyị ọtụtụ ihe ndị na-adịghị anyị mkpa iji fee ya.—Gụọ Jọn 21:25.
14. Olee ihe ọzọ dị na Baịbụl na-egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya?
14 Ihe ọzọ gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya bụ na ọ na-agwa anyị okwu otú gosiri na ọ na-akwanyere anyị ùgwù. Na Baịbụl, Jehova enyeghị anyị ọtụtụ iwu ndị ga-agwa anyị ihe niile anyị ga-eme ná ndụ anyị. Kama, o mere ka e dee akụkọ ndị mere eme, amụma ndị na-atọ ụtọ, nakwa ndụmọdụ ndị ga-abara anyị uru na Baịbụl ka ha mee ka anyị na-eche echiche nke ọma. Baịbụl si otú a na-eme ka anyị jiri obi anyị niile na-ahụ Chineke n’anya ma na-erubere ya isi.
Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-atụgharị uche n’otú Jehova si meso ndị ohu ya ihe n’oge gara aga? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)
15. (a) Olee otú Baịbụl si egosi na Jehova hụrụ anyị n’anya? (b) Na foto e ji kọwaa paragraf a, olee ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nwata nwaanyị a, nwanna nwoke a, na nwanna nwaanyị a mere agadi na-echebara echiche? (Jen. 39:1, 10-12; 2 Eze 5:1-3; Luk 2:25-38)
15 Baịbụl mekwara ka anyị ghọta na Jehova na-eche nnọọ gbasara anyị. Olee otú o si mee ya? Ihe juru na Baịbụl bụ akụkọ ndị na-egosi otú obi dị ndị mmadụ. Anyị nwere ike ịghọta otú ọ dị ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl n’ihi na ha bụ ndị mmadụ “ibe anyị.” (Jems 5:17) Nke kacha mkpa bụ na ọ bụrụ na anyị achọpụta otú Jehova si meso ndị mmadụ ibe anyị ihe, anyị na-aghọta n’eziokwu na “ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ Jehova n’obi, nakwa na ọ na-eme ebere.”—Jems 5:11.
16. Gịnị ka anyị na-amụta gbasara Jehova ma anyị gụọ gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl mejọrọ ya? (Aịzaya 55:7)
16 E nwekwara otú ọzọ Baịbụl si egosi na Jehova hụrụ anyị n’anya. Baịbụl na-emesi anyị obi ike na Jehova agaghị ahapụ anyị ma ọ bụrụ na anyị emejọọ ihe. Ndị Izrel mehiere Jehova ọtụtụ ugboro, ma mgbe ha ji obi ha niile chegharịa, Chineke gbaghaara ha. (Gụọ Aịzaya 55:7.) Ndị Kraịst n’oge ndịozi makwa na Chineke hụrụ ha n’anya. Jehova ji mmụọ nsọ mee ka Pọl onyeozi gbaa Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha ‘gbaghara ma kasie’ otu nwoke mere mmehie dị oké njọ ma chegharịa obi. (2 Kọr. 2:6, 7; 1 Kọr. 5:1-5) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova ahapụghị ndị na-efe ya mgbe ha mehiere ya. O nyeere ha aka, gbazie ha, meekwa ka ha bụrụ ndị enyi ya n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. O kwekwara nkwa imere ndị mmehie niile chegharịrị echegharị otu ihe ahụ taa.—Jems 4:8-10.
JIRI OKWU CHINEKE BỤ́ ‘ONYINYE DỊ MMA’ KPỌRỌ IHE
17. Gịnị mere Baịbụl ji bụrụ onyinye pụrụ iche?
17 Jehova nyere anyị onyinye mara ezigbo mma. Gịnị mere Okwu ya ji pụọ iche? Dị ka anyị mụtara, Baịbụl na-egosi na Chineke nwere amamihe, na-ekpe ikpe ziri ezi, hụkwa anyị n’anya. Baịbụl na-egosi na Jehova chọrọ ka anyị mata ya. Ọ chọrọ ka anyị na ya bụrụ enyi.
18. Olee otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka Baịbụl bụ́ ‘onyinye dị mma’ Jehova nyere anyị?
18 Anyị achọghị iji Okwu Chineke bụ́ ‘onyinye dị mma’ egwu egwu. (Jems 1:17) N’ihi ya, ka anyị na-egosi mgbe niile na obi dị anyị ụtọ maka ya. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-agụ Baịbụl mgbe niile ma na-echebara ihe anyị gụtara na ya echiche. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Onye e dere uche ya na Baịbụl ga-agọzi mbọ anyị na-agba, nakwa na anyị “ga-amụtakwa banyere Chineke.”—Ilu 2:5.
ABỤ NKE 98 Akwụkwọ Nsọ Si n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke
a Baịbụl na-enyere anyị aka ịbịaru Jehova nso. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akwụkwọ a dị nsọ gbasara amamihe Jehova, otú o si ekpe ikpe ziri ezi, na ịhụnanya ya? Ihe anyị ga-amụta nwere ike ime ka anyị jirikwuo Okwu Chineke bụ́ Baịbụl kpọrọ ihe, meekwa ka anyị ghọta na Baịbụl bụ onyinye si n’aka Nna anyị nke eluigwe.